Disemba
Mọnde, Disemba 1
A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. —Luk 20:37.
Jehova ò nwere ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ? Eheenụ. Ọ bụ “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.” (Mkpu. 1:8) N’ihi ya, o nwere ikike imeri onye iro ọ bụla, ma ọnwụ. (1 Kọr. 15:26) Ihe ọzọ mere anyị ji mara na Chineke ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ bụ na ihe ọ ga-echetali enweghị ọgwụgwụ. Ọ na-akpọ kpakpando nke ọ bụla aha ya. (Aịza. 40:26) Ihe ọzọ bụ na ọ na-echeta ndị nwụrụ anwụ. (Job 14:13; Luk 20:38) Ọ ga-echetali obere ihe ọ bụla gbasara ndị ọ ga-akpọlite n’ọnwụ, ma àgwà ha ma otú ha dị ma ihe ndị ha hụrụla ná ndụ ma ihe ndị ha na-echeta. O doro anya na anyị kwesịrị ikweta nkwa Jehova kwere na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ihi na anyị ma na ọ chọrọ ime ya, nweekwa ikike ime ya. Chegodị ihe ọzọ mere anyị ji kweta na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ: Jehova emeela ya n’oge gara aga. N’oge a na-ede Baịbụl, o nyere Jizọs na ụfọdụ ụmụ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. w23.04 9-10 ¶7-9
Tuzdee, Disemba 2
Ka okwu unu na-atọ ụtọ mgbe niile ka ihe e tinyere nnu.—Kọl. 4:6.
Anyị wetuo obi kọwaara ndị mmadụ ihe anyị kweere, ha nwere ike ige anyị ntị, anyị na ha ekwurukwa na-aga. Ma, ọ bụrụ na ihe mmadụ chọrọ bụ naanị ka anyị na ya rụwa ụka ma ọ bụ ka ọ kwaa anyị emo, anyị na ya ekwesịghị ikwuru na-aga. (Ilu 26:4) Ọ bụghị mmadụ niile na-eme otú ahụ. Ọtụtụ ndị nwere ike ige anyị ntị. N’eziokwu, e nwere ọtụtụ uru anyị ga-erite ma anyị mụta ịdị nwayọọ. Rịọ Jehova ka o nye gị ike ị ga-eji dịrị nwayọọ ma ị na-aza ndị jụrụ gị ajụjụ siri ike ma ọ bụ ndị na-akwa gị emo. Cheta na otú i si zaghachi mmadụ nwere ike ime ka ihe ndị gị na ya na-enweghị otu olu na ha ghara ime ka unu rụwa ụka. Otú i si adị nwayọọ ma na-akwanyere ndị ị na-azaghachi okwu ùgwù nwere ike ime ka ụfọdụ ndị gbanwee ihe ha chere gbasara anyị nakwa eziokwu Baịbụl. ‘Jikere mgbe niile ịza mmadụ ajụjụ’ gbasara ihe i kweere. ‘Meda obi ma ị zawa ya onye ahụ.’ (1 Pita 3:15) N’eziokwu, i nwere ike ịdị nwayọọ iji gosi na ị dị ike. w23.09 19 ¶18-19
Wenezdee, Disemba 3
Yirinụ . . . ndidi [ka uwe].—Kọl. 3:12.
Ka anyị leba anya n’ụzọ anọ anyị ga-esi gosi na anyị na-enwe ndidi. Nke mbụ, onye na-enwe ndidi anaghị ewe iwe ngwa ngwa. Ọ na-agbalị ịnọrọ jụụ ma ghara imegwara ihe e mere ya ma ọ bụkwanụ ghara imesi ndị ọzọ ike ma e nwee ihe na-echegbu ya. (Ọpụ. 34:6) Nke abụọ, onye na-enwe ndidi na-anọrọ jụụ na-echere. Ọ bụrụ na ihe ewee oge karịrị oge a tụrụ anya ya, onye na-enwe ndidi anaghị agbakasịwa ahụ́ ma ọ bụ na-ewe iwe. (Mat. 18:26, 27) Nke atọ, onye na-enwe ndidi anaghị eme ihe n’echeghị echiche. Onye na-enwe ndidi nwee ihe ọ bụla ọ chọrọ ime, ọ naghị emewe ya ọkụ ọkụ ka o mechaa ya. Kama, ọ na-ewepụta oge kwesịrị ekwesị, hazie ihe ọ ga-eme. O mechazie, ya ewepụta ezigbo oge mee ihe ahụ ọ chọrọ ime. Nke anọ, onye na-enwe ndidi na-edi ọnwụnwa n’atamughị ntamu. Ọ ga-eme ike ya niile ka o nwee ike ịna-atachi obi n’ọnwụnwa bịaara ya ma jiri obi ụtọ na-efe Jehova. (Kọl. 1:11) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi n’ihe ndị a niile. w23.08 20-21 ¶3-6
Tọzdee, Disemba 4
Ọ bụ Jehova na-enyocha obi. —Ilu 17:3.
Otu n’ime ihe bụ́ isi mere anyị ji kwesị ichebe obi anyị bụ na Jehova na-enyocha obi anyị. Ọ pụtara na ihe ọ na-ahụ abụghị naanị ụdị mmadụ ndị ọzọ chere na anyị bụ. Ọ ma ụdị ndị anyị bụ n’eziokwu. Ọ ga-ahụ anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị ana-eche mgbe niile banyere amamihe ya na-enye ndụ. (Jọn 4:14) Anyị mee otú ahụ, Setan na ụwa ya agaghị eji omume ọjọọ na ụgha ha na-akụzi nweta anyị. (1 Jọn 5:18, 19) Ka anyị na-abịarukwu Jehova nso, anyị ga na-ahụkwu ya n’anya ma na-akwanyekwuru ya ùgwù. Ebe ọ bụ na anyị achọghị ime ihe ga-ewute Nna anyị, anyị agaghị achọ ichetụdị n’echiche ime mmehie. E nwere otu nwanna nwaanyị bi na Kroeshia aha ya bụ Marta. Ime omume rụrụ arụ nọ na-agụ ya agụụ. O dere, sị: “O siiri m ike ịna-eche echiche nke ọma na ịlụso ihe ọjọọ na-agụ m ọgụ. Ma ịtụ egwu Jehova chebere m.” Olee otú ịtụ egwu Chineke si chebe ya? Marta sịrị na ya tụgharịrị uche ná nsogbu ime ihe ọjọọ ga-akpatara ya. Anyịnwa nwekwara ike ime otú ahụ. w23.06 20-21 ¶3-4
Fraịdee, Disemba 5
“M ga-eji unu mee ka mba niile mara na m dị nsọ, ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.” Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.—Ezik. 36:23.
