22 JONATAN
Ezigbo Enyi nke Nwere Obi Ike
E NWERE ụmụ nwoke abụọ ji ngwá agha na-agbago ngwa ngwa n’otu ugwu bụ́ okwute okwute. Ha na-aga ịlụso ìgwè ndị agha Filistia ọgụ. Onye nọ n’ihu bụ Jonatan diọkpara Sọl, bụ́ eze mbụ chịrị Izrel. Onye so Jonatan n’azụ bụ nwoke obi kara na-eburu ya ngwá agha. Ihe Jonatan gwara ya mere ka obi sikwuo ya ike. Ọ sịrị ya: “Jehova chọọ ka anyị merie, o nweghị ihe ga-egbochi ya ime ya, ma ànyị hiri nne ma anyị ehighị nne.” Obere oge, Jehova gosiri na ihe ahụ Jonatan kwuru bụ eziokwu. O nyeere ụmụ nwoke abụọ ahụ aka, ha egbuo ihe dị ka ndị agha iri abụọ. Ihe a mere ka ndị Izrel sụọ ndị Filistia akwụ.
Akụkọ a gosiri na Jonatan nwere ezigbo obi ike. Ọtụtụ ihe ndị ọzọ o mere gosikwara na o nwere obi ike. Ọ naghị ahapụ ndị enyi ya ma ihe sie ike, ọ bụkwa onye nwere obi ike ga-emeli ihe a. Jonatan na-akwadosi Sọl nna ya ike. Ma ka oge na-aga, Sọl ghọrọ onye ọjọọ, malitezie inupụrụ Jehova isi. Ihe a mere ka Jonatan kata obi na-akwado Jehova kama ịkwado nna ya.
Mgbe ọtụtụ afọ gachara, mgbe Jonatan dị ihe dị ka afọ iri ise, o metere Devid, onye ọ tọgburu atọgbu, enyi. N’oge ahụ, Devid gburu dike ndị Filistia aha ya bụ Golayat. O doro anya na Sọl na ndị Izrel niile nọ na-eto Devid maka ihe a. Olee otú obi dị Jonatan n’oge ahụ? O nwereghị Devid anyaụfụ ọ bụla. Kama, o nyere Devid mma agha ya, ájị̀ ya, na ụta ya. Ụta a bụ onyinye pụrụ iche maka na ọ ga-abụ na Jonatan bụ aka ochie n’ịgba ụta. N’agbanyeghị na Jonatan ji ihe dị ka afọ iri atọ tọọ Devid, ha abụọ kwere ibe ha nkwa na ha ga-anọgide na-abụ enyi. Ha mezukwara nkwa ha kwere.
Jonatan kwadoro Chineke ya kama ịkwado nna ya
Na mbụ, Sọl hụkwara Devid n’anya. Ma n’oge na-adịghị anya, ọ kpọrọ Devid asị ma malite inwere ya anyaụfụ. Ọ chọkwara ka Jonatan soro ya kpọọ Devid asị. Ma, Jonatan akwụsịghị ịbụ ezigbo enyi Devid n’agbanyeghị na Jehova ahọrọla Devid kama ịhọrọ ya ka ọ bụrụ eze ga-anọchi Sọl. Mgbe Sọl kwuru na ya chọrọ igbu Devid, Jonatan gbachiteere enyi ya Devid. Ihe a o mere gosiri na o nwere ezigbo obi ike. Ọ bụ eziokwu na Sọl emeela agadi, mana ọ ka bụ dike n’agha. O nwere otu ụbọchị ọ tụrụ Jonatan nwa ya ube maka na ọ gbachiteere enyi ya Devid. Ube ahụ atụtaghị Jonatan. Ma, o wutere ya na nna ya chọrọ igbu ya. Jonatan gakwuuru Devid ma kọọrọ ya na Sọl bu n’obi igbu yanwa bụ́ Devid. Ihe a ọ gwara Devid gosiri na ọ bụ ezigbo enyi ya. Jonatan gwakwara Devid ka o lekọtara ya ndị ezinụlọ ya ma ọ bụrụ na a chọọ ya, a hụghị ya.
Devid gbara ọsọ ndụ maka na Sọl nọ na-achọ igbu ya. Eze Sọl chịdị ndị agha ya na-achụgharị ya. Ihe a mere ka Devid na-ezogharị, ya gbaga ebe a taa, ya agbaga ebe ọzọ echi. Jonatan ò so na-achụgharị Devid? Baịbụl ekwughị na o so. Ma, ọ ga-abụrịrị na o soghị. O nwere oge Jonatan matara ebe Devid zoro, ya agaa ebe ahụ ka ọ hụ ya. Gịnị mere o ji chọrọ ya gaa? Baịbụl kwuru na Jonatan gara ‘gbaa ya ume ka ọ tụkwasị Jehova obi.’ Ọ gwara Devid, sị: “Ụjọ atụla gị, n’ihi na Sọl nna m agaghị emeli gị ihe ọ bụla. Ị ga-abụkwa eze Izrel, mụnwa ga-abụkwa osote gị.” Ndị enyi abụọ a sịrị ibe ha ‘ka e mesịa.’ Ha ahụghịzi ibe ha anya ọzọ.
