Ilu
24 Enwerela ndị ọjọọ anyaụfụ,+ ka agụụ gị na ha ịkpakọrịta ghara ịgụ gị.+ 2 N’ihi na ọ bụ ibukọrọ ihe mmadụ ka obi ha na-eche, ọ bụkwa nsogbu ka egbugbere ọnụ ha na-ekwu.+
3 A ga-eji amamihe wulite ezinụlọ,+ a ga-ejikwa nghọta mee ka o guzosie ike.+ 4 A ga-ejikwa ihe ọmụma mee ka ihe dị oké ọnụ ahịa na ihe ọma niile bara uru jupụta n’ime ime ụlọ.+
5 Onye ji ike ya eme ihe n’ụzọ amamihe bụ dimkpa,+ onye nwere ihe ọmụma na-enwekwu ike.+ 6 N’ihi na ị ga-eji ezi ntụziaka buo agha gị,+ ọtụtụ ndị ndụmọdụ na-emekwa ka e nwee nzọpụta.+
7 Ezi amamihe na-adịrị onye nzuzu oké elu;+ ọ gaghị emeghe ọnụ ya n’ọnụ ụzọ ámá.
8 Onye ọ bụla nke na-akpa nkata ime ihe ọjọọ, naanị ihe a ga-akpọ ya bụ onye ọkà n’echiche ọjọọ.+
9 Omume rụrụ arụ nke nzuzu kpatara bụ mmehie,+ onye na-akwa emo bụkwa ihe arụ n’anya ụmụ mmadụ.+
10 Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ?+ Ike gị ga-adị ntakịrị.
11 Napụta ndị a na-akpọgara ọnwụ; gbochiekwa ndị na-adagharị na-aga n’ebe a ga-egbu ha.+ 12 Ọ bụrụ na ị sị: “Lee! Anyị amaghị banyere ihe a,”+ ọ̀ bụ na onye na-enyocha obi agaghị achọpụta,+ onye na-elegide mkpụrụ obi gị anya ọ́ gaghị amata+ wee kwụọ mmadụ ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị?+
13 Nwa m, rachaa mmanụ aṅụ, n’ihi na ọ dị mma; ka mmanụ aṅụ dị ụtọ nke si n’ụgbụgbọ ya dịrị n’okpo ọnụ gị.+ 14 N’otu aka ahụ, mara ihe bụ́ amamihe n’ihi mkpụrụ obi gị.+ Ọ bụrụ na ị chọtawo ya, mgbe ahụ, ọdịnihu dị, a gaghịkwa ebipụ olileanya gị.+
15 Echebirila inweta ebe obibi onye ezi omume, dị ka onye ajọ omume na-eme;+ ebukọrọkwala ihe dị n’ebe izu ike ya.+ 16 N’ihi na onye ezi omume nwere ike ịda ọbụna ugboro asaa, ma ọ ga-ebilicha;+ ma ọdachi ga-eme ka ndị ajọ omume sụọ ngọngọ.+
17 Mgbe onye iro gị dara, aṅụrịla ọṅụ; mgbe e mere ka ọ sụọ ngọngọ, ka obi gị ghara inwe aṅụrị,+ 18 ka Jehova wee ghara ịhụ ya, o wee dị njọ n’anya ya, o wee kwụsị iweso ya iwe.+
19 Ewesola ndị na-eme ihe ọjọọ iwe. Enwerela ndị ajọ omume anyaụfụ.+ 20 N’ihi na ọdịnihu agaghị adịrị onye ọ bụla nke na-eme ihe ọjọọ;+ a ga-emenyụ oriọna nke ndị ajọ omume.+
21 Nwa m, tụọ egwu Jehova, tụọkwa egwu eze.+ Gị na ndị nnupụisi enwela mmekọrịta.+ 22 N’ihi na ọdachi ha ga-abịa na mberede,+ nke na ònye ga-ama banyere mkpochapụ nke ndị nnupụisi?+
23 Okwu ndị a kwa dịịrị ndị maara ihe:+ Ile mmadụ anya n’ihu n’ikpe adịghị mma.+
24 Onye na-agwa onye ajọ omume, sị: “Ị bụ onye ezi omume,”+ ndị mmadụ ga-abụ ya ọnụ, mba dị iche iche ga-akọcha ya. 25 Ma ọ ga-adịrị ndị na-abara ya mba mma,+ a ga-ejikwa ihe ọma gọzie ha.+ 26 Onye na-asa okwu n’ụzọ kwụ ọtọ ga-esusu mmadụ ọnụ.+
27 Kwadebe ọrụ gị n’èzí, kwadebekwara ya onwe gị n’ubi.+ E mesịa, wulitekwa ezinụlọ gị.
28 Agbagidela mmadụ ibe gị akaebe mgbe ọ na-enweghị ihe o mere.+ I mee otú ahụ, ị ga-adị nzuzu n’ihe i ji egbugbere ọnụ gị na-ekwu.+ 29 Asịla: “Dị nnọọ ka o mere m, otú ahụ ka m ga-eme ya.+ M ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ihe ọ na-eme si dị.”+
30 Agafere m n’akụkụ ubi onye umengwụ,+ gafeekwa n’akụkụ ubi vaịn onye na-enweghị uche.+ 31 Ma, lee! naanị ahịhịa puchiri ya.+ Ahịhịa akụwa kpuchiri ya, a kwatuwokwa mgbidi ya e ji nkume wuo.+
32 Mụ onwe m wee hụ; m wee malite ichebara ya echiche;+ m hụrụ ya, m wee mụta ihe a:+ 33 Ihitụ ụra, irotụ ụra, ịkụkụkọta aka nke nta wee dinara ala,+ 34 ịda ogbenye gị ga-abịakwa dị ka onye na-apụnara mmadụ ihe, ịda ụkpa gị ga-abