Ilu 10:31 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 31 Ọnụ onye ezi omume na-amị mkpụrụ amamihe,+ ma a ga-ebepụ ire nke na-ekwu okwu rụrụ arụ.+ Ilu 18:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Egbugbere ọnụ onye nzuzu na-ese okwu,+ ọnụ ya na-akpọkwa ụtarị òkù.+ Ekliziastis 10:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Okwu ọnụ onye maara ihe na-eweta ihu ọma,+ ma egbugbere ọnụ onye nzuzu na-eloda ya.+ Jems 3:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 Ma ire, ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịzụ̀ ya. Ọ bụ ihe ọjọọ siri ike nchịkwa, o jupụtara ná nsí na-eweta ọnwụ.+
8 Ma ire, ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịzụ̀ ya. Ọ bụ ihe ọjọọ siri ike nchịkwa, o jupụtara ná nsí na-eweta ọnwụ.+