Site n’Ụlọ Elu Obodo Ruo n’Ọzara Dị Larịị—Gakwuru Ndị Bi na Ha
MMIRI ozuzo ma ọ bụ snow ma ọ bụ akụ mmiri igwe ma ọ bụ anụ ọhịa wolf ma ọ bụ agụ owuru ma ọ bụ ókèala a na-enweghị omume enyi apụghị ịbịanyụ mmụọ mkpebisi ike ha. N’ọsọ dị egwu, ha na-agba kilomita 3,000, na-agafe ala ahịhịa ndụ, osimiri na-achị ọkụ, na ndagwurugwu ndị miri emi iji buga ozi dị ngwa n’Ụsọ Oké Osimiri Ọdịda Anyanwụ. Olee ndị ha bụ?
Ha bụ ụmụ okorobịa ọgba ịnyịnya isi kara aka nke pony express.a Gịnị kpasuru oké mkpebisi ike dị otú ahụ n’ime ụmụ okorobịa a? Ma eleghị anya ọ bụ ihe ịma aka ya, ahụmahụ ya na-akpali akpali, na afọ ojuju nke ibuga ozi ahụ. N’ụzọ na-akpali mmasị, ọgba ịnyịnya nke ọ bụla bu otu Bible n’akpa njem ya nakwa ozi ahụ bụ isi sekpụ ntị.
Ihe karịrị otu narị afọ n’ihu, ihe karịrị 113,000 ndị nkwusa Alaeze raara onwe ha nye na Canada nile gosipụtara mmụọ ka ukwuu nke mkpebisi ike, ịnụ ọkụ n’obi, na nraranye. Gịnị kpaliri ha? Ịhụnanya maka Chineke na ndị agbata obi na-akpali ha ikesa eziokwu Alaeze site n’akwụkwọ na site n’okwu ọnụ. Eziokwu a na-enye ndụ dị ngwa nke ukwuu karịa akwụkwọ ozi ọ bụla nke pony express kesara. Ee, ọ bụ ozi Alaeze dị oké ọnụ ahịa nke Bible Nsọ, bụ́ kpọmkwem akwụkwọ ahụ dị n’akpa njem nke ndị pony express ahụ na-agba ịnyịnya.—Ilu 2:21, 22; Aịsaịa 2:2-4; 61:2; Matiu 22:37-39; 24:14.
Ndị Ịhụnanya Maka Jehova na Ndị Mmadụ Kpaliri
Ndịàmà Jehova na-enwe mmasị ịgwa ndị mmadụ okwu banyere Alaeze ahụ. Ị ga-ahụ ha ka ha na-eme otú ahụ n’oké ụlọ elu ndị dị n’obodo ukwu, n’ógbè dị larịị ndị dịpụrụ adịpụ, n’ọdụ ụgbọelu, n’okporo ámá na n’ebe ndị ọzọ ọha mmadụ na-anọ, nakwa na telifon. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ n’ebe ndị ahụ dịgasị iche iche?
Ụzọ ibi ndụ ndị na-agbanwenụ nke ọnọdụ akụ̀ na ụba na ọnọdụ mgbasa ụba mmadụ kpatara na-eme ka e nwee ihe ịma aka siri ike ịchọta ndị mmadụ n’ụlọ. N’ọtụtụ ọnọdụ, ma di ma nwunye na-arụ ọrụ iji gboo mkpa ihe onwunwe bụ́ isi nke ezinụlọ, mgbe mgbe na-eleghara mkpa ime mmụọ anya. N’etiti nrụgide na nchekasị ndị dị otú ahụ, ozi obi ụtọ nke na-enye olileanya dịsi ha mkpa ike. Ndịàmà Jehova ji obi ụtọ na-azaghachi. N’iji akọ na obiọma na-eme ihe, ha na-emepụta ohere iji wetara ụdị mmadụ nile ozi ọma n’ụzọ na-adọrọ mmasị, nke na-akpali iche echiche.—1 Timoti 2:3, 4.
