Ọpụpụ 23:8 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 8 “Erila ngarị, n’ihi na ngarị na-ekpuchi ndị na-ahụ ụzọ nke ọma anya, ọ pụkwara ịgbagọ okwu ndị ezi omume.+ Diuterọnọmi 16:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Agbagọla ikpe.+ Elela mmadụ anya n’ihu,+ erikwala ngarị, n’ihi na ngarị na-ekpuchi anya ndị maara ihe,+ na-agbagọkwa okwu ndị ezi omume. Ilu 29:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Eze na-eme ka obodo guzosie ike site n’ikpe ziri ezi,+ ma onye na-eri ngarị na-akwada ya akwada.+ Aịzaya 1:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+
8 “Erila ngarị, n’ihi na ngarị na-ekpuchi ndị na-ahụ ụzọ nke ọma anya, ọ pụkwara ịgbagọ okwu ndị ezi omume.+
19 Agbagọla ikpe.+ Elela mmadụ anya n’ihu,+ erikwala ngarị, n’ihi na ngarị na-ekpuchi anya ndị maara ihe,+ na-agbagọkwa okwu ndị ezi omume.
23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+