Ozi Ọma Jọn Dere
15 “Abụ m ezigbo osisi vaịn, ọ bụkwa Nna m na-elekọta ya. 2 Ọ na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-anaghị amị mkpụrụ. Ọ na-eme ka nke ọ bụla na-amị mkpụrụ dị ọcha, ka o wee na-amịkwu mkpụrụ.+ 3 Okwu m gwara unu emeela ka unu dị ọcha.+ 4 Nọgidenụ n’ime m, m ga-anọgidekwa n’ime unu. Otú ahụ alaka na-enweghị ike ịmị mkpụrụ n’onwe ya ma ọ bụrụ na ọ dịgideghị n’osisi vaịn, ka unu na-enweghịkwa ike ịmị mkpụrụ ma ọ bụrụ na unu anọgideghị n’ime m.+ 5 Abụ m osisi vaịn. Unu bụ alaka ya. Onye ọ bụla nọgidere n’ime m, mụ anọgidekwa n’ime ya, ọ na-amị mkpụrụ dị ukwuu.+ N’ihi na e wepụ m, e nweghị ihe ọ bụla unu ga-emeli. 6 Ọ bụrụ na onye ọ bụla anọgideghị n’ime m, ọ ga-adị ka alaka a tụfuru atụfu, ọ na-akpọnwụkwa. Ndị mmadụ na-achịkọta alaka ndị ahụ ma wụba ha n’ime ọkụ, ha eree ọkụ. 7 Ọ bụrụ na unu anọgide n’ime m, okwu m adịgidekwa n’ime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ, a ga-emekwara ya unu.+ 8 A na-enye Nna m otuto mgbe unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu ma na-egosi na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.+ 9 Otú Nna m hụrụ m n’anya+ ka m hụkwara unu n’anya. Na-emenụ ihe ga-eme ka m na-ahụ unu n’anya. 10 Ọ bụrụ na unu ana-eme ihe m nyere n’iwu, unu ga-abụ ndị m hụrụ n’anya, otú ahụ m mere ihe Nna m nyere n’iwu wee bụrụ onye ọ hụrụ n’anya.
11 “M gwara unu ihe ndị a ka unu wee nwee ọṅụ m na-enwe, ka e meekwa ka ọṅụ unu zuo ezuo.+ 12 Ihe m nyere unu n’iwu bụ ka unu hụ ibe unu n’anya otú m hụrụ unu n’anya.+ 13 E nweghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-enye ndụ* ya maka ndị enyi ya.+ 14 Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu na-eme ihe m na-enye unu n’iwu.+ 15 Anaghịzi m akpọ unu ndị ohu n’ihi na ohu anaghị ama ihe nna ya ukwu na-eme. Kama ana m akpọ unu ndị enyi m n’ihi na m mere ka unu mara ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m. 16 Ọ bụghị unu họọrọ m, kama ọ bụ m họọrọ unu. M họpụtara unu ka unu nọgide na-amị mkpụrụ, ka mkpụrụ unu dịgidekwa, ka Nna m wee nye unu ihe ọ bụla unu rịọrọ ya n’aha m.+
17 “Ihe ndị a ka m na-enye unu n’iwu, ka unu na-ahụ ibe unu n’anya.+ 18 Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọọla m asị tupu ya akpọọ unu asị.+ 19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ unu n’anya. Ma ebe ọ bụ na unu abụghị nke ụwa,+ kama m si n’ụwa họrọ unu, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.+ 20 Chetanụ okwu m gwara unu: Ohu anaghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha kpagburu m, ha ga-akpagbukwa unu.+ Ọ bụrụ na ha mere ihe m kwuru, ha ga-emekwa ihe unu kwuru. 21 Ma ha ga-eme unu ihe niile a n’ihi aha m n’ihi na ha amaghị Onye zitere m.+ 22 A sị na abịaghị m gwa ha okwu, ha agaraghị enwe mmehie.*+ Ma ugbu a, e nweghị otú ha ga-esi sị na ha enweghị mmehie.+ 23 Onye ọ bụla kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị.+ 24 A sị na e nwetụla onye rụrụ ọrụ ndị m rụrụ n’etiti ha, ha agaraghị enwe mmehie.*+ Ma ugbu a, ha ahụla m ma kpọọ mụ na Nna m asị. 25 Ma ihe a mere ka e wee mezuo ihe e dere n’Iwu* ha, nke sịrị: ‘Ha kpọrọ m asị n’agbanyeghị na e nweghị ihe m mere ha.’+ 26 M ga-esi n’ebe Nna m nọ zitere unu ihe inyeaka, bụ́ mmụọ nke eziokwu,+ nke na-esi n’ebe Nna m nọ abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-agba àmà banyere m.+ 27 Unu ga-agbakwa àmà banyere m+ n’ihi na mụ na unu nọ site ná mmalite.