Jizọs ma na nzube Nna ya bụ ido aha ya nsọ, ya bụ, ịgba ụgha niile a ghara gbasara ya n’anwụ. Ọ bụ ya mere Nna anyị ukwu ji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere, sị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.” (Mat. 6:9) Jizọs ma na ọ bụ ihe a bụ ihe kacha mkpa gbasara ihe niile e kere eke. O nweghị onye ọ bụla ma n’eluigwe ma n’ụwa gbasiri mbọ ike ido aha Jehova nsọ ka Jizọs. Ma, mgbe e jidere Jizọs, olee ihe e boro ya ebubo na o mere? E boro ya ebubo na ọ na-ekwutọ aha Nna ya. Jizọs ma nke ọma na ikwutọ aha Nna ya bụ mmehie kachanụ mmadụ nwere ike ime. O wutere ya nnọọ n’obi na ọ bụ ihe a ka e boro ya ebubo ma maa ya ikpe na o mere. Ọ ga-abụ ihe a bụ isi ihe mere ‘obi erughị ya ala’ awa ole na ole tupu e jide ya.—Luk 22:41-44. w24.02 11 ¶11
Satọdee, Disemba 6
A na-eji amamihe arụ ụlọ.—Ilu 24:3.
Ka anyị na-agba ọsọ ndụ, anyị kwesịrị ịhụ Jehova na Jizọs n’anya karịa otú anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị. (Mat. 10:37) Mana, ihe a ọ̀ pụtara na anyị ga-ahapụ ọrụ dịịrị anyị n’ezinụlọ dị ka à ga-asị na ha na-egbochi anyị ime uche Chineke na nke Kraịst? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Jehova na Jizọs nabata anyị, anyị ekwesịghị ịgbara ọrụ dịịrị anyị n’ezinụlọ ọsọ. (1 Tim. 5:4, 8) Ọ bụrụ na anyị ana-arụ ya, obi ga na-atọkwu anyị ụtọ. A sị ka e kwuwe, Jehova ma na ezinụlọ ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na di na nwunye ana-ahụ ibe ha n’anya ma na-asọpụrụ ibe ha, ndị nne na nna ahụ ụmụ ha n’anya ma na-azụ ha nke ọma, ụmụaka ana-erubekwara nne na nna ha isi. (Efe. 5:33; 6:1, 4) N’agbanyeghị ihe bụ́ ọrụ gị n’ezinụlọ, tụkwasị amamihe dị na Baịbụl obi, kama ịtụkwasị ihe i chere, omenala unu, ma ọ bụ ihe ndị a na-akpọ ndị ọkachamara kwuru obi. Na-agụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ha ga-enyere gị aka ịhụ otú ị ga-esi eme ihe Baịbụl kwuru. w23.08 28 ¶6-7
Sọnde, Disemba 7
I kwesịrị ịna-agụ ya ma na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya na-eme ihe niile e dere na ya. Ime ihe ndị a ga-eme ka ihe na-agaziri gị, meekwa ka ị na-akpa àgwà onye ma ihe.—Josh. 1:8.
Nwaanyị bụ́ Onye Kraịst kwesịrị ịmụta ihe ndị ga-abara ya uru. Ụfọdụ ihe nwata nwaanyị mụtara mgbe ọ ka dị obere na-abara ya uru ná ndụ ya niile. Dị ka ihe atụ, mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma. N’obodo ụfọdụ, a naghị ewere ya na ụmụ nwaanyị kwesịrị ịmụta ịgụ ihe na ide ihe. Ma, ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst niile mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma. (1 Tim. 4:13) N’ihi ya, ekwekwala ka ihe ọ bụla gbochie gị ịmụta otú e si agụ ihe na otú e si ede ihe nke ọma. Olee otú o nwere ike isi baara gị uru? Ịmụta ihe ndị a nwere ike inyere gị aka inweta ọrụ ma nọsie ike na ya. Ọ ga-enyekwara gị aka ịna-amụ Okwu Chineke nke ọma, na-akụzikwara ya ndị ọzọ. Nke kachanụ bụ na ị ga-abịarukwu Chineke nso ka ị na-agụ Okwu ya ma na-atụgharị uche na ya.—1 Tim. 4:15. w23.12 20 ¶10-11
Mọnde, Disemba 8
Jehova ma otú o si anapụta ndị ji obi ha niile na-efe ya n’ọnwụnwa.—2 Pita 2:9.
Rịọ Jehova ka o nyere gị aka imeri ọnwụnwa. Ebe anyị na-ezughị okè, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ime ihe na-adịghị mma. Ekwensu na-eme ihe niile o nwere ike ime ka o siere anyị ezigbo ike. Otu n’ime ihe ndị o ji agbalị imebi echiche anyị bụ ihe ndị rụrụ arụ e ji atụrụ ndụ. Ụdị ihe ndị ahụ e ji atụrụ ndụ nwere ike ime ka echiche na-adịghị mma ju n’obi anyị, ya bụ, echiche ga-eme ka anyị ghara ịdị ọcha n’anya Jehova, meekwa ka anyị mee mmehie dị oké njọ. (Mak 7:21-23; Jems 1:14, 15) Enyemaka Jehova dị anyị mkpa ka anyị nwee ike imeri ọnwụnwa na-abịara anyị ime ihe ọjọọ. Lee ihe Jizọs kwuru n’ekpere o ji kụziere anyị otú e si ekpe ekpere. Ọ sịrị: “Ekwela ka a nwata anyị, kama napụta anyị n’aka ajọ onye ahụ.” (Mat. 6:13) Jehova chọrọ inyere anyị aka. Ma, anyị kwesịrị ikpe ekpere rịọ ya ka o nyere anyị aka. Anyị kpechaa, anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike zere ihe ọ bụla nwere ike itinye anyị n’ọnwụnwa. w23.05 6-7 ¶15-17
Tuzdee, Disemba 9
Ụdọ e ji eriri atọ tụọ, a gaghị adọbili ya ngwa ngwa.—Ekli. 4:12.
