Ọrụ Ndịozi
1 Tiofilọs,+ n’ihe ndekọ mbụ nke m dere, m dere banyere ihe niile Jizọs malitere ime na ịkụzi,+ 2 ruo n’ụbọchị a kpọgooro ya n’elu,+ mgbe o nyesịrị ndịozi ọ họọrọ iwu site na mmụọ nsọ.+ 3 O ji ọtụtụ ihe àmà doro anya gosi ha na ya dị ndụ mgbe ọ tasịrị ahụhụ,+ ha hụkwara ya ruo ụbọchị iri anọ, o wee na-ekwu ihe dị iche iche banyere alaeze Chineke.+ 4 Mgbe ya na ha zukọrọ, o nyere ha iwu, sị: “Unu esila na Jeruselem pụọ,+ kama cherenụ ihe Nna m kwere ná nkwa,+ nke unu nụrụ banyere ya n’ọnụ m; 5 n’ihi na Jọn ji mmiri mee baptizim, ma a ga-eji mmụọ nsọ+ mee unu baptizim ụbọchị ole na ole mgbe nke a gasịrị.”
6 Mgbe ha zukọrọ, ha jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ na-eweghachiri Izrel alaeze+ ahụ n’oge a?” 7 Ọ gwara ha, sị: “Ọ dịrịghị unu ịmara oge ahụ ma ọ bụ mgbe a kara aka+ nke Nna m debere ka ọ dị n’aka ya;+ 8 kama unu ga-anata ike+ mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà+ m ma na Jeruselem+ ma na Judia dum nakwa na Sameria,+ ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.”+ 9 Mgbe o kwusịrị ihe ndị a, ka ha nọ na-ele anya, e buliri ya elu,+ ígwé ojii kpuchikwara ya, ha wee ghara ịhụkwa ya anya.+ 10 Mgbe ha nọkwa na-ele anya na mbara igwe ka ọ na-aga,+ lee! ụmụ nwoke abụọ ndị yi uwe ọcha+ guzoro ha n’akụkụ, 11 ha wee sị: “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzoro na-ele anya na mbara igwe? Jizọs a, onye e si n’ebe unu nọ kpọgoro na mbara igwe, ga-esi otú a bịa,+ ya bụ, n’otu ụzọ ahụ unu hụrụ ya ka ọ na-abanye na mbara igwe.”
12 Ha wee si n’ugwu a na-akpọ Ugwu Oliv, nke dị nso na Jeruselem, laghachi+ na Jeruselem, nke bụ́ njem na-ewe otu ụbọchị izu ike site n’ebe ahụ.+ 13 Ya mere, mgbe ha rutere, ha gbagooro n’ọnụ ụlọ dị n’elu,+ bụ́ ebe ha na-anọ, ya bụ, Pita na Jọn na Jems na Andru, Filip na Tọmọs, Batọlọmiu na Matiu, Jems nwa Alfiọs na Saịmọn onye na-anụ ọkụ n’obi, na Judas nwa Jems.+ 14 Ndị a niile ji otu obi nọgide na-ekpe ekpere,+ ha na ụmụ nwaanyị+ ụfọdụ na Meri nne Jizọs nakwa ụmụnne ya ndị ikom.+
15 N’ụbọchị ndị a, Pita biliri ọtọ n’etiti ụmụnna ya wee sị (ìgwè mmadụ ahụ dum dị ihe dị ka otu narị na iri abụọ): 16 “Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ mezuo,+ bụ́ nke mmụọ nsọ+ kwuru tupu oge eruo site n’ọnụ Devid banyere Judas,+ onye ghọrọ onye duziri ndị jidere Jizọs,+ 17 n’ihi na ọ bụbu onye òtù anyị,+ o ketakwara òkè n’ije ozi a.+ 18 (Ya mere, nwoke a ji ụgwọ ọrụ nke ajọ omume+ zụta+ otu ala, o bukwa ụzọ sụọ isi n’ala,+ afọ ya wee gbawaa mee mkpọtụ, eriri afọ ya niile wee wụpụta. 19 Ọ ghọkwara ihe ndị niile bi na Jeruselem maara, nke mere na a kpọrọ ala ahụ Akeldama n’asụsụ ha, ya bụ, Ala Ọbara.) 20 N’ihi na e dere n’akwụkwọ Abụ Ọma, sị, ‘Ka ebe obibi ya ghọọ ebe tọgbọrọ n’efu, ka a gharakwa inwe onye ga-ebi n’ime ya,’+ nakwa, ‘Ka onye ọzọ weghara ọrụ nlekọta ọ na-arụ.’+ 21 N’ihi ya, ọ dị mkpa na, n’ime ndị ikom na-eso anyị n’oge niile Onyenwe anyị Jizọs jegharịrị n’etiti anyị,+ 22 malite na mgbe Jọn mere ya baptizim+ ruo n’ụbọchị e si n’ebe anyị nọ kpọgoo ya n’eluigwe,+ otu n’ime ndị ikom ndị a kwesịrị iso anyị bụrụ ndị àmà nke mbilite n’ọnwụ ya.”+
23 Ya mere, ha kpọpụtara mmadụ abụọ, Josef onye a na-akpọ Basabas, bụ́ onye a kpọkwara Jọstọs, na Matayas. 24 Ha kpekwara ekpere, sị: “Gị, Jehova, onye maara obi mmadụ niile,+ biko, gosi anyị onye ị họọrọ n’ime ndị ikom abụọ a, 25 ka o weghara ozi a na ọrụ onyeozi a,+ nke Judas hapụrụ gawara onwe ya.” 26 Ya mere, ha feere ha nza,+ nza wee ma Matayas; e wee gụnye ya n’onye so ná ndịozi iri na otu+ ahụ.