Ilu
17 Ibé achịcha kpọrọ nkụ nke a na-eri n’ebe e nwere ịdị jụụ+ dị mma karịa ụlọ nke jupụtara n’àjà a na-eri na-ese okwu.+
2 Ohu nke nwere nghọta ga-achị nwa nke na-emechu mmadụ ihu,+ ọ ga-eso ụmụnne nwa ahụ keta òkè n’ihe nketa.+
3 Ite e ji anụcha ihe bụ maka ọlaọcha, ekwú ọkụ bụkwa maka ọlaedo,+ ma, ọ bụ Jehova na-enyocha obi.+
4 Onye na-eme ihe ọjọọ na-aṅa egbugbere ọnụ nke na-ekwu ihe ọjọọ ntị.+ Onye ụgha na-ege ire nke na-akpata ahụhụ ntị.+
5 Onye na-akwa onye dara ogbenye emo akọchawo Onye kere ya.+ Onye na-aṅụrị ọṅụ n’ọdachi onye ọzọ agaghị agbanahụ ntaramahụhụ.+
6 Okpueze ndị agadi bụ ụmụ ụmụ ha,+ ma ịma mma nke ụmụ bụ nna ha.+
7 Egbugbere ọnụ nke ziri ezi ekwesịghị onye ọ bụla nke na-amaghị ihe,+ ma ya fọdụzie egbugbere ọnụ okwu ụgha ikwesị onye a ma ama!+
8 Onyinye bụ nkume e ji enweta ihu ọma n’anya onye nwe ya.+ Ebe ọ bụla ọ tụgharịrị, ọ na-enwe ihe ịga nke ọma.+
9 Onye na-ekpuchi mmejọ na-achọ ịhụnanya,+ onye na-ekwukwa banyere otu ihe mgbe niile na-ekewa ndị ha na ibe ha dị ná mma.+
10 Ịba mba na-abami onye nwere nghọta n’ahụ́+ karịa iti onye nzuzu ihe ugboro otu narị.+
11 Naanị nnupụisi ka onye ọjọọ na-achọ mgbe niile,+ onye obi tara mmiri ka onye ozi a na-ezigara ya bụkwa.+
12 Ọ ka mma ka mmadụ zute anụ ọhịa bea a napụrụ ụmụ ya+ kama izute onye ọ bụla nke bụ́ onye iberiibe ná nzuzu ya.+
13 Onye ọ bụla nke na-eji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọma,+ ihe ọjọọ agaghị apụ n’ụlọ ya.+
14 Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ;+ ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.+
15 Onye ọ bụla nke na-ekwu na onye ajọ omume bụ onye ezi omume+ nakwa onye ọ bụla nke na-ekwu na onye ezi omume bụ onye ajọ omume+—ọbụna ha abụọ bụ ihe arụ n’anya Jehova.+
16 Gịnị mere ụzọ e si enweta amamihe ji dịrị n’aka onye nzuzu,+ ebe ọ bụ onye na-enweghị uche?+
17 Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile,+ ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.+
18 Onye na-enweghị uche na-ekwe n’aka iji nwee nkwekọrịta,+ na-ana mmadụ ibe ya n’ibé.+
19 Onye ọ bụla nke hụrụ njehie n’anya hụrụ esemokwu n’anya.+ Onye ọ bụla nke na-eme ka ọnụ ụzọ mbata ya dị elu na-achọ nkụpịa.+
20 Onye gbagọrọ agbagọ n’obi agaghị enweta ihe ọma,+ onye ire abụọ ga-adabakwa n’oké nsogbu.+
21 Onye ọ bụla nke bụ́ nna nwa nzuzu—ọ bụụrụ ya ihe iru uju;+ nna nke nwa na-amaghị ihe adịghịkwa aṅụrị ọṅụ.+
22 Obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa,+ ma mmụọ nke dara mbà na-amịkpọ ọkpụkpụ.+
23 Onye ajọ omume ga-anara ọbụna ngarị e wepụtara n’obi uwe+ iji gbagọọ ụzọ ikpe ziri ezi.+
24 Amamihe dị n’ihu onye nwere nghọta,+ ma anya onye nzuzu na-awagharị n’ebe niile ụwa sọtụrụ.+
25 Nwa nzuzu bụụrụ nna ya+ ihe mkpasu iwe, bụkwaara nne mụrụ ya ihe obi ilu.+
26 Iri onye ezi omume iwu adịghịkwa mma.+ Iti ndị a ma ama ihe ezighị ezi.+
27 Onye ọ bụla nke na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu maara ihe,+ mmụọ nke onye nwere nghọta na-adị jụụ.+
28 Mgbe onye ọ bụla nke dị nzuzu gbachiri nkịtị, a ga-ewere ya dị ka onye maara ihe;+ a ga-ewerekwa onye mechiri ọnụ ya dị ka onye nwere nghọta.