Jọn
16 “Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee ghara ịsụ ngọngọ.+ 2 Ndị mmadụ ga-achụpụ unu n’ụlọ nzukọ.+ N’eziokwu, oge awa na-abịa mgbe onye ọ bụla nke ga-egbu unu ga-eche na ya jeere Chineke ozi dị nsọ.+ 3 Ma ha ga-eme ihe ndị a n’ihi na ha amarabeghị Nna m ma ọ bụkwanụ mụ onwe m.+ 4 Otú o sina dị, agwawo m unu ihe ndị a, ka ọ ga-abụ, mgbe oge awa ha ruru, unu ga-echeta na m gwara unu ha.+
“Otú ọ dị, agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ, n’ihi na mụ na unu nọ. 5 Ma ugbu a, m na-alakwuru onye zitere m,+ ma ọ dịghị otu onye n’ime unu na-ajụ m, sị, ‘Olee ebe ị na-aga?’ 6 Ma n’ihi na agwawo m unu ihe ndị a, obi unu ejupụtawo n’iru uju.+ 7 Otú o sina dị, ana m agwa unu eziokwu, Ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji na-ala. N’ihi na ọ bụrụ na mụ alaghị, ihe inyeaka+ ahụ agaghị abịakwute unu ma ọlị; ma ọ bụrụ na mụ alaa, m ga-ezitere unu ya. 8 Mgbe ọ bịarutere, ọ ga-enyekwa ụwa ihe àmà doro anya banyere mmehie na ezi omume na banyere ikpe:+ 9 nke mbụ, banyere mmehie,+ n’ihi na ha enweghị okwukwe n’ebe m nọ;+ 10 banyekwara ezi omume,+ n’ihi na m na-alakwuru Nna m, unu agaghịkwa ahụ m ọzọ; 11 banyekwara ikpe,+ n’ihi na e kpewo onye na-achị ụwa a ikpe.+
12 “M ka nwere ọtụtụ ihe m ga-agwa unu, ma unu apụghị ịghọta ha ugbu a.+ 13 Otú ọ dị, mgbe ihe inyeaka ahụ bịarutere, bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ,+ ọ ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile, n’ihi na ọ gaghị ekwu ihe si n’echiche ya, kama ihe ndị ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu, ọ ga-akọkwara unu ihe ndị na-abịanụ.+ 14 Ọ ga-enye m otuto,+ n’ihi na ọ ga-anata ihe site n’ihe bụ́ nke m, ọ ga-akọkwara ya unu.+ 15 Ihe niile Nna m nwere bụ nke m.+ Ọ bụ ya mere m ji kwuo na ọ na-esi n’ihe bụ́ nke m anata ihe, na-akọkwara ya unu. 16 N’oge na-adịghị anya, unu agakwaghị ahụ m,+ n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m.”
17 Ya mere, ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya gwarịtara ibe ha, sị: “Gịnị ka ihe a ọ na-agwa anyị pụtara, ‘N’oge na-adịghị anya, unu agaghị ahụ m, n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m,’ nakwa, ‘n’ihi na m na-alakwuru Nna m’?” 18 N’ihi ya, ha nọ na-asị: “Gịnị ka ihe a ọ na-ekwu pụtara, ‘n’oge na-adịghị anya’? Anyị amaghị ihe ọ na-ekwu banyere ya.” 19 Jizọs maara+ na ha chọrọ ịjụ ya ajụjụ. Ya mere, ọ sịrị ha: “Ùnu na-ajụrịta onwe unu banyere ihe a, maka na m sịrị, N’oge na-adịghị anya, unu agaghị ahụ m, n’oge na-adịghịkwa anya, unu ga-ahụ m? 20 N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, unu ga-akwa ákwá ma tie mkpu arịrị, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ; unu ga-eru uju,+ ma a ga-eme ka iru uju unu ghọọ ọṅụ.+ 21 Mgbe nwaanyị na-amụ nwa, ọ na-ahụju anya, n’ihi na oge awa ya eruwo;+ ma mgbe ọ mụpụtara nwa ahụ, ọ dịghị echeta ahụhụ ahụ ọzọ n’ihi ọṅụ o nwere na ọ mụwo mmadụ n’ụwa. 22 Ya mere, unu onwe unu, n’ezie, na-eru uju ugbu a; ma m ga-ahụ unu ọzọ, obi unu ga-aṅụrịkwa ọṅụ,+ ọ dịghịkwa onye ga-anapụ unu ọṅụ unu. 23 N’ụbọchị ahụkwa,+ unu agaghị ajụ m ajụjụ ọ bụla ma ọlị. N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Ọ bụrụ na unu arịọ Nna m ihe ọ bụla,+ ọ ga-enye ya unu n’aha m.+ 24 Ruo ugbu a, unu arịọbeghị otu mkpụrụ ihe n’aha m. Rịọnụ, unu ga-anatakwa, ka e wee mee ka ọṅụ unu zuo ezu.+
25 “Ejiriwo m ihe atụ gwa unu ihe ndị a.+ Oge awa na-abịa mgbe m na-agakwaghị eji ihe atụ agwa unu okwu, kama m ga-akọrọ unu ihe banyere Nna m n’ụzọ doro anya. 26 N’ụbọchị ahụ, unu ga-arịọ ihe n’aha m, adịghịkwa m agwa unu na m ga-arịọ Nna m arịrịọ n’ihi unu. 27 N’ihi na Nna m n’onwe ya hụrụ unu n’anya nke ukwuu, n’ihi na unu hụrụ m n’anya nke ukwuu,+ unu ekwerewokwa na m bịara dị ka onye nnọchiteanya nke Nna m.+ 28 Esi m n’ebe Nna m nọ bịa, abịawokwa m n’ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa, ana m alakwuru Nna m.”+
29 Ndị na-eso ụzọ ya wee sị: “Lee! Ị na-ekwu okwu ugbu a n’ụzọ doro anya, i jighịkwa ihe atụ na-ekwu okwu. 30 Anyị maara ugbu a na ị maara ihe niile,+ ọ dịghịkwa mkpa ka onye ọ bụla jụọ gị ajụjụ.+ Anyị ji nke a kwere na i si n’ebe Chineke nọ bịa.”+ 31 Jizọs zara ha, sị: “Ùnu ekwerewo ugbu a? 32 Lee! Oge awa na-abịa, n’ezie, ọ bịawo, mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya,+ unu ga-ahapụkwa naanị m; ma anọghị m naanị m, n’ihi na Nna m nọnyeere m.+ 33 Agwawo m unu ihe ndị a ka unu wee site na mụ nwee udo.+ N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.”+