Ọ bụrụ na di na nwunye ejiri adịm ná mma ha na Nna ha nke eluigwe kpọrọ ihe, ha ga-eji obi ha na-eme ihe o kwuru, nke ga-eme ka ha zere nsogbu ma ọ bụ merie nsogbu ndị nwere ike ime ka ịhụnanya ha jụọ oyi. Ndị ha na Jehova dị ná mma na-agbasi mbọ ike ime ka ya ma na-akpa àgwà ka ya, dị ka inwe obiọma, inwe ndidi, na ịgbaghara ndị ọzọ. (Efe. 4:32–5:1) Di na nwunye nwee àgwà ndị a, ọ ga-adịrị ha mfe ịna-ahụ ibe ha n’anya. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lena alụọla di ruo ihe karịrị afọ iri abụọ na ise. Ọ sịrị: “Ọ na-adị mfe ịhụ onye ji ife Jehova kpọrọ ihe n’anya nakwa ịkwanyere ya ùgwù.” Ka anyị leba anya n’otu akụkọ a kọrọ na Baịbụl. Mgbe Jehova na-ahọrọ ndị ga-abụ nne na nna Mezaya, ọ họọrọ Josef na Meri n’agbanyeghị na e nwere ọtụtụ ndị si n’agbụrụ Devid. Maka gịnị? Ọ bụ maka na ha na Jehova dị n’ezigbo mma. Jehova makwa na ha ga-eme ka ife ya bụrụ ihe kacha ha mkpa. w23.05 21 ¶3-4
Wenezdee, Disemba 10
Na-eruberenụ ndị na-eduzi unu isi.—Hib. 13:17.
Ọ bụ eziokwu na Onye Ndú anyị bụ́ Jizọs zuru okè, ndị ọ na-eji eduzi anyị n’ụwa ebe a ezughị okè. O nwere ike ịna-esiri anyị ike irubere ha isi, karịchaa ma ọ bụrụ na ha agwa anyị mee ihe anyị na-achọghị ime. O nwere mgbe o siiri Pita onyeozi ike irube isi. Mgbe otu mmụọ ozi gwara ya ka o rie ụmụ anụmanụ Iwu Mosis kwuru na ha adịghị ọcha, ọ jụrụ iri ha, ọ bụghị naanị otu ugboro, kama ugboro atọ. (Ọrụ 10:9-16) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ahụ a gwara ya mee yichara ihe na-enweghị isi. Ma Pọl onyeozi rubere isi mgbe ndị okenye nọ na Jeruselem gwara ya ka ọ kpọrọ ụmụ nwoke anọ gaa n’ụlọ nsọ mee onwe ya ka ọ dị ọcha iji gosi na ọ na-edebe Iwu Mosis. Pọl ma na Ndị Kraịst anaghị edebe Iwu Mosis. E nweghịkwa ihe ọjọọ o mere. N’agbanyeghị ya, “n’echi ya, Pọl kpọọrọ ụmụ nwoke ndị ahụ gawa, ya na ha asachaa onwe ha otú iwu kwuru.” (Ọrụ 21:23, 24, 26) Ihe a Pọl mere mere ka ụmụnna dịrị n’otu.—Rom 14:19, 21. w23.10 10 ¶15-16
Tọzdee, Disemba 11
Ndị ha na Jehova bụ ezigbo enyi bụ ndị na-atụ egwu ya.—Ọma 25:14.
O nwere ike ị gaghị eche na ịtụ egwu bụ àgwà dị mkpa ga-eme ka gị na onye ọzọ bụrụ ezigbo enyi. Ma, ndị chọrọ ka ha na Jehova bụrụ ezigbo enyi kwesịrị ‘ịna-atụ egwu ya.’ N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị niile kwesịrị ịna-atụ egwu ya. Ma, gịnị ka ịtụ egwu Chineke pụtara? Onye na-atụ Chineke egwu otú kwesịrị ekwesị hụrụ ya n’anya. Ọ naghịkwa achọ ime ihe ọ bụla ga-eme ka ya na ya ghara ịdị ná mma. Jizọs tụkwara ụdị “egwu Chineke” ahụ. (Hib. 5:7) Ọ tụghị Jehova ụjọ na-ekwesịghị ekwesị. (Aịza. 11:2, 3) Kama, o ji obi ya niile hụ Chineke n’anya, chọọkwa irubere ya isi. (Jọn 14:21, 31) Dịkwa ka Jizọs, anyị na-akwanyere Jehova ezigbo ùgwù ma na-atụ egwu ya n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya, nwee amamihe, na-ekpe ikpe ziri ezi, dịkwa ike. Anyị makwa na Jehova hụrụ anyị n’anya, na-achọkwa ịma otú anyị si eme ihe ndị ọ na-akụziri anyị. Anyị nwere ike ime ka obi Jehova ṅụrịa ma ọ bụ mee ka obi gbawaa ya.—Ọma 78:41; Ilu 27:11. w23.06 14 ¶1-2; 15 ¶5
Fraịdee, Disemba 12
Ozugbo o siri ike, ọ bịara dị mpako, si otú ahụ kpatara onwe ya nsogbu. O mebiri iwu Jehova.—2 Ihe 26:16.
