Ilu
9 Ezigbo amamihe arụọla ụlọ ya.
O gwunyela* ogidi asaa ya.
2 O gbuchaala anụ ya.
Ọ gwaala mmanya ya.
Ọ dọwala ihe dị iche iche na tebụl ya.
3 O zipụla ụmụ nwaanyị na-ejere ya ozi
Ka ha nọrọ n’ebe ndị dị elu n’obodo na-akpọ ndị mmadụ òkù, sị:+
4 “Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.”
Ọ na-agwa onye na-enweghị uche, sị:
5 “Bịa rie nri m,
Sorokwa ṅụọ mmanya m gwara agwa.
6 Kwụsị izuzu nzuzu* ka i wee dịrị ndụ.+
Na-ebi ndụ otú na-egosi na ị na-aghọta ihe.”*+
7 Onye na-adọ onye na-akwa mmadụ emo aka ná ntị na-akparị onwe ya,+
Ihere ga-emekwa onye na-abara onye ajọ omume mba.
8 Abarala onye na-akwa mmadụ emo mba ka ọ ghara ịkpọ gị asị.+
Baara onye ma ihe mba, ọ ga-ahụ gị n’anya.+
9 Kụziere onye ma ihe ihe, ọ ga-amakwu ihe.+
Kụziere onye ezi omume ihe, ọ ga-amụtakwu ihe.
10 Ihe na-egosi na mmadụ amatawala ihe bụ onye ahụ ịtụ egwu Jehova,+
Ihe na-egosikwa na mmadụ na-aghọta ihe bụ onye ahụ ịmata Onye Kacha Nsọ.+
12 Ọ bụrụ na ị mara ihe, ọ bụ gị ka ọ ga-abara uru.
Ma, ọ bụrụ na ị na-akwa ndị mmadụ emo, ọ bụ naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
13 Nwaanyị nzuzu na-eme mkpọtụ.+
O nweghị uche, ọ maghịkwa ihe ọ bụla.
14 Ọ na-anọrọ ọdụ n’ọnụ ụzọ ụlọ ya,
N’oche dị n’ebe ndị dị elu n’obodo,+
15 Na-akpọ ndị na-agafe agafe òkù,
Bụ́ ndị na-agara onwe ha n’ụzọ, sị:
16 “Onye ọ bụla na-amaghị ihe, ya bata ebe a.”
Ọ na-agwa ndị na-enweghị uche, sị:+