Ilu
12 Onye hụrụ ịdọ aka ná ntị n’anya hụrụ ihe ọmụma n’anya,+ ma onye kpọrọ ịdọ aka ná ntị asị adịghị eche echiche.+
2 Onye bụ́ ezi mmadụ na-enweta ihu ọma Jehova,+ ma onye na-eche echiche ọjọọ ka ọ na-akpọ onye ajọ omume.+
3 Ọ dịghị onye ime ajọ omume ga-eme ka o guzosie ike;+ ma a gaghị eme ka mgbọrọgwụ ndị ezi omume maa jijiji.+
4 Ezigbo nwunye bụ okpueze onye nwe ya,+ ma nwaanyị nke na-emechu mmadụ ihu dị ka ure n’ọkpụkpụ di ya.+
5 Echiche ndị ezi omume bụ ikpe ziri ezi;+ nduzi ndị ajọ omume na-enye bụ aghụghọ.+
6 Okwu ndị ajọ omume bụ ichechi mmadụ iji wụfuo ọbara,+ ma, ọ bụ ọnụ ndị obi ha ziri ezi ga-anapụta ha.+
7 A na-akwatu ndị ajọ omume, ha ewee ghara ịnọkwa,+ ma ụlọ ndị ezi omume ga-eguzo mgbe niile.+
8 A ga-eto mmadụ n’ihi na ọnụ ya na-ekwu ihe ezi uche dị na ya,+ ma onye obi ya gbagọrọ agbagọ ka a ga-elelị.+
9 Onye a na-ejighị kpọrọ oké ihe ma ya enwee onye na-ejere ya ozi dị mma karịa onye na-enye onwe ya otuto ma ya anọrọ n’ụkọ ihe oriri.+
10 Onye ezi omume na-elekọta mkpụrụ obi anụ ụlọ ya,+ ma ebere ndị ajọ omume bụ obi ọjọọ.+
11 Onye na-akọ ubi ya ga-eriju ihe oriri afọ,+ ma onye na-achụso ihe ndị na-abaghị uru enweghị uche.+
12 Anụ a matara n’ọnyà ndị ọjọọ agụwo onye ajọ omume agụụ;+ ma mgbọrọgwụ ndị ezi omume na-emepụta ihe.+
13 Njehie egbugbere ọnụ na-eme ka onye ọjọọ ma n’ọnyà,+ ma onye ezi omume na-esi n’ahụhụ apụta.+
14 A na-esi n’okwu ọnụ mmadụ eme ka ihe ọma ju ya afọ,+ ihe mmadụ jikwa aka ya na-eme ga-alaghachikwute ya.+
15 Ụzọ onye nzuzu ziri ezi n’anya ya,+ ma onye na-aṅa ntị na ndụmọdụ maara ihe.+
16 Ọ bụ onye nzuzu na-egosipụta iwe ya n’otu ụbọchị ahụ,+ ma onye maara ihe na-ekpuchi ihe ihere.+
17 Onye na-ekupụ ikwesị ntụkwasị obi dị ka ume ga-ekwu ihe ziri ezi,+ ma onye akaebe ụgha ga-ekwu okwu aghụghọ.+
18 E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ,+ ma ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.+
19 Ọ bụ egbugbere ọnụ eziokwu+ ka a ga-eme ka o guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi,+ ma ire okwu ụgha ga-adịru naanị nwa mgbe nta.+
20 Aghụghọ dị n’obi ndị na-akpa nkata ihe ọjọọ,+ ma ndị na-adụ ọdụ udo na-aṅụrị ọṅụ.+
21 Ọ dịghị ihe ọjọọ ga-adakwasị onye ezi omume,+ ma, ọ bụ ndị ajọ omume ka ọdachi ga-ezu ahụ́.+
22 Egbugbere ọnụ ụgha bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ma ndị na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi na-eme ka o nwee obi ụtọ.+
23 Onye maara ihe na-ezobe ihe ọmụma,+ ma, ọ bụ obi onye nzuzu na-eti nzuzu ná mkpu.+
24 Ọ bụ aka ndị dị uchu ga-achị achị,+ ma aka dị umengwụ ka a ga-amanye ịrụ ọrụ.+
25 Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya,+ ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.+
26 Onye ezi omume na-eleru ebe anụ ya na-ata nri anya, ma ụzọ ndị ajọ omume na-eme ka ha na-awagharị awagharị.+
27 Umengwụ agaghị achụpụtara mmadụ anụ ọ na-achụ nta ya,+ ma onye dị uchu bụ akụ̀ mmadụ nke dị oké ọnụ ahịa.
28 Ndụ dị n’ụzọ ezi omume,+ ije ije n’ụzọ ya adịghị eduga n’ọnwụ.+