Ilu
Ọ bụ nwa maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa,+ nwa nzuzu bụkwaara nne ya ihe iru uju.+ 2 Akụ̀ onye ajọ omume agaghị aba uru,+ ma, ọ bụ ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.+ 3 Jehova agaghị eme ka agụụ gụọ mkpụrụ obi onye ezi omume,+ ma ihe na-agụsi ndị ajọ omume ike ka ọ ga-ewepụ.+
4 Onye dị umengwụ n’ọrụ ga-ada ogbenye,+ ma, ọ bụ aka onye dị uchu ga-eme ka ya onwe ya baa ọgaranya.+
5 Nwa nke ji nghọta eme ihe na-achịkọta ihe n’oge okpomọkụ; nwa nke na-emechu mmadụ ihu na-anọ n’oké ụra n’oge owuwe ihe ubi.+
6 Ngọzi na-adịrị isi onye ezi omume,+ ma ọnụ ndị ajọ omume na-ezochi ime ihe ike.+ 7 Ncheta a na-echeta onye ezi omume ga-ewetara ya ngọzi,+ ma aha ndị ajọ omume ga-ere ure.+
8 Onye nwere obi amamihe ga-anabata ihe e nyere n’iwu,+ ma onye dị nzuzu n’egbugbere ọnụ ya ka a ga-azọda n’ala.+
9 Onye na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe ga na-eje ije n’obi iru ala,+ ma onye na-eme ka ụzọ ya gbagọọ agbagọ ga-eme ka a mata onye ya onwe ya bụ.+
10 Onye na-atabiri mmadụ anya ga-eweta ihe mgbu,+ onye dịkwa nzuzu n’egbugbere ọnụ ya ka a ga-azọda n’ala.+ 11 Ọnụ onye ezi omume bụ isi iyi nke ndụ;+ ma ọnụ ndị ajọ omume na-ezochi ime ihe ike.+
12 Ọ bụ ịkpọasị na-akpali esemokwu,+ ma ịhụnanya na-ekpuchi ọbụna mmejọ niile.+
13 N’egbugbere ọnụ onye nwere nghọta ka a na-achọta amamihe,+ ma ụtarị bụ maka azụ onye na-enweghị uche.+
14 Ọ bụ ndị maara ihe na-echekwa ihe ọmụma,+ ma ọnụ onye nzuzu dị nso ná mbibi.+
15 Ihe dị oké ọnụ ahịa nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike.+ Mbibi nke ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha bụ ogbenye ha dara.+
16 Ihe onye ezi omume na-eme na-eduba ná ndụ;+ ihe onye ajọ omume na-emepụta na-eduba ná mmehie.+
17 Onye na-ejigide ịdọ aka ná ntị bụ ụzọ nke na-eduba ná ndụ,+ ma onye na-ahapụ ịdọ aka ná ntị na-akpata ifu ụzọ.+
18 N’ebe e nwere onye na-ekpuchi ịkpọasị ka e nwere egbugbere ọnụ nke na-ekwu okwu ụgha,+ onye na-ewetakwa akụkọ ọjọọ dị nzuzu.+
19 N’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị,+ ma onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.+
20 Ire onye ezi omume bụ ọlaọcha kasị mma;+ obi onye ajọ omume abachaghị uru.+
21 Egbugbere ọnụ onye ezi omume na-azụ ọtụtụ ndị dị ka atụrụ,+ ma ndị nzuzu na-anwụ n’ihi enweghị uche.+
22 Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya,+ ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.+
23 Ime omume rụrụ arụ dị ka egwuregwu n’anya onye nzuzu,+ ma amamihe dịịrị onye nwere nghọta.+
24 Ihe onye ajọ omume na-atụ ụjọ—ọ bụ ya ga-abịara ya;+ ma a ga-enye ndị ezi omume ihe na-agụ ha.+ 25 Dị ka mgbe oké ifufe mmiri gafere, otú ahụ ka onye ajọ omume na-agakwaghị anọ;+ ma onye ezi omume bụ ntọala ruo mgbe ebighị ebi.+
26 Dị ka mmanya gbara ụka si adị n’ezé, dịkwa ka anwụrụ ọkụ si adị n’anya, otú ahụ ka onye umengwụ dị n’anya ndị dunyere ya ozi.+
27 Ọ bụ egwu Jehova ga-atụkwasịrị mmadụ ọtụtụ ụbọchị,+ ma a ga-eme ka afọ ndụ ndị ajọ omume dị mkpụmkpụ.+
28 Ihe ndị ezi omume na-atụ anya ya bụ ịṅụrị ọṅụ,+ ma olileanya ndị ajọ omume ga-ala n’iyi.+
29 Ụzọ Jehova bụụrụ onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ebe e wusiri ike,+ ma mbibi dịịrị ndị na-eme ihe ọjọọ.+
30 A gaghị eme ka onye ezi omume maa jijiji ruo mgbe ebighị ebi;+ ma ndị ajọ omume agaghị ebi n’ụwa mgbe niile.+
31 Ọnụ onye ezi omume na-amị mkpụrụ amamihe,+ ma a ga-ebepụ ire nke na-ekwu okwu rụrụ arụ.+
32 Ihe egbugbere ọnụ onye ezi omume maara bụ ihe dị mma,+ ma ihe ọnụ ndị ajọ omume maara bụ ihe rụrụ arụ.+