Esta
5 O wee ruo n’ụbọchị nke atọ+ na Esta jiri ejiji dị ka nwunye eze,+ wee gaa guzoro n’ogige nke dị n’ime+ n’ụlọ eze, bụ́ nke chere ihu n’ụlọ eze, ka eze nọ ọdụ n’ocheeze ya n’ụlọ eze nke chere ihu n’ebe e si abata n’ụlọ ahụ. 2 O wee ruo na ozugbo eze hụrụ Esta nwunye ya ka o guzo n’ogige ụlọ ya, ihe ya masịrị ya,+ eze wee setịara Esta mkpanaka ọlaedo+ o ji n’aka. Esta wee bịa nso metụ aka n’ọnụ mkpanaka ahụ.
3 Eze wee sị ya: “Ọ̀ bụ gịnị, Esta nwunye m, gịnịkwa ka ị chọrọ ka m meere gị?+ Ọ bụrụgodị ọkara alaeze m,+ a ga-enye gị ya!” 4 Esta wee sị: “Ọ bụrụ na ọ dị eze mma, ka eze na Heman+ bịa taa n’oriri+ m kwadebeere ya.” 5 Eze wee sị: “Gwanụ Heman ka o mee ihe Esta kwuru n’egbughị oge.”+ E mesịa, eze na Heman bịara oriri ahụ Esta kwadebere.
6 Ka oge na-aga, eze sịrị Esta n’oge a na-aṅụ mmanya: “Gịnị ka ị na-arịọ ka m meere gị?+ A ga-emere gị ya! Gịnị ka ị chọrọ ka m meere gị? Ọ bụrụgodị ọkara alaeze m, ka e mee ya!” 7 Esta wee zaa, sị: “Ihe m na-arịọ na ihe m chọrọ ka e meere m bụ, 8 Ọ bụrụ na ihe m masịrị gị,+ ọ bụrụkwa na ọ dị mma n’anya eze imere m ihe m chọrọ na ime ihe m na-arịọ, ka eze na Heman bịa n’oriri m ga-emere ha echi, m ga-emekwa dị ka eze kwuru echi.”+
9 Heman wee jiri ọṅụ+ na obi ụtọ laa n’ụbọchị ahụ; ma ozugbo Heman hụrụ Mọdekaị n’ọnụ ụzọ ámá eze,+ hụkwa na o bilighị,+ ọ maghịkwa jijiji n’ihi ya,+ ọnụma wee ju Heman obi+ ozugbo ahụ n’ihi Mọdekaị. 10 Otú ọ dị, Heman jidere onwe ya wee bata n’ụlọ ya. O wee kpọkọta ndị enyi ya na Ziresh+ nwunye ya; 11 Heman wee kọọrọ ha banyere ịdị ukwuu nke akụnụba+ ya nakwa otú ụmụ ya si dị ọtụtụ+ nakwa ihe niile eze ji mee ka ọ dị ukwuu nakwa otú o si bulie ya elu karịa ndị isi na ndị na-ejere eze ozi.+
12 Heman wee gaa n’ihu ịsị: “Esta bụ́ nwunye eze kpọkwara naanị mụ na eze oriri nke ọ kwadebere,+ ọ kpọkwara mụ na eze ka anyị bịa na nke ya echi.+ 13 Ma ihe a niile enweghị nke dị m mma ma m na-ahụ Mọdekaị onye Juu ahụ ka ọ nọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ámá eze.” 14 Ziresh bụ́ nwunye ya na ndị enyi ya niile wee sị ya: “Ka ha rụọ osisi+ ogo ya dị iri kubit ise. E ruzie n’ụtụtụ+ gwa eze ka a kwụgbuo Mọdekaị n’elu ya.+ Jirizie ọṅụ soro eze gawa oriri ahụ.” Nke ahụ wee dị nnọọ mma n’anya+ Heman, o wee kwuo ka a rụọ osisi ahụ.+