Mgbe Eze Ọzaya siri ike, o chefuru na ọ bụ Jehova mere ka o sie ike, meekwa ka ihe na-agaziri ya. Gịnị ka anyị na-amụta na ya? Anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na ọ bụ Jehova mere ka anyị nwee ihe ọma niile anyị nwere nakwa ọrụ anyị na-arụrụ ya n’ọgbakọ ya. Kama iji ihe anyị na-arụ na-anya isi, anyị kwesịrị inye Jehova otuto maka ihe ọ bụla anyị mere. (1 Kọr. 4:7) Anyị kwesịrị ịna-echeta mgbe niile na anyị ezughị okè nakwa na e kwesịrị ịna-agbazi anyị. Otu nwanna dị ihe dị ka afọ iri isii dere, sị: “M mụtala ịghara ịna-ewe iwe ma ọ bụ ịda mbà ma ndị mmadụ chọpụta ihe m na-emetaghị. Mgbe ọ bụla a gbaziri m maka ihe na-adịghị mma m mere, m na-agbalị imewekwa nke ọma, na-enyekwa Jehova ihe niile m nwere ike inye ya.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na anyị ana-atụ egwu Jehova, dịrị umeala n’obi, anyị ga na-enwe obi ụtọ ná ndụ.—Ilu 22:4. w23.09 10 ¶10-11
Satọdee, Disemba 13
Unu kwesịrị ịtachi obi, ka unu wee nweta ihe Chineke kwere ná nkwa mgbe unu mechara uche ya. —Hib. 10:36.
Ndị Kraịst n’oge Pọl onyeozi kwesịrị ịna-atachi obi. Ha nwere ụdị nsogbu ọtụtụ ndị bi n’oge ahụ nwere. Ma, ha nwere nsogbu ndị ọzọ n’ihi na ha bụ Ndị Kraịst. A kpagburu ọtụtụ n’ime ha. Ọ bụghị naanị ndị isi okpukpe ndị Juu na ndị ọchịchị ndị Rom kpagburu ha, kama, ndị ezinụlọ ha sokwa kpagbuo ha. (Mat. 10:21) N’ime ọgbakọ kwa, o nwere mgbe ụfọdụ ha gbasiri mbọ ike ka ha ghara ịmụta ozizi ụgha ndị si n’ezi ofufe dapụ na-akụzi, bụ́ nke nwere ike ikewa ọgbakọ. (Ọrụ 20:29, 30) N’agbanyeghị ihe ndị a niile, Ndị Kraịst ndị ahụ tachiri obi. (Mkpu. 2:3) Gịnị nyeere ha aka? Ha chere echiche nke ọma gbasara ndị dị ka Job, bụ́ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl tachiri obi. (Jems 5:10, 11) Ha kpere ekpere ka Chineke nye ha ike. (Ọrụ 4:29-31) Ha nọkwa na-echeta na Jehova ga-akwụ ha ụgwọ ma ha tachie obi. (Ọrụ 5:41) Anyịnwa ga-atachikwa obi ma ọ bụrụ na anyị ana-amụ gbasara ndị tachiri obi a kọrọ akụkọ ha n’Okwu Chineke nakwa n’akwụkwọ anyị, na-echebakwara ha echiche. w23.07 3 ¶5-6
Sọnde, Disemba 14
N’ihi ya, burunụ ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume Chineke, a ga-atụkwasịkwara unu ihe ndị ọzọ a niile.—Mat. 6:33.
Jehova na Jizọs agaghị ahapụ anyị. Mgbe Pita onyeozi gọnahụchara Jizọs, e nwere ihe dị ezigbo mkpa ọ ga-ekpebi. Ọ̀ ga-akwụsị iso Jizọs, ka ọ̀ ka ga na-eso ụzọ Jizọs? Jizọs ebula ụzọ rịọ Jehova ka o mee ka okwukwe Pita ghara ịnyụ ka ọkụ. Jizọs gwakwara Pita gbasara ekpere ahụ o kpere ma kwuo na obi siri ya ike na Pita ga-emecha mee ka ụmụnna ya dị ike. (Luk 22:31, 32) Ọ ga-abụrịrị na obi siri Pita ike mgbe ọ bụla o chetara ihe ahụ Jizọs kwuru. E nwee ihe dị mkpa anyị chọrọ ikpebi, Jehova nwere ike iji ndị okenye hụrụ anyị n’anya mee ka obi sie anyị ike ka anyị ghara ịda mbà. (Efe. 4:8, 11) Otú ahụ Jehova gbooro Pita na ndịozi ndị ọzọ mkpa ha, ọ ga-egbokwara anyị mkpa anyị ma ọ bụrụ na anyị ebute ozi ya ụzọ ná ndụ anyị. w23.09 24-25 ¶14-15
Mọnde, Disemba 15
Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe ọma na-agbazinye Jehova ihe, ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe ọ na-eme.—Ilu 19:17.
Jehova na-ahụ ihe anyị mere iji nyere ndị ọzọ aka ọ bụrụgodị na ihe ahụ di ezigbo obere. Ọ na-ewere ya ka àjà bara ezigbo uru anyị chụụrụ ya nakwa ka ihe anyị gbazinyere ya ọ ga-akwụghachi. Ọ bụrụ na ị bụbu ohu na-eje ozi ma ọ bụ okenye, Jehova na-echeta ihe ị rụrụ n’oge gara aga nakwa na ihe mere i ji rụọ ya bụ na ị hụrụ ya na ndị ọzọ n’anya. (1 Kọr. 15:58) Ọ na-ahụkwa otú ị ka si na-ahụ ndị ọzọ n’anya. Jehova chọrọ ka anyị niile na-ahụkwu ya na ndị ọzọ n’anya. Anyị ga-enweli ike ịna-ahụkwu Jehova n’anya ma anyị na-agụ Okwu ya, na-atụgharị uche na ya, na-ekpekwa ekpere mgbe niile. Otú anyị ga-esi na-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya bụ ịna-enyere ha aka. Ka anyị na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya, anyị na Jehova na ụmụnna anyị ga na-adịkwu ná mma. Adịm ná mma ahụ ga-adịru mgbe ebighị ebi. w23.07 10 ¶11; 11 ¶13; 13 ¶18
Tuzdee, Disemba 16
Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya. —Gal. 6:5.
