Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Taa
Eprel
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2026

Tuzdee, Eprel 14

Ọ̀ bụ na Onye na-ekpe ụwa niile ikpe agaghị eme ihe dị mma?​—Jen. 18:25.

Ihe ga-eme ka mmadụ dịrị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu abụghị mgbe onye ahụ nwụrụ. Jehova bụ Onyeikpe zuru okè. Ikpe ya niile na-ezi ezi. (Ọma 33:4, 5) Obi kwesịrị isi anyị ike na “Onye na-ekpe ụwa niile ikpe” ga-eme ihe ziri ezi. E nwekwara ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwuo na ihe ga-egosi ma mmadụ ọ̀ ga-adị ndụ ebighị ebi abụghị ebe onye ahụ bi. Anyị agatụdịghị echewe echiche na Jehova ga-ekwu na ọtụtụ nde mmadụ bụ “ewu” n’ihi na ha bi n’obodo ndị ha na-enweghị ike ịnụ ozi ọma gbasara Alaeze Chineke. (Mat. 25:46) Onye na-ekpe ụwa niile ikpe ziri ezi na-eche gbasara ndị ahụ karịa otú anyị nwere ike iche. Anyị amaghị ihe niile Jehova ga-eme n’oge oké mkpagbu. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha ga-enwe ohere ịmụta gbasara Jehova, nwee okwukwe na ya, ma mee ihe gosiri na ha na-akwado Jehova mgbe ọ ga-eme ka ndị niile nọ n’ụwa mata na ọ dị nsọ.​—Ezik. 38:16. w24.05 12 ¶14-15

Eprel 13-19
Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2026 | Mach

EPREL 13-19

AỊZAYA 52-53

Abụ nke 18 na Ekpere | Okwu Mmeghe (1 nkeji)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

[Foto dị n’ihu akwụkwọ a]

Ebe Jizọs bu osisi na-aga n’ebe a ga-egbu ya

1. Jizọs Hụrụ Ụmụ Mmadụ n’Anya Nke Ukwuu

(Nkeji 10)

A ga-eleda Jizọs anya (Aịza. 53:3; Mat. 26:67, 68; w10 11/15 7 ¶2)

Jizọs ga-ekwe ka e mekpaa ya ahụ́ (Aịza. 53:7; ip-2 205 ¶25)

Ọ bụ maka na Jizọs hụrụ Jehova na ụmụ mmadụ n’anya mere o ji kweta ịta ahụhụ ka o wee mee uche Jehova ma buru mmehie anyị (Aịza. 53:10-12; Jọn 14:31; 15:13)

Ebe e kpuchiri Jizọs ihe n’ihu, ndị isi okpukpe agbaa ya gburugburu. Otu onye n’ime ha kụrụ ya ọkpọ, ndị ọzọ ana-akwa ya emo.

2. Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke

(Nkeji 10)

  • Aịza. 52:11​—Kọwaa otú ndị ohu Jehova ga-esi eme ihe a e buru n’amụma na ha ga-eme. (it “Arịa” ¶2)

  • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a ị ga-achọ ịkọ?

3. Ọgụgụ Baịbụl

(Nkeji 4) Aịza. 53:3-12 (th ihe ọmụmụ nke 10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

4. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 4) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa ya otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 4 nọmba nke 4)

5. Ịmalite Mkparịta Ụka

(Nkeji 3) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Kụziere mmadụ otu n’ime eziokwu ndị dị n’ihe ndị ọzọ a kọwara nke A na broshọ bụ́ Hụ Ndị Mmadụ n’Anya. (lmd isi nke 3 nọmba nke 3)

6. N’Oge Ọzọ

(Nkeji 5) OZI ỤLỌ N’ỤLỌ. Gwa onye bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs otú anyị na ndị mmadụ si amụ Baịbụl nakwa na ị chọrọ ka gị na ya mụwa Baịbụl. (lmd isi nke 8 nọmba nke 3)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Abụ nke 20

7. Bụrụ Enyi Jehova​—Ịhụnanya Kachanụ E Gositụrụla

(Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.

Foto si na vidio bụ́ “Bụrụ Enyi Jehova​—Ịhụnanya Kachanụ E Gositụrụla.” Ebe Jizọs bụ Eze n’eluigwe.

Kpọnye VIDIO. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a:

  • Olee otú àjà Jizọs chụrụ si bụrụ onyinye?

  • Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka àjà ọ chụrụ?

8. Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ

(Nkeji 30) lfb isi nke 76-77

Okwu Mmechi (Nkeji 3) | Abụ nke 57 na Ekpere

Isiokwu Ndị Dị n’Ụlọ Nche A
Ụlọ Nche (Nke A Na-amụ Amụ)—2026 | Febụwarị

Isiokwu A Ga-amụ na Eprel 13 ruo 19, 2026

8 Ihe Baptizim Pụtara na Uru Ọ Bara

Akwukwo Igbo (1984-2026)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya