24 Ha gbaziri obodo ahụ na ihe niile dị na ya ọkụ. Ma, ha dowere ọlaọcha, ọlaedo, na ihe ndị e ji ọla kọpa na ígwè mee n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ Jehova.+
51 Eze Solomọn wee rụchaa ihe niile gbasara ụlọ Jehova. O bubataziri ihe ndị Devid nna ya doro nsọ.+ O busakwara ọlaọcha, ọlaedo, na arịa ndị ọzọ niile n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ Jehova.+
11 Eze Devid nyefere Jehova ihe ndị a,+ ma ọlaọcha ma ọlaedo ndị ọ natara mba niile o meriri, ya bụ, ndị Ịdọm, ndị Moab, ndị Amọn,+ ndị Filistia,+ na ndị Amalek.+