26 Aka agaghị esi ndị bi n’ime ha ike;+
Ha ga-atụ nnọọ ụjọ, ihere ga-emekwa ha.+
Ha ga-adị ka ihe a kụrụ n’ubi na ahịhịa ndụ na-akabeghị aka,+
Dịkwa ka ahịhịa nke dị n’elu ụlọ+ na nke dị na mbara ala mgbe ifufe nke si n’ebe ọwụwa anyanwụ mere ka ọ kpọnwụọ.+