Abụ Ọma Abụ Nrịgo. 128 Obi ụtọ na-adịrị onye ọ bụla nke na-atụ egwu Jehova,+Onye na-eje ije n’ụzọ ya.+ 2 N’ihi na ị ga-eri ihe aka gị rụpụtara.+Obi ụtọ ga-adịrị gị, ihe ga-agazikwara gị.+ 3 Nwunye gị ga-adị ka osisi vaịn na-amị mkpụrụ+N’ime ime ụlọ gị.Ụmụ gị ga-adị ka ome osisi oliv+ gburugburu tebụl gị. 4 Lee! Otú ahụ ka a ga-esi gọzie dimkpa+Nke na-atụ egwu Jehova.+ 5 Jehova ga-esi na Zayọn gọzie gị.+Hụkwa ọganihu Jeruselem ụbọchị niile nke ndụ gị,+ 6 Hụkwa ụmụ ụmụ gị.+Ka udo dịrị Izrel.+