Abụ Ọma
Abụ iru uju Devid, nke ọ bụkuru Jehova n’ihi ihe Kush onye ebo Benjamin kwuru.
7 Jehova Chineke m,+ n’ime gị ka m gbabaworo.+
Zọpụta m n’aka ndị niile na-akpagbu m, napụtakwa m,+
2 Ka onye ọ bụla ghara ịdọri mkpụrụ obi m dị ka ọdụm si adọri anụ,+
Wee dọkpụrụ m pụọ mgbe ọ na-adịghị onye ga-anapụta m.+
3 Jehova Chineke m, ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere,+
Ọ bụrụ na ọ dị ihe na-ezighị ezi m mere,+
4 Ọ bụrụ na mụ ejiriwo ihe ọjọọ kwụọ onye na-akwụ m ụgwọ ụgwọ,+
Ma ọ bụ, ọ bụrụ na mụ ebukọrọwo ihe onye ọ bụla nke na-ebuso m iro, bụ́ onye na-adịghị emeta m ihe ọ bụla,+
5 Ka onye iro chụwa mkpụrụ obi m,+
Ka ọ chụkwutekwa m ma zọda ndụ m n’ala
Wee mee ka otuto m biri n’ime ájá. Sila.
7 Ka mba dị iche iche zukọta gbaa gị gburugburu,
Laghachi n’ebe dị elu ma megide ha.
8 Jehova ga-ekpe ndị dị iche iche ikpe.+
Jehova, kpee m ikpe dị ka ezi omume m si dị+
Nakwa dị ka iguzosi ike n’ezi ihe+ m si dị.
10 Ọta m dị n’aka Chineke,+ bụ́ Onye na-azọpụta ndị obi ha ziri ezi.+