Ilu
8 Ọ̀ bụ na amamihe anọghị na-akpọ òkù?
Ọ̀ bụ na nghọta anọghịkwa na-eti mkpu?+
3 Ọ na-anọ n’akụkụ ọnụ ụzọ ámá e si abanye n’obodo,
N’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ dị iche iche,
Na-eti mkpu n’oké olu, sị:+
4 “Ndị mmadụ, ọ bụ unu ka m na-akpọ òkù.
Ọ bụ mmadụ niile ka m weliri olu na-agwa okwu.
5 Unu ndị na-amaghị ihe, maranụ ihe.+
Unu ndị nzuzu, nweenụ uche.
6 Geenụ ntị, n’ihi na ihe m na-ekwu dị mkpa.
Ihe m na-ekwu dị mma.
7 N’ihi na m weturu olu na-ekwu eziokwu,
Ejighịkwa m ọnụ m ekwu ihe ọjọọ.
8 Ihe niile ọnụ m na-ekwu dị mma.
E nweghị nke bụ́ ụgha, e nweghịkwa nke na-eduhie mmadụ.
9 Ha niile doro onye na-aghọta ihe anya,
Ndị ma ihe makwa na ha ziri ezi.
11 N’ihi na amamihe ka nkume kọral* mma.
E nweghị ihe ọ bụla ọzọ bara ezigbo uru a ga-eji tụnyere ya.
12 Abụ m amamihe. Mụ na nghọta bi.
M mụtala ihe, m na-echekwa echiche nke ọma.+
13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+
M kpọrọ nganga na mmadụ ibuli onwe ya elu asị,+ kpọọkwa ihe ọjọọ na okwu rụrụ arụ asị.+
14 Enwere m ezigbo ndụmọdụ na ezigbo amamihe.+
M na-aghọta ihe,+ m dịkwa ike.+
16 Ọ bụ m ka ndị isi ji achị,
Ọ bụkwa m ka ndị a ma ama ji ekpe ikpe ziri ezi.
18 Akụnụba na ebube dị m n’aka,
Akụ̀ na-anaghị agwụ agwụ na ezi omume dịkwa m n’aka.
19 Mkpụrụ m na-amịpụta ka ọlaedo mma. Ọ kadị ọlaedo a nụchara anụcha mma.
Ihe m na-emepụta dịkwa mma karịa ọlaọcha kacha mma.+
20 M na-eje ije n’ụzọ ezi omume,
N’etiti okporo ụzọ ikpe ziri ezi.
21 M na-ekenye ndị hụrụ m n’anya nnukwu ihe,
M na-emekwa ka ebe ha na-akwasa ihe ju n’ọnụ.
22 Jehova kere m, mụ abụrụ mmalite ụzọ ya.+
Abụ m nke mbụ n’ime ihe niile o kere n’oge dị anya gara aga.+
25 A mụrụ m tupu e mee ka ugwu ukwu dịrị,
Tupu e nwee ugwu nta,
26 Mgbe ọ na-ekebeghị ụwa na mbara ala ya
Ma ọ bụ ájá mbụ dị n’ụwa.
27 Mgbe ọ kwadebere eluigwe,+ anọ m ya.
Mgbe ọ kpaara mbara igwe na osimiri ókè,+
28 Mgbe o mere ka ígwé ojii dịrị n’elu,*
Mgbe o mere ka oké osimiri ju n’ọnụ,
29 Mgbe o nyere oké osimiri iwu
Ka mmiri ya ghara ịgafe ókè ọ kpaara ya,+
Mgbe ọ tọrọ ntọala ụwa,
30 Mgbe ahụ, m nọ n’akụkụ ya na-arụ ọrụ. Abụkwa m ọkà n’ọrụ.+
Ihe gbasara m na-eme ya ezigbo obi ụtọ+ kwa ụbọchị.
M na-aṅụrị ọṅụ n’ihu ya mgbe niile.+
31 M ṅụrịrị ọṅụ n’ihi ụwa ọ kwadebere ka e biri na ya,
Ihe gbasara ụmụ mmadụ na-emekwa m ezigbo obi ụtọ.
32 Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị.
Ndị na-eso ụzọ m na-enwe obi ụtọ.
33 Nabatanụ aka ná ntị* a na-adọ unu+ ka unu wee mara ihe.
Unu elegharala ya anya.
34 Onye na-ege m ntị na-enwe obi ụtọ.
Ọ na-abịa n’ọnụ ụzọ ụlọ m* kwa ụbọchị n’isi ụtụtụ.
Ọ na-echere n’akụkụ ọnụ ụzọ m.
36 Ma onye na-ejighị m kpọrọ ihe na-emerụ onwe ya ahụ́.
Ndị kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ n’anya.”+