N’asụsụ Ndị Ọzọ: Mgbe Jisọs nyere ụmụazụ ya iwu ‘ịga mee ndị na-eso ụzọ,’ o nyere ohere maka iji ọgụgụ isi onwe onye na mkpebisi ike mee ihe n’iwere ozi olileanya ahụ gakwuru ndị na-asụ asụsụ nile. (Matiu 28:19) Dị ka ọ dị n’ọtụtụ ala, Canada aghọwo ebe e nwere ọdịbendị na asụsụ dị iche iche, ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze emewokwa mgbanwe gaa n’ọnọdụ dịnụ site n’ịmụ asụsụ ndị ọhụrụ.
Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye, bụ́ ndị ozi oge nile n’Edmonton, Alberta, hụrụ mkpa dị n’obodo ha ijekwuru ndị na-asụ Mandarin Chinese. Otú ọ dị, nke mbụ, ọ dị di na nwunye ahụ mkpa ịmụ asụsụ ahụ, ya mere ha jekwuuru otu nwa akwụkwọ mahadum na-asụ Mandarin. O kweere ịkụziri ha asụsụ ahụ ma n’otu aka ahụ mụta eziokwu Bible n’aka ha. Lee ọnọdụ magburu onwe ya ọ bụ! N’ime ọnwa 24 ndị nkwusa Alaeze abụọ a ji ihe akpọrọ ihe ruru eru ịkụzi ihe n’asụsụ Mandarin. N’otu oge ahụ, onye nkụzi ha/ha na-amụrụ ihe ruru eru maka baptism ndị Kraịst.
A na-enweta ahụmahụ ndị yiri nke ahụ n’obodo ukwu ndị ọzọ ka ndị nkwusa Alaeze, n’ịbụ ndị ịhụnanya kpaliri, na-amụ asụsụ ndị dị ka Polish, Russian, na Vietnamese.
N’okporo Ụzọ: Dị ka ndị pony express ahụ na-agba ịnyịnya nke narị afọ gara aga, bụ́ ndị na-agba ịnyịnya nanị ha, ụfọdụ ndị nkwusa Alaeze n’ime ime British Columbia na-aga nanị ha. Ha na-etinye ihe dị ukwuu nke oge ha n’ọrụ ego ha nke ịnya gwongworo ndị dị ike e ji ebu osisi site n’ọhịa gaa n’ebe a na-awa osisi. Nke a na-achọ ịnọgide soro ndị ọzọ na-anya gwongworo na-akparịta ụka site n’iji redio CB (citizens band), na-ekwurịta banyere otú ụgbọ si aga n’okporo ụzọ na ihe ize ndụ okporo ụzọ.
N’ichepụta ihe bara uru, ndị nkwusa Alaeze a na-eji redio CB ha eme ihe n’ụzọ pụrụ iche. Ha na-ebu ụzọ amalite nkwurịta okwu na CB ha site n’ihota ihe ndị mere ọhụrụ. Ha ejirizie nkà zoo aka na Bible. N’otu mkparịta ụka otu onye ibe ha na-anya gwongworo zaghachiri n’ihe Bible na-ekwu banyere olileanya maka ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ọnwụ nke onye ibe ya na-anya ụgbọala n’ihe ọghọm mere n’ụzọ awara awara gburu ya mgbu n’obi nke ukwuu. O ji obi ekele nakwere ọmụmụ Bible, ugbu a kwa a pụrụ ịnụ ka ọ na-ekwusara ndị ọrụ ibe ya na ndị enyi ya ozi ọma. Ọzọkwa, n’ịbụrụ ya ihe ọṅụ, a maliteere nwunye enyi ya nwụrụ anwụ ọmụmụ Bible. Lee ụgwọ ọrụ ọ bụ maka ibu ụzọ mee ihe n’izi ozi eziokwu ahụ na-enye ndụ n’ụzọ a pụrụ iche!
