Ilu
14 Nwaanyị nke maara ihe n’ezie ewulitewo ụlọ ya,+ ma nwaanyị nzuzu na-eji aka ya akwatu ya.+
2 Onye na-eje ije n’ịkwụwa aka ọtọ ya na-atụ egwu Jehova,+ ma onye gbagọrọ agbagọ n’ụzọ ya na-eleda Ya anya.+
3 Ụtarị mpako dị n’ọnụ onye nzuzu,+ ma egbugbere ọnụ ndị maara ihe ga-echebe ha.+
4 N’ebe a na-enweghị ehi, ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri na-adị ọcha, ma ihe ubi na-adị ukwuu n’ihi ike oké ehi.
5 Onye akaebe nke kwesịrị ntụkwasị obi bụ onye na-agaghị agha ụgha,+ ma onye akaebe ụgha na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume.+
6 Onye na-akwa emo achọwo amamihe, ma ọ dịghị nke dịnụ; ma ihe ọmụma na-adịrị onye nwere nghọta mfe.+
7 Si n’ihu onye nzuzu pụọ,+ n’ihi na ị gaghị ahụ egbugbere ọnụ ihe ọmụma.+
8 Amamihe nke onye maara ihe bụ ịghọta ụzọ ya,+ ma nzuzu nke ndị nzuzu bụ aghụghọ.+
9 Ndị na-akwa ikpe ọmụma emo bụ ndị nzuzu,+ ma a na-enwe nkwekọrịta n’etiti ndị ziri ezi.+
10 Obi na-amata na mkpụrụ obi mmadụ nọ ná mwute,+ onye ọzọ agaghịkwa ekere òkè n’ịṅụrị ọṅụ ya.
11 A ga-ala ụlọ ndị ajọ omume n’iyi,+ ma ụlọikwuu nke ndị ziri ezi ga-enwe ihe ịga nke ọma.+
12 E nwere ụzọ nke ziri ezi n’anya mmadụ,+ ma ụzọ ọnwụ ka nsọtụ ya ga-emecha bụrụ.+
13 Obi nwere ike ịnọ n’ihe mgbu ọbụna mgbe a na-achị ọchị;+ iru uju bụkwa njedebe nke ịṅụrị ọṅụ.+
14 Ihe si n’ụzọ onye obi ya na-enweghị okwukwe pụta ga-eju ya afọ,+ ma, ọ bụ ihe si n’omume ezi mmadụ pụta ga-eju ya afọ.+
15 Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile,+ ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.+
16 Onye maara ihe na-atụ egwu, ọ naghịkwa etinye aka n’ihe ọjọọ,+ ma onye nzuzu na-ewe oké iwe, na-atụkwasịkwa onwe ya obi.+
17 Onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ ga-eme omume nzuzu,+ ma onye nwere ikike iche echiche ka a na-akpọ asị.+
18 Ndị na-amaghị ihe ga-aghọ ndị nzuzu,+ ma ndị maara ihe ga-eke ihe ọmụma dị ka ákwà isi.+
19 Ndị ọjọọ ga-egbu ikpere n’ala n’ihu ndị ezi mmadụ,+ ndị ajọ omume ga-emekwa otú ahụ n’ọnụ ụzọ ámá onye ezi omume.
20 Onye dara ogbenye ka mmadụ ibe ya na-akpọ asị,+ ma ndị enyi ọgaranya na-adị ọtụtụ.+
21 Onye na-eleda mmadụ ibe ya anya na-eme mmehie,+ ma obi ụtọ na-adịrị onye na-emere ndị nọ n’ahụhụ amara.+
22 Ọ̀ bụ na ndị na-echepụta ihe ọjọọ agaghị anọ na-awagharị awagharị?+ Ma obiọma* na eziokwu dịịrị ndị na-echepụta ihe ọma.+
23 Uru dị n’ụdị ndọgbu n’ọrụ niile,+ ma okwu egbugbere ọnụ efu na-eme ka a nọrọ n’ụkọ.
24 Okpueze ndị maara ihe bụ akụnụba ha; nzuzu nke ndị iberiibe bụ nzuzu.+
25 Onye akaebe nke na-ekwu eziokwu na-azọpụta mkpụrụ obi,+ ma onye akaebe aghụghọ na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume.+
26 Onye na-atụ egwu Jehova na-enwe ezi obi ike na ya,+ ụmụ ya ga-enwekwa ebe mgbaba.+
27 Ịtụ egwu Jehova bụ olulu mmiri nke ndụ,+ iji zere ọnyà ọnwụ.+
28 Ụba mmadụ bụ ùgwù eze,+ ma ụkọ mmadụ na-ala onyeisi n’iyi.+
29 Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ jupụtara ná nghọta,+ ma onye na-adịghị enwe ndidi na-ebuli nzuzu elu.+
30 Obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́,+ ma ekworo bụ ure ọkpụkpụ.+
31 Onye na-erigbu onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya akọchawo Onye kere ya,+ ma onye na-emere ogbenye amara na-enye Ya otuto.+
32 A ga-akwada onye ajọ omume n’ihi ihe ọjọọ ya,+ ma onye ezi omume ga na-enweta ebe mgbaba n’iguzosi ike n’ezi ihe ya.+
33 Amamihe dị n’obi onye nwere nghọta,+ ọ na-apụtakwa ìhè n’etiti ndị nzuzu.
34 Ọ bụ ezi omume na-ebuli mba elu,+ ma mmehie bụụrụ mba dị iche iche ihe ihere.+
35 Eze na-enwe obi ụtọ n’ebe onye na-ejere ya ozi nke ji nghọta eme ihe nọ,+ ma ọ na-eweso onye na-emechu mmadụ ihu oké iwe.+