49 Ma, lee! ana m ezite ihe ahụ nke Nna m kwere ná nkwa ka ọ bịakwasị unu. Ma, unu onwe unu, nọgidenụ n’obodo a ruo mgbe a ga-eyiwe unu ike si n’elu dị ka uwe.”+
26 Mgbe ihe inyeaka ahụ rutere, nke m ga-esi n’ebe Nna m nọ zitere unu,+ bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ, nke na-esi n’ebe Nna m nọ abịa, ọ ga-agba àmà banyere m;+
13 Otú ọ dị, mgbe ihe inyeaka ahụ bịarutere, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ,+ ọ ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile, n’ihi na ọ gaghị ekwu ihe si n’echiche ya, kama ihe ndị ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu, ọ ga-akọkwara unu ihe ndị na-abịanụ.+
27 Ma mmanụ ahụ o tere+ unu onwe unu dị n’ime unu, ọ dịghịkwa unu mkpa ka onye ọ bụla na-akụziri unu ihe;+ ma mmanụ ahụ o tere unu bụ eziokwu,+ ọ bụghị okwu ụgha, ọ na-akụzikwara unu ihe niile.+ Dị ka ọ kụziiri unu, unu na ya dịrị n’otu.+