12 Mgbe ị nwụrụ,+ e liekwa gị otú e liri nna nna gị hà, m ga-echi nwa* gị, onye ị mụtara,* eze, ka ọ nọchie gị. M ga-emekwa ka alaeze ya sie ezigbo ike.+
31 Ị ga-adị ime, mụọ nwa nwoke.+ Ị ga-agụkwa ya Jizọs.+32 Onye a ga-abụ onye ukwu,+ a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kacha Elu.+ Jehova* bụ́ Chineke ga-enyekwa ya ocheeze nna ya bụ́ Devid.+