Ilu
29 Onye a na-adọ aka ná ntị ugboro ugboro+ ma ya ana-ekwesi olu ike,+ a ga-agbaji ya na mberede, ngwọta agaghịkwa adị.+
2 Mgbe ndị ezi omume dị ọtụtụ, ndị mmadụ na-aṅụrị ọṅụ;+ ma mgbe onye ajọ omume ọ bụla na-achị, ndị mmadụ na-asụ ude.+
3 Onye hụrụ amamihe n’anya na-eme ka nna ya ṅụrịa,+ ma onye ya na ndị akwụna na-akpakọrịta na-ebibi ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.+
4 Eze na-eme ka obodo guzosie ike site n’ikpe ziri ezi,+ ma onye na-eri ngarị na-akwada ya akwada.+
5 Dimkpa nke na-eto mmadụ ibe ya otuto efu+ bụ ụgbụ ka ọ na-agbasara ụkwụ ya.+
6 Ọnyà dị ná njehie nke onye ọjọọ,+ ma onye ezi omume na-eti mkpu ọṅụ, na-enwekwa obi ụtọ.+
7 Onye ezi omume maara ihe ruuru ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha.+ Onye ajọ omume adịghị achọ ịma.+
8 Ndị na-etu ọnụ na-amụnye obodo ọkụ,+ ma ndị maara ihe na-eme ka iwe dajụọ.+
9 Onye maara ihe na onye nzuzu abawo n’ikpe—onye nzuzu ewewo oké iwe, chịakwa ọchị, izu ike adịghịrị onye maara ihe.+
10 Ndị ịwụfu ọbara na-agụ agụụ kpọrọ onye ọ bụla nke na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta asị;+ ma ndị ziri ezi na-achọ ọdịmma nke mkpụrụ obi ibe ha.+
11 Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.+
12 N’ebe onye na-achị achị na-aṅa ntị n’okwu ụgha, ndị niile na-ejere ya ozi ga-abụ ndị ajọ omume.+
13 Onye dara ogbenye na onye mmegbu ezutewo;+ ma Jehova na-eme ka anya ha abụọ nwee ìhè.+
14 N’ebe onye eze na-ekpe ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha ikpe n’eziokwu,+ a ga-eme ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe niile.+
15 Ọ bụ ụtarị na ịdọ aka ná ntị na-enye amamihe;+ ma nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.+
16 Mgbe ndị ajọ omume dị ọtụtụ, mmebi iwu na-adị ukwuu; ma ndị ezi omume ga na-ele ọdịda ha anya.+
17 Nye nwa gị ntaramahụhụ, ọ ga-eme ka i zuru ike, meekwa ka mkpụrụ obi gị ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu.+
18 N’ebe ọhụụ na-adịghị, ndị mmadụ adịghị enwe nchịkwa,+ ma obi ụtọ na-adịrị ndị na-edebe iwu.+
19 Onye na-eje ozi agaghị anabata okwu ọnụ a gwara ya iji gbazie ya,+ n’ihi na ọ na-aghọta ihe ma ọ dịghị aṅa ntị.+
20 Ị̀ hụla onye ọ na-adị ngwa ikwu okwu?+ Olileanya dịịrị onye nzuzu karịa ka ọ dịịrị ya.+
21 Ọ bụrụ na mmadụ na-azụtọ onye na-ejere ya ozi malite n’oge ọ bụ nwata, mgbe o mere okenye, ọ ga-aghọ onye na-enweghị ekele.
22 Onye na-ewekarị iwe na-akpalite esemokwu,+ onye ọ bụla nke na-ewekarị oké iwe na-eme ọtụtụ mmehie.+
23 Ọ bụ mpako mmadụ ga-eweda ya ala,+ ma onye dị umeala na mmụọ ya ga-enweta otuto.+
24 Onye ya na onye ohi na-akpakọrịta kpọrọ mkpụrụ obi onwe ya asị.+ Ọ pụrụ ịnụ iyi a ṅụrụ nke pụrụ iweta ọbụbụ ọnụ, ma ọ dịghị akọ ihe ọ bụla.+
25 Ịtụ mmadụ egwu na-eweta ọnyà,+ ma a ga-echebe onye tụkwasịrị Jehova obi.+
26 Ndị na-achọ ihu ọma onye na-achị achị dị ọtụtụ,+ ma mmadụ inweta ikpe ziri ezi na-esi n’aka Jehova.+
27 Onye na-adịghị ekpe ikpe ziri ezi bụ ihe arụ n’anya ndị ezi omume,+ onye ụzọ ya ziri ezi bụkwa ihe arụ n’anya onye ajọ omume.+