Obere oge ihe a mechara, Jonatan sooro nna ya gaa ịlụso ndị Filistia, bụ́ ndị iro ndị Izrel, agha. Ma n’oge ahụ, Sọl ahapụla ife Jehova fewezie arụsị. Ọ gadịrị jụọ nwaanyị na-agba afa ase. Jehova kwụsịrị ịnọnyere ya. N’agha ahụ, ndị Filistia merụrụ ya ezigbo ahụ́, ya egbuzie onwe ya. Jonatan nwa Sọl na ụmụnne ya ndị nwoke abụọ ọzọ nwụkwara n’agha n’ụbọchị ahụ.
Ọnwụ Jonatan gbawara Devid obi, ya edee abụ iru uju gosiri otú ọ hụruru ezigbo enyi ya n’anya nakwa otú ọnwụ ya wuteruru ya. Ọ kpọrọ abụ iru uju ahụ “Ụta.” Ọ ga-abụ na ihe mere o ji kpọọ ya “Ụta” bụ ka o jiri ya na-echeta onyinye Jonatan nyere ya ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ. Devid dere n’abụ ahụ, sị: “Nwanne m Jonatan, ọnwụ gị agbawaala m obi. Ị bụ ezigbote enyi m.” Devid mere ihe o kwere enyi ya nwụrụ anwụ ná nkwa. Mgbe Devid ghọrọ eze, ọ malitere ịchọ onye ọ bụla si n’ezinụlọ Jonatan. O mechara chọta otu nwa ya nwoke dara ngwọrọ aha ya bụ Mefiboshet. Devid kpọọrọ ya ka o bikete ya nso na Jeruselem. Malite mgbe ahụ gawa, Devid lekọtawara ya.
Gụọ akụkọ a na Baịbụl:
Ajụjụ a ga-aza:
Gịnị na gịnị ka Jonatan mere gosiri na o nwere obi ike?
Mụtakwuo Ihe
1. Olee ndị bụ ndị Filistia? (w95 2/1 31)
2. Olee otú okwu bụ́ “pim” nke dị na 1 Samuel 13:21 si gosi na ihe a Baịbụl kọrọ bụ eziokwu? (w05 3/15 29) A
Foto nke A: Nkume pim e ji atụ̀ ihe
3. Mgbe Jonatan chọrọ ịlụso ndị Filistia agha, gịnị mere ịgafe ndagwurugwu Mikmash nwere ike iji siere ya ike? Ọ̀ ga-abụ gịnị nyeere ya aka ịgafe? (it “Mikmash” ¶4) B
Todd Bolen/BiblePlaces.com
Foto nke B: O nwere ike ịbụ ebe a ka ndagwurugwu Mikmash dị
Foto nke B: Ebe ọ ga-abụ na ndagwurugwu Mikmash dị
Todd Bolen/BiblePlaces.com
4. Gịnị ka Devid mere iji mezuo nkwa o kwere Jonatan na ya ga-elekọtara ya ndị ezinụlọ ya? (it “Mefiboshet” Nke 2 ¶1)
Chebara Ihe Ndị Ị Mụtara Echiche
Jonatan kwadoro Jehova kama ịkwado Sọl. Olee oge ndị anyị kwesịrị igosi na anyị na-akwado Jehova kama ịkwado onye ọ bụla ọzọ? CH
Foto nke CH
Gịnị ka ihe Baịbụl kọrọ gbasara otú Jonatan na Devid si dịrị ná mma na-akụziri gị banyere . . .
mmadụ na onye ọzọ ịbụ enyi?
mmadụ ịdị umeala n’obi?
mmadụ ịkwado enyi ya?
Olee ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi nwee ụdị obi ike Jonatan nwere?
Chebara Ihe Jehova Bu n’Obi Ime Echiche
Gịnị ka akụkọ a na-akụziri m gbasara Jehova?
Olee otú akụkọ a si gbasa ihe dị iche iche Jehova bu n’obi ime?
Gịnị ka m ga-achọ ịjụ Jonatan ma a kpọlite ya n’ọnwụ?
Mụtakwuo Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị mere ka Jonatan na Devid bụrụ ezigbo enyi? Gịnịkwa ka anyị ga-eme ka anyị na ndị enyi anyị na-adị ná mma ka Jonatan na Devid?
Nyere ụmụ gị aka ka ha mata ihe ndị mere ná ndụ Jonatan, mụtakwa ihe na ha.