Site n’Iji Ụgbọelu: Mgbe a bịara n’izi ozi eziokwu ahụ dị oké ọnụ ahịa, ndị nkwusa Alaeze na-anụ ọkụ n’obi na-aga n’ebe ndị mmadụ nọ, na-eji obere ụgbọelu ‘na-abanye n’obodo nta dị iche iche.’ (Matiu 10:11, 12) N’oge ụfọdụ gara aga, ìgwè abụọ ji ụgbọelu, ndị ịnụ ọkụ n’obi ikwusa ozi ọma ahụ kpaliri nakwa n’ego akpa ha, fegara n’ebe ndị bisasịrị ebisasị n’ókèala buru ibu nke ọzara dị larịị. Ìgwè ụgbọelu nke ọ bụla fere ihe dị ka kilomita 3,000 ma daa n’ógbè 14 dịgasị iche iche, na-ejeru kilomita 250 nke Ógbè Arctic. Ndị nkwusa a ike na-adịghị agwụ agwụ nọgidere ruo ụbọchị asaa zuru ezu iji jekwuru ndị bipụrụ ebe dị anya site n’ebe ibe ha bi.
Ò kwesịkwara mgbalị a? Cheedị nnọọ mmetụta dị mma nke ozi Bible a nwere n’ahụ ógbè ndị a. Ndị ozi a bịara nleta nyere aka imeju mkpa ime mmụọ dị oké mkpa mgbe ha kwupụtara nzube Jehova maka ụwa paradaịs n’ọdịnihu dị nso. (Matiu 5:3) Ogologo oge mgbe ndị wetara ozi ahụ lasịrị, ndị obi ha ziri ezi nọ n’ógbè ndị ahụ ga-enwe ike ịgụ ihe site na Bible na ihe ndị e ji amụ Bible dị 542 nakwa magazin 3,000 e nyefere ha.—Tụlee Ọrụ 12:24.
Site na Telifon: Ọtụtụ puku ndị nọ n’obodo ukwu bicha n’ụlọ elu ndị nwere ngwá nchebe bụcha ọkpọka. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị nkwusa Alaeze raara onwe ha nye ji ịnụ ọkụ n’obi na akọ na-aga n’ihu. Olee otú ha na-esi enwe ike ịga n’ebe ndị a nọ? Ọ bụ ezie na nzute ihu na ihu kasị mma, mgbe mgbe a na-eji telifon ime ụlọ eme ihe n’ụzọ gara nke ọma. Mgbe nke a na-ekweghị omume, ha na-eji mkpịsị aka ha arụ ọrụ ahụ, na-akpọ ndị mmadụ na telifon.
Otu ụtụtụ otu nwanyị meworo agadi zara telifon ya. Mgbe ekele dị mkpirikpi, e ji nsọpụrụ kelee gasịrị, a jụrụ ya ma ọ dị ya ka a ga-enwe oge mgbe ndị mmadụ ga-enwe ike ije ije n’okporo ámá n’abalị n’enweghị ihe ize ndụ. A gụrụ akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche iji mesie ya obi ike na udo ga-ejupụta n’ọdịnihu. (Abụ Ọma 37:10, 11; Daniel 2:44; Matiu 6:9, 10) O kwetara ka e nwee nkwurịta okwu telifon n’izu na-esonụ n’otu oge ahụ iji kwurịta ihe mere anyị ga-eji ekwere nkwa Chineke. Mgbe otu ọnwa nke ịmụ Bible na telifon, ịgụpụta paragraf site n’akwụkwọ e ji amụ Bible na ịjụ ajụjụ ndị kwesịrị ekwesị gasịrị, nwanyị ahụ toro onye nkwusa Alaeze ahụ maka iwebata ọtụtụ isiokwu dị iche iche kwa izu. Oge eruola ịkọwa akwụkwọ ọmụmụ ihe ahụ na inye ya nke ya. Mgbe ahụ e mere ndokwa ka ha abụọ zute onwe ha. N’ezie, Ndịàmà Jehova egosiwo ịhụnanya ha maka ndị mmadụ, ndị mmadụ na-azaghachikwa, na-aghọta na Jehova nọnyeere ndị nkwusa a bụ́ ndị Kraịst.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 14:25.
