Ilu
18 Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya;+ ọ bụ ezi amamihe niile ka ọ ga-agbaso mgba.+
2 Nghọta adịghị atọ onye ọ bụla dị nzuzu ụtọ,+ ọ gwụla ma è kpughere ihe dị n’obi ya.+
3 Mgbe onye ajọ omume batara, nlelị ga-abatakwa;+ ihe ihere na nkọcha na-agakọkwa.+
4 Okwu ọnụ mmadụ bụ mmiri miri emi.+ Isi iyi na-asụpụta asụpụta ka olulu mmiri nke amamihe bụ.+
5 Imelara onye ajọ omume ihe adịghị mma,+ ọ dịghịkwa mma igbochi onye ezi omume inweta ikpe ziri ezi.+
6 Egbugbere ọnụ onye nzuzu na-ese okwu,+ ọnụ ya na-akpọkwa ụtarị òkù.+
7 Ọnụ onye nzuzu bụ mbibi ya,+ egbugbere ọnụ ya bụkwaara mkpụrụ obi ya ọnyà.+
8 Okwu onye nkwutọ dị ka ihe a ga-elo ọkụ ọkụ,+ nke na-agbadaru n’ala ala afọ.+
9 Onye dịkwa umengwụ n’ọrụ ya+ bụ nwanne onye na-akpata mbibi.+
10 Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike.+ N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.+
11 Ihe dị oké ọnụ ahịa nke ọgaranya bụ obodo ya siri ike,+ ha dịkwa ka mgbidi nchebe n’echiche ya.+
12 Obi mmadụ na-adị elu tupu nkụpịa abịa,+ ịdị umeala n’obi na-abịakwa tupu otuto.+
13 Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya,+ ọ bụụrụ ya nzuzu na mmechuihu.+
14 Mmụọ mmadụ pụrụ idi ihe na-arịa ya;+ ma mmụọ dara mbà, ònye pụrụ idi ya?+
15 Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma,+ ntị ndị maara ihe na-achọkwa ihe ọmụma.+
16 Onyinye mmadụ ga-emeghere ya oghere buru ibu,+ ọ ga-edugakwa ya ọbụna n’ihu ndị ukwu.+
17 Onye bu ụzọ n’okwu ikpe ya bụ onye ezi omume;+ onye nke ọzọ na-abata ma mee ka a chọpụta ihe bụ́ eziokwu banyere onye ahụ.+
18 Ife nza na-eme ka ọbụna esemokwu kwụsị,+ ọ na-egbokwa ọgụ n’etiti dike na dike ibe ya.+
19 Nwanne e mejọrọ karịrị obodo siri ike;+ e nwekwara esemokwu ndị dị ka ihe ntụchi ụlọ elu.+
20 A ga-esi n’okwu ọnụ mmadụ mee ka afọ ju ya;+ ihe si n’egbugbere ọnụ ya pụta ga-eju ya afọ.+
21 Ọnwụ na ndụ dị ire n’aka,+ onye hụrụ ya n’anya ga-erikwa ihe si na ya pụta.+
22 Mmadụ ọ̀ chọtawo ezi nwunye?+ Onye ahụ achọtawo ihe ọma,+ ọ na-enwetakwa amara n’aka Jehova.+
23 Arịrịọ ka onye dara ogbenye na-arịọ,+ ma onye bara ọgaranya na-aza okwu ike ike.+
24 E nwere ndị enyi na-achọkarị ịkụrisị ibe ha,+ ma e nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.+