31 Ya mere, ọgbakọ+ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, e wee na-ewuli ya elu; ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-eje ije n’egwu Jehova,+ na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.+
7Ya mere, ebe anyị nwere nkwa ndị a,+ ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ+ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ,+ wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.+
17 Ọ bụrụkwa na unu na-akpọku Nna nke na-ekpe ikpe n’eleghị mmadụ anya n’ihu+ dị ka ọrụ onye nke ọ bụla si dị, jirinụ egwu na-eme omume+ n’oge unu bi dị ka ndị ala ọzọ.+