Ilu
5 Nwa m, ṅaa ntị n’amamihe m.+ Tọọkwara nghọta m ntị n’ala,+ 2 ka i wee chebe ikike iche echiche;+ ka egbugbere ọnụ gị chekwaa ihe ọmụma.+
3 N’ihi na egbugbere ọnụ nke nwaanyị na-akwa iko* na-atasị atasị dị ka ụgbụgbọ mmanụ aṅụ,+ okpo ọnụ ya na-akwọkwa mụrụmụrụ karịa mmanụ.+ 4 Ma ihe na-esi n’ebe ọ nọ apụta na-elu ilu dị ka ahịhịa ilu;+ ọ dị nkọ dị ka mma agha ihu abụọ.+ 5 Ụkwụ ya na-agbadaru n’ọnwụ.+ Nzọụkwụ ya na-eduga na Shiol.+ 6 Ọ dịghị echebara ụzọ ndụ echiche.+ Ụzọ ya agbagọwo agbagọ, ma ọ maghị ebe ọ na-eduje.+ 7 Ya mere, ụmụ m, geenụ m ntị,+ unu ahapụkwala ihe ọnụ m na-ekwu.+ 8 Mee ka ụzọ gị dị anya n’ebe ọ nọ, agarukwala ọnụ ụzọ ụlọ ya nso,+ 9 ka i wee ghara inye ndị ọzọ ùgwù gị,+ gharakwa iwere afọ ndụ gị nye ihe ọjọọ;+ 10 ka ndị bịara abịa wee ghara iji ike gị mee ka afọ ju ha,+ ka ihe ị dọgburu onwe gị n’ọrụ nweta gharakwa ịdị n’ụlọ onye mba ọzọ,+ 11 ka i wee gharakwa ịsụ ude n’ọdịnihu gị+ mgbe anụ ahụ́ gị na ahụ́ gị ga-ala n’iyi.+ 12 I wee sị: “Lee otú m si kpọ ịdọ aka ná ntị asị,+ otú obi m sikwa leda ọbụna ịba mba anya!+ 13 Egeghị m ntị n’olu ndị na-ezi m ihe,+ atọrọghị m ndị na-akụziri m ihe ntị n’ala.+ 14 Ọ raghị ahụ́ m wee nọrọ n’ụdị ihe ọjọọ ọ bụla+ n’ime ọgbakọ nakwa n’ime nzukọ.”+
15 Ṅụọ mmiri si n’olulu mmiri nke gị, ṅụọkwa mmiri ji nwayọọ nwayọọ na-asọpụta n’isi mmiri nke gị.+ 16 Isi iyi gị ò kwesịrị ịwasasị n’èzí,+ iyi gị ò kwesịrị ịwasasị n’ámá? 17 Ka ha bụrụ nke naanị gị, ọ bụghị nke gị na ndị bịara abịa.+ 18 Ka isi mmiri gị bụrụ ihe a gọziri agọzi,+ ṅụrịakwa ọṅụ n’ihi nwunye ị lụrụ n’okorobịa,+ 19 bụ́ nne ele na-adọrọ mmasị nakwa ewu ọhịa mara mma.+ Ka ara ya na-egbu gị dị ka mmanya n’oge niile.+ Ka ịhụnanya ya na-enye gị oké obi ụtọ mgbe niile.+ 20 Ya mere, nwa m, gịnị mere nwaanyị na-akwa iko ga-eji na-eme gị obi ụtọ, gịnịkwa mere ị ga-eji na-amakụ nwaanyị na-eme omume rụrụ arụ*?+ 21 N’ihi na ụzọ mmadụ dị n’ihu Jehova,+ ọ na-echebara ụzọ ya niile echiche.+ 22 Njehie onye ajọ omume ga-anwụde ya,+ ọ bụkwa ụdọ mmehie nke ya ka a ga-eji jide ya.+ 23 Ọ bụ ya ga-anwụ n’ihi na ịdọ aka ná ntị adịghị,+ ọ na-akpafukwa n’ihi ịdị ukwuu nke nzuzu ya.+