Site n’Akwụkwọ: Ndị nkwusa Alaeze n’ógbè Quebec nke bụkarịrị ndị na-asụ French bijuru ya na-agakwa n’ebe ndị mmadụ nọ. Otu onye ozi na-ejegharị ejegharị kwuru, sị “Ruo ọtụtụ afọ ọ dị ụmụnna ka ihe ha na-eme enweghị isi n’ihi mmegide siri ike nke chọọchị. Ma site n’ịrụ ọrụ n’enweghị ike ọgwụgwụ nke ụmụnna na njeghachi ha ugboro ugboro, Bible, bụ́ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ a na-amaghị ama na nke nanị ọnụ ọgụgụ ka nta na-agụ, nwere ọnọdụ ya n’ihe ka n’ọtụtụ ụlọ ugbu a.”
A na-arụpụta ihe ndị dị mma ka ndị ọhụrụ na-ezisa ozi ọma na-abịa site n’ọkwá nile nke ọha mmadụ Quebec, tinyere ndị na-ahụ maka ahụ ike. Nke ahụ bụ ọnọdụ nke otu dọkịta. Nwunye ya, bụ́ onye nkwusa Alaeze n’onwe ya, ga-esoro ya kwurịta olileanya Bible mgbe mgbe. Otu okenye ọgbakọ mụ anya buru ụzọ mee ihe n’ịkpọ dọkịta ahụ òkù ka ọ bịa nzukọ ọgbakọ n’oge a na-amụ broshuọ bụ́ How Can Blood Save Your Life? Ọ bịara, ọbụnakwa kere òkè. N’ịbụ onye ọdịdị na ịdị omimi ime mmụọ nke nkwurịta okwu ahụ masịrị, ọ nakweere ọmụmụ Bible nke ya. Ugbu a ya onwe ya kwa bụ onye nkwusa Alaeze.
Iji magazin eme ihe n’ụzọ dị irè ekerewo òkè dị mkpa n’ịdọta ndị mmadụ n’ebe Bible dị. Ọ dịghị mgbe mmadụ ga-ama isiokwu nke ga-arụ ọrụ dị ka ihe ndọta iji dọrọ mmadụ gaa n’eziokwu. Otu onye nkwusa Alaeze nyefere otu onye agbata obi ya na-achọghị ige ntị n’ozi ahụ ma nwee mmasị n’ụmụ ahụhụ otu mbipụta nke Teta! Foto dị n’isiokwu dị na February 8, 1993 nke Teta! bụ́ “Ọrịa Chagas—Ihe Na-eweta Mbibi” dọọrọ mmasị ya. N’ịbụ onye ihe ọ gụrụ tọrọ ụtọ, o kwuru ka e nyekwuo ya magazin. A malitere ọmụmụ Bible, n’ime ọnwa isii kwa ọ nọ na-agbara ndị ọzọ àmà.
Gaa n’Ebe Ọha Mmadụ Na-anọ: Iwu Canada nyere ohere maka nkwuwa okwu n’ebe ọha mmadụ na-anọ dị ka n’ọdụ ụgbọelu. Na Halifax International Airport, ndị nkwusa Alaeze na-eji akọ jekwuru ndị na-eme njem n’oge nkwụsịtụ, na-esoro ha nwee nkwurịta okwu. A na-eji ajụjụ ndị bịara n’oge ha bụ́ ndị na-ajụta echiche ewere nkwurịta okwu ahụ gaa na Bible. Ebe ha na-ebu Bible na-aba n’akpa uwe na akwụkwọ, ha pụrụ ịzaghachi ná mkpa ime mmụọ. Ndị dọkịta na-awa ahụ, ndị ọkà mmụta sayensị, ndị ọkàiwu, ndị na-anya ụgbọelu, ndị ụkọchukwu, ndị uwe ojii, ndị na-anya tagzi, ndị injinia, ndị nkụzi, ndị soja, na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị sitere ná mba ndị ọzọ socha n’ime ndị nụworo ozi Alaeze ahụ n’ụzọ dị otú a ma burukwa mkpụrụ nke eziokwu ka ha wee tolite n’ebe ndị dị anya.—Ndị Kọlọsi 1:6.