Onye Kraịst ga-eji aka ya kpebie ihe ọ ga-eme ka ahụ́ na-agbasi ya ike. Ọ bụ naanị iwu ole na ole ka Baịbụl nyere gbasara otú Onye Kraịst ga-esi kpebie otú a ga-esi agwọ ya ọrịa, dị ka izere ọbara na mgbaasị. (Ọrụ 15:20; Gal. 5:19, 20) Ihe ndị ọzọ bụ ihe mmadụ ga-eji aka ya ekpebiri onwe ya. N’agbanyeghị otú anyị si kwetasie ike na e nwere otú kacha mma e si agwọ ọrịa, anyị kwesịrị ịhapụ ụmụnna anyị ka ha jiri aka ha kpebie otú a ga-esi agwọ ha ọrịa. Ihe anyị kwesịrị iburu n’obi gbasara ihe a bụ: (1) Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-agwọ ndị mmadụ ọrịa ha kpamkpam ruo mgbe ebighị ebi. (Aịza. 33:24) (2) Obi kwesịrị isi Onye Kraịst ọ bụla “ezigbo ike” na otú ọ họọrọ a ga-esi agwọ ya bụ otú kaara ya mma. (Rom 14:5) (3) Anyị anaghị ekpe ndị ọzọ ikpe ma ọ bụkwanụ mee ihe ga-eme ka ha kpọbie ụkwụ. (Rom 14:13) (4) Ndị Kraịst na-ahụ ibe ha n’anya. Ha na-aghọtakwa na ọgbakọ ịdị n’otu dị mkpa karịa ime ihe ha chọrọ.—Rom 14:15, 19, 20. w23.07 24 ¶15
Wenezdee, Disemba 17
Ọ bụụrụ Jehova onye dị nsọ n’oge niile ọ bụ onye Naziraịt. —Ọnụ Ọgụ. 6:8.
Ì ji adịm ná mma gị na Jehova kpọrọ ezigbo ihe? O doro anya na i ji ya kpọrọ ihe. Kemgbe oge ochie, ọtụtụ ndị na-eme otú ahụ. (Ọma 104:33, 34) Ọtụtụ ndị ahapụla ihe ụfọdụ iji fee Jehova nke ọma. Ọ bụkwa ihe a ka ndị nọ n’Izrel oge ochie a na-akpọ ndị Naziraịt ma ọ bụ ndị e nyefere Chineke mere. E ji okwu a kọwaa ndị Izrel ụfọdụ gbanwere ọtụtụ ihe ná ndụ ha iji fee Chineke n’ụzọ pụrụ iche. N’Iwu Mosis, nwoke ma ọ bụ nwaanyị nwere ike ikpebi ikwe Jehova nkwa pụrụ iche na ọ ga-abụ onye Naziraịt ruo oge ụfọdụ. (Ọnụ Ọgụ. 6:1, 2) Nkwa ahụ pụtara na ọ ga-edebe iwu ụfọdụ ọ na-adịghị mkpa ka ndị Izrel ndị ọzọ debe. Gịnịzi nwere ike ime ka onye Izrel họrọ ịbụ onye Naziraịt? Ọ ga-abụ ezigbo ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ na obi ụtọ o nwere maka ngọzi niile Jehova gọziri ya.—Diut. 6:5; 16:17. w24.02 14 ¶1-2
Tọzdee, Disemba 18
Jehova . . . [na-egosi] ndị hụrụ ya n’anya na ndị na-edebe iwu ya . . . na ọ hụrụ ha n’anya.—Dan. 9:4.
Na Baịbụl, okwu Hibru a sụgharịrị “ịhụnanya,” “ịhụnanya pụrụ iche” ma ọ bụ ‘ijisi onye ọzọ ike’ na-apụtakarị otú Chineke si jiri obiọma ya hụ ndị na-efe ya n’anya. A na-ejikwa okwu ahụ akọwa otú ndị na-efe Jehova si hụ ibe ha n’anya. (2 Sam. 9:6, 7) Anyị nwere ike ịmụta ịna-ejidesikwu Jehova aka ike ka oge na-aga. Legodị otú Daniel si mee ya. E nwere ọnwụnwa ndị bịaara Daniel ná ndụ ya ga-eme ka o gosi ma ò jidesiri Jehova aka ike ma ọ bụ na o jidesighị ya. Ma, otu n’ime ndị kacha sie ike bịaara ya mgbe ọ gaferela afọ iri itoolu. Ụfọdụ ndị isi n’obí eze kpọrọ Daniel asị, ha anaghịkwa akwanyere Chineke ọ na-efe ùgwù. N’ihi ya, ha kpara nkata otú ha ga-esi egbu Daniel. Ha mere ka eze bịanye aka n’iwu ga-egosi ma Daniel ọ̀ ga-ejidesi Chineke ya aka ike ka ọ̀ ga-ahapụ ya rubere eze isi. Naanị ihe a chọrọ ka Daniel mee iji gosi na ọ na-erubere eze isi bụ ịkwụsị ikpe ekpere ruo ụbọchị iri atọ. Daniel ekweghị ahapụ Jehova.—Dan. 6:12-15, 20-22. w23.08 5 ¶10-12
Fraịdee, Disemba 19
Ka anyị na-ahụ ibe anyị n’anya.—1 Jọn 4:7.
Jehova chọrọ ka anyị ghara ịkwụsị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. Ọ bụrụ na nwanna akpaghị àgwà ka Onye Kraịst, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ kpachaghị anya chọọ ime ihe ga-ewute anyị nakwa na ọ na-agba mbọ ime ihe Jehova kwuru. (Ilu 12:18) Chineke hụrụ ndị ji obi ha niile na-efe ya n’anya n’agbanyeghị na ha na-emejọ ihe. Ọ naghị ajụ anyị ma anyị mejọọ ihe. Ọ naghịkwanụ eburu anyị iwe n’obi. (Ọma 103:9) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na-eme ka Nna anyị nke na-agbaghara ndị ọzọ. (Efe. 4:32–5:1) Chetakwa na ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso, anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịna-adịkwu ná mma. Anyị kwesịrị ịtụ anya na a ga na-akpagbukwu anyị. E nwedịrị ike ịtụ anyị mkpọrọ maka na anyị na-efe Chineke. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee, enyemaka ụmụnna anyị ga-adịkwu anyị mkpa karịa mgbe ọ bụla ọzọ.—Ilu 17:17. w24.03 15-16 ¶6-7
Satọdee, Disemba 20
Ọ bụ Jehova na-eduzi nzọụkwụ mmadụ.—Ilu 20:24.
Na Baịbụl, a kọrọ gbasara ndị na-eto eto bịaruru Jehova nso, ha na ya adịrị ná mma, ihe agaziekwara ha ná ndụ. Devid bụ otu n’ime ha. Mgbe ọ ka na-eto eto, ọ họọrọ ife Jehova. Mgbe o mechakwara bụrụ eze, o rubeere Jehova isi. (1 Eze 3:6; 9:4, 5; 14:8) Ọ bụrụ na ị mụọ gbasara Devid, ihe o mere ga-agba gị ume iji obi gị niile na-efe Jehova. I nwekwara ike ịmụ gbasara Mak ma ọ bụ Timoti. Ị ga-ahụ na ha bidoro ife Jehova mgbe ha na-eto eto, ya emee ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ha mere Jehova obi ụtọ. Otú i si ebi ndụ gị ugbu a nwere ike ime ka ihe dịrị gị mma n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Jehova obi ugbu a kama ịtụkwasị onwe gị obi, ọ ga-enyere gị aka ikpebi ihe ndị dị mma. I nwere ike ịna-enwe obi ụtọ ná ndụ, ndụ gị abaakwara gị uru. Cheta na Jehova ji ihe ị na-emere ya kpọrọ ihe. O nweghị ihe dị mma ị ga-eji ndụ gị eme karịa ife Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya. w23.09 13 ¶18-19
Sọnde, Disemba 21
Na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam.—Kọl. 3:13.
Pọl onyeozi ma na ụmụnna ya ezughị okè. Dị ka ihe atụ, obere oge ọ ghọchara Onye Kraịst, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Jeruselem ekwetaghị na ọ bụ onye na-eso ụzọ Jizọs mgbe ha hụrụ ya. (Ọrụ 9:26) Mgbe e mechara, ụfọdụ ndị kwuru okwu ọjọọ gbasara ya ka ndị ọzọ ghara ịtụkwasị ya obi. (2 Kọr. 10:10) Pọl hụkwara ka otu nwanna a na-akwanyere ùgwù mere mkpebi na-adịghị mma nke nwere ike ime ka ndị ọzọ zọhie ụkwụ. (Gal. 2:11, 12) Otu n’ime ndị ha na Pọl rụkọrọ ọrụ, bụ́ Mak, mere ihe gbawara ya obi. (Ọrụ 15:37, 38) Ọ bụrụ na Pọl chọrọ, ọ gaara ekwe ka nke ọ bụla n’ime ihe ndị a mee ka ọ na-agbara ndị ahụ mejọrọ ya ọsọ. Ma, o meghị otú ahụ. O ji ụmụnna ya kpọrọ ihe, nọsiekwa ike n’ofufe Jehova. Gịnị nyeere Pọl aka? Pọl hụrụ ụmụnna ya n’anya. Otú o si hụ ụmụnna ya n’anya mere ka o lekwasị anya n’àgwà ọma ndị ha nwere, ọ bụghị n’ihe ndị ha na-anaghị emeta. Ịhụnanya nyekwaara Pọl aka ime ihe e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. w24.03 15 ¶4-5
Mọnde, Disemba 22
Ohu Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị iji nwayọọ na-emeso mmadụ niile ihe.—2 Tim. 2:24.
Ọtụtụ ihe a kọrọ na Baịbụl gosiri na ịdị nwayọọ bụ àgwà dị ezigbo mkpa. Chegodị banyere Aịzik. Mgbe o bi n’obodo ndị Filistia bụ́ Gira, ndị agbata obi ya malitere imere ya anyaụfụ, kpochie olulu mmiri ndị ohu nna ya gwuru. Kama ịga zọwa ihe ruuru ya, Aịzik kpọọrọ ezinụlọ ya gaa n’ebe dị anya gwuo olulu mmiri ndị ọzọ. (Jen. 26:12-18) Ma, ndị Filistia bịakwara sị na mmiri dị n’ebe ahụ bụ nke ha. Ma, Aịzik mere ka udo dịrị. (Jen. 26:19-25) Gịnị nyeere ya aka ịdị nwayọọ ma mgbe o yiri ka ndị ọzọ hà kpebisiri ike ịkpasu ya iwe? Ọ ga-abụrịrị na ọ hụrụ ihe nne na nna ya mere. Ọ mụtara otú Ebreham si mee ka ya na ndị ọzọ dịrị n’udo nakwa otú Sera si bụrụ ‘onye obi ruru ala na onye dị nwayọọ.’—1 Pita 3:4-6; Jen. 21:22-34. w23.09 15 ¶4
Tuzdee, Disemba 23
Ezubela m ime ya. M ga-emekwa ya.—Aịza. 46:11.
Ịhụnanya Jehova mere ka o zite Ọkpara ya n’ụwa ka ọ kụziere ndị mmadụ gbasara Alaeze ya, nakwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta anyị n’aka mmehie na ọnwụ. Jehova mechara kpọlite Jizọs n’ọnwụ, ya alaa eluigwe bụrụ Eze nke Alaeze Chineke. Isi ihe e kwuru na Baịbụl bụ na a ga-eme ka aha Jehova dị nsọ mgbe ọ ga-eji Alaeze ya nke Kraịst ga-achị mezuo nzube ya maka ụwa. Nzube Jehova anaghị agbanwe agbanwe. O kwere nkwa na ihe niile o kwuru ga-emezu. (Aịza. 46:10; Hib. 6:17, 18) N’oge na-adịghị anya, ụwa niile ga-aghọ paradaịs ebe ụmụ Adam na Iv bụ́ ndị ezi omume ga-ezu okè ma ‘na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.’ (Ọma 22:26) Ọ bụghị naanị ihe a ka Jehova ga-eme. Nzube ya kachanụ bụ ime ka ndị niile na-efe ya dịrị n’otu n’eluigwe na n’ụwa. N’oge ahụ, onye ọ bụla dị ndụ ga na-erubere Jehova isi dị ka Onye Ọchịchị. (Efe. 1:8-11) Ọ̀ bụ na otú a magburu onwe ya Jehova si chọọ imezu nzube ya amasịghị gị? w23.10 20 ¶7-8
Wenezdee, Disemba 24
“Dịkwanụ ike, . . . n’ihi na m nọnyeere unu.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.—Hag. 2:4.