N’otu isi ụtụtụ n’ọdụ ụgbọelu ahụ, otu nwoke natara magazin Ụlọ Nche na Teta! O kwuzie n’olu dị nta, dị nro, sị: “Chei, mbanụ, ọ bụghị Ndịàmà Jehova!” N’ihi gịnị ka o ji nwee ụdị mmeghachi omume ahụ? Nwoke ahụ bụ ezigbo onye Alakụba nke ka kpesịrị ekpere n’ụlọ ekpere ọdụ ụgbọelu ahụ. Ọ nọwo na-arịọ Chineke ka o gosi ya amamihe, nghọta, na eziokwu. Echiche nke na Ndịàmà Jehova bụ azịza a zara ekpere ya ozugbo tụrụ ya nnọọ n’anya.
N’ezie, ndị nkwusa Alaeze ahụ nwere obi ike nọ na Canada adịghị ekwe ka ihe ọ bụla nọchiere ha ụzọ n’izi ozi Alaeze ahụ dị oké ọnụ ahịa. Ha adịghị ekwe ka ma asụsụ ndị mba ọzọ, okporo ụzọ uzuzu ndị na-adịghị larịị, ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, ma ọ bụ ụlọ obodo ukwu ndị nwere ngwá nchebe bụ ọkpọka gbochie ha. Ha kpebisiri ike ikesa ozi Chineke nke na-enye ndụ nye ndị ji obi eziokwu na-achọ eziokwu. N’isonyere òtù ụmụnna ha zuru ụwa ọnụ ha na ha na-arụkọ ọrụ, ha ji achọghị ọdịmma onwe onye nanị na-erube isi n’iwu Jisọs ‘ịga mee ndị na-eso ụzọ.’—Matiu 28:19.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Pony express bụ ụlọ ọrụ na-ebu ozi na United States nke dịruru nwa oge bụ́ ọnwa 16 site na 1860 ruo 1861.
[Igbe dị na peeji nke 27]
Ndị Nkwusa Alaeze Na-enwe Ihe Ịga Nke Ọma Na-eji Telifon Eme Ihe
Ụfọdụ asịwo: “Ndewo. Aha m bụ [kpọọ aha gị]. Anọwo m na-esoro ndị bi n’ụlọ gị na-ekwurịta okwu ná mkpirikpi banyere otú a pụrụ isi nweta udo. Ì chere na ọ dị mgbe udo ga-adị n’ụwa nile? [Nye ohere maka nzaghachi.] Iji mee ka ahụ ruo gị ala, anaghị m eme nnyocha ma ọ bụ na-ere ihe ọ bụla. Kama nke ahụ, m nọwo na-ekerịta echiche sitere n’Akwụkwọ Nsọ na Chineke ga-eweta udo n’ezie.” Mgbe ahụ mkparịta ụka ahụ pụrụ ịga n’ihu site n’inwe nkwurịta okwu dị mkpirikpi sitere n’Akwụkwọ Nsọ.
Ndị ọzọ asịwo: “Ndewo. Aha m bụ [kpọọ aha gị]. Abụ m onye ọrụ afọ ofufo nọ n’ógbè unu. Anọwo m na-enweta echiche nke ndị bi n’ụlọ unu. Ọtụtụ na-enwe nchegbu banyere nchebe onwe onye n’ihi ime ihe ike na mpụ na-arị elu n’ógbè anyị. Nke a ọ̀ na-echegbu gị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Ì chere na ọ dị mgbe a ga-enwe oge mgbe ụwa nile ga-anọ ná nchebe?” Nye ohere maka nzaghachi, jirizie ozi Akwụkwọ Nsọ gaa n’ihu.