Mgbe ndị Juu ndị si Babịlọn lọrutere Jeruselem, o teghị aka, ya amalite isiri ha ike igboro ndị ezinụlọ ha mkpa ha. E nwere ọgba aghara n’Alaeze Ukwu Peshia, mba ndị gbara ha gburugburu ana-emegidekwa ha. Ihe a mere ka o siere ụfọdụ ndị Juu ike iwere ịrụghachi ụlọ nsọ Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha. N’ihi ya, Jehova zigara ndị amụma ya abụọ bụ́ Hagaị na Zekaraya ka ha gaa mee ka ọ gụsiwekwa ndị Juu agụụ ike ịrụghachi ụlọ nsọ Jehova. Ihe a bara ezigbo uru. (Hag. 1:1; Zek. 1:1) Ma, mgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri ise gachara, ọ dịkwa mkpa ka a gbaa ndị Juu ahụ ume ọzọ. Ezra, bụ́ aka ochie n’idepụta Iwu Mosis, si Babịlọn lọta Jeruselem ka ọ gbaa ndị Chineke ume iwere ofufe Jehova ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha. (Ezra 7:1, 6) Otú ahụ amụma Hagaị na Zekaraya buru nyeere ndị Chineke aka n’oge ochie ịtụkwasị Jehova obi n’oge a na-emegide ha, o nwekwara ike ime ka obi sie anyị ike taa na Jehova ga-akwado anyị n’agbanyeghị nsogbu bịaara anyị.—Ilu 22:19. w23.11 14-15 ¶2-3
Tọzdee, Disemba 25
Yirinụ ịhụnanya ka uwe, n’ihi na ịhụnanya na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.—Kọl. 3:14.
Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya? Otu ụzọ bụ ịkasi ha obi. Ihe ga-eme ka anyị nwee ike ‘ịna-ahụ ibe anyị n’anya’ bụ ịna-enwere ha ọmịiko. (1 Tesa. 4:18) Olee otú anyị ga-esi na-ahụkwu ibe anyị n’anya? Ọ bụ ma anyị mee ike anyị niile ịna-agbaghara ha. Gịnị mere o ji dị ezigbo mkpa taa ka anyị gosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya? Legodị ihe Pita kwuru mere o ji dị ezigbo mkpa. Ọ sịrị: “Ọgwụgwụ ihe niile adịla nso. N’ihi ya, . . . jirinụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya.” (1 Pita 4:7, 8) Ka ọgwụgwụ ụwa ochie a ji ọsọ na-eru, olee ihe anyị kwesịrị ịtụ anya ya? Jizọs kwuru gbasara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Mat. 24:9) Ọ bụrụ na anyị chọrọ idi ụdị ịkpọasị ahụ ha kpọrọ anyị, anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịdị n’otu. Ọ bụrụ na anyị adịrị n’otu, mbọ Setan na-agba ikewa anyị ga-akụ afọ n’ala n’ihi na ihe jikọtara anyị bụ ịhụnanya.—Fil. 2:1, 2. w23.11 13 ¶18-19
Fraịdee, Disemba 26
Anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ. —1 Kọr. 3:9.
Eziokwu dị n’Okwu Chineke na-akpa ezigbo ike. Anyị kụziere ndị mmadụ gbasara Jehova nakwa ụdị onye ọ bụ, anyị na-ahụ ihe na-atụ anyị n’anya. A na-eji nwayọọ nwayọọ ewepụ ihe Setan ji kechie ha anya, ha amalite ịhụ Nna anyị anyị hụrụ n’anya otú anyị si ahụ ya. Obi na-atọ ha ụtọ n’ihi na Jehova nwere ike na-enweghị atụ. (Aịza. 40:26) Ha na-amalite ịtụkwasị Jehova obi n’ihi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. (Diut. 32:4) Ha na-amụta ọtụtụ ihe n’ihi amamihe ya dị ukwuu. (Aịza. 55:9; Rom 11:33) Obi na-adịkwa ha ụtọ ma ha ghọta na Chineke bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Ha na-abịarukwu Jehova nso, obi ana-esikwa ha ike na ha ga-adị ndụ ebighị ebi ka ụmụ Chineke. Ọ bụ ihe na-eme ezigbo obi ụtọ na anyị so na-enyere ndị mmadụ aka ịbịaru Nna ha nso. Anyị mee otú ahụ, Jehova na-ewere anyị ka ndị ha na ya “na-arụkọ ọrụ.”—1 Kọr. 3:5. w24.02 12 ¶15
Satọdee, Disemba 27
Ọ ka mma na i kweghị nkwa kama ị ga-ekwe nkwa ma ghara imezu ya.—Ekli. 5:5.
Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma ọ bụ na ndị mụrụ gị bụ Ndịàmà Jehova, ị̀ na-eche echiche ime baptizim? Ọ dị mma ma ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ. Ma, i kwesịrị inyefe Jehova onwe gị tupu i mee baptizim. Olee otú ị ga-esi nyefee Jehova onwe gị? Ị ga-ekpe ekpere, kwe Jehova nkwa na ọ bụ naanị ya ka ị ga-efe, nakwa na ime uche ya ga-abụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. N’eziokwu, ị na-ekwe Jehova nkwa na ị gaghị akwụsị iji “obi gị niile na mkpụrụ obi gị niile na uche gị niile na ike gị niile” na-ahụ ya n’anya. (Mak 12:30) Ị ga-enyefe Jehova onwe gị mgbe naanị gị na ya nọ. Ma, ime baptizim bụ ihe ị ga-eme n’ihu ọha. Ọ ga-egosi ndị mmadụ na i nyefeela Jehova onwe gị. Nnyefe i nyefere Jehova onwe gị bụ nkwa dị nsọ i kwere ya. Ọ chọkwara ka i mezuo nkwa ahụ otú ahụ ị chọrọ imezu ya.—Ekli. 5:4. w24.03 2 ¶2; 4 ¶5
Sọnde, Disemba 28
Ka onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya. Nwunye kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.—Efe. 5:33.
Di na nwunye ọ bụla na-enwe nsogbu. Baịbụl kwukwara hoo haa na ndị lụrụ di na nwunye ga-enwe “ọtụtụ nsogbu.” (1 Kọr. 7:28) Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na di na nwunye ezughị okè. Àgwà ha, ihe ndị na-amasị ha, na ihe ndị na-anaghị amasị ha abụghị otu. Obodo ha na omenala ha nwekwara ike ịdị iche iche. Ka oge na-aga, ha nwere ike kpaa àgwà ndị di ha ma ọ bụ nwunye ha na-amabughị na ha nwere tupu ha alụọ. Nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nwere ike ịkpata nsogbu. Ha nwere ike ịtawa ibe ha ụta kama ịghọta na onye nke ọ bụla so kpata nsogbu ahụ, nakwa na ha kwesịrị ịgba mbọ dozie ya. Ha nwedịrị ike iche na onye ọ bụla ịga nọọrọ onwe ya ma ọ bụkwanụ ịgba alụkwaghịm bụ ihe ga-edozi nsogbu ha. Ma, ịgba alụkwaghịm ma ọ bụ onye ọ bụla ịnọrọ onwe ya ọ̀ ga-edozili nsogbu? Mba. Jehova chọrọ ka di na nwunye jiri alụmdi na nwunye ha kpọrọ ihe, ọ bụrụgodị na otu n’ime ha na-akpa àgwà ọjọọ. w24.03 16 ¶8; 17 ¶11
Mọnde, Disemba 29
Olileanya a anaghị emenye anyị ihere.—Rom 5:5.
I nyefechaa Jehova onwe gị ma mee baptizim, olileanya i nwere ibi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ paradaịs ga na-esikwu ike ka ị na-amụtakwu ihe ma na-aghọkwu Onye Kraịst tozuru etozu. (Hib. 5:13–6:1) O nwere ike ịbụ na ihe e kwuru ná Ndị Rom 5:2-4 emeela ná ndụ gị. Ọtụtụ nsogbu abịarala gị. Ma, i diri ha niile, hụkwa na o mere ka gị na Jehova dịrị ná mma. Ebe ọ bụ na obi siri gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya, i nwekwuola ezigbo ihe mere i ji atụ anya inweta ihe ndị o kwere gị ná nkwa. Olileanya gị esikwuola ike karịa otú ọ dị ná mmalite. Obi esikwuola gị ike na ọ ga-eme eme. Ọ na-akpakwu ike ná ndụ gị, ya bụ, ọ na-agbanwe ihe niile ị na-eme, otú i si emeso ndị ezinụlọ gị, otú i si ekpebi ihe ndị ị ga-eme, na ihe ndị ị na-eji oge gị eme. Pọl onyeozi kwuru ihe ọzọ dị ezigbo mkpa banyere olileanya i nwere mgbe gị na Chineke bịara dị ná mma. O mere ka obi sie gị ike na olileanya i nwere ga-emezu.—Rom 15:13. w23.12 12-13 ¶16-19
Tuzdee, Disemba 30
[Jehova] ga-eme . . . ka unu kwụrụ chịm.—1 Pita 5:10.
Nsogbu bịaara anyị nwere ike ime ka obi ghara ịna-adị anyị otú ọ na-adịbu anyị, anyị agharakwa ịna-eche echiche nke ọma ma ọ bụ na-eme ihe anyị kwesịrị ime. Otú ahụ ebili mmiri na-esi ebugharị ụgbọ mmiri n’ekweghị ya zuru ike ka nsogbu nwere ike ime ka obi ghara ịna-ezu anyị ike. O nwere ike iwe wetụ anyị, anyị atatụ onwe anyị ma ọ bụ ndị ọzọ ụta. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ma ọ dị anyị otú ahụ? Jehova kwere nkwa na ọ ga-eme ka anyị kwụrụ chịm. Ọ bụrụ na oké ifufe ana-efe n’osimiri, o nwere ike ịna-ebugharị ụgbọ mmiri si n’otu ebe gaa n’ebe ọzọ. Iji mee ka ụgbọ mmiri ahụ ghara ikpu, e nwere ihe ndị a na-etinye n’akụkụ ya abụọ ka o nyere ya aka ịkwụrụ chịm. Ihe ndị ahụ nwere ike inyere ụgbọ mmiri aka ka oké ifufe ghara ịna-ebugharị ya, meekwa ka ahụ́ ruo ndị nọ na ya ala. Ma, ihe ndị ahụ a na-etinye n’ụgbọ mmiri ka oké ifufe ghara ịna-ebugharị ya na-arụ ọrụ nke ọma mgbe ụgbọ mmiri ahụ na-agba agba. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụrụ na anyị anọsie ike n’ofufe Jehova mgbe ihe siiri anyị ike, Jehova ga-eme ka anyị kwụrụ chịm. w24.01 22 ¶7-8
Wenezdee, Disemba 31
M tụkwasịrị Chineke obi; egwu anaghị atụ m.—Ọma 56:4.
Ụjọ bịa gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Gịnị ka Jehova merela?’ Chee banyere ihe ndị o kere eke. Dị ka ihe atụ, Jehova ekeghị ụmụ nnụnụ na okooko osisi n’oyiyi ya, ha agaghịkwa efeli ya ofufe, ma ọ na-elekọta ha. Ọ bụrụ na anyị ‘eleruo anya’ n’otú o si elekọta ha, obi ga-esikwu anyị ike na Jehova ga-elekọtakwa anyịnwa. (Mat. 6:25-32) Cheekwa banyere ihe Jehova meere ndị na-efe ya. I nwere ike ịmụ banyere otu onye a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl, onye gosiri na o nwere okwukwe pụrụ iche, ma ọ bụkwanụ gị agụọ ihe a kọrọ banyere otu ohu Jehova n’oge anyị a. Ihe ọzọ i nwere ike ime bụ ịtụgharị uche n’otú Jehova sirila lekọta gị. Olee otú o si dọta gị n’ọgbakọ ya? (Jọn 6:44) Olee otú o sirila za ekpere gị? (1 Jọn 5:14) Olee uru ị na-erite kwa ụbọchị n’àjà ahụ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ji ndụ ya chụọ?—Efe. 1:7; Hib. 4:14-16. w24.01 4 ¶6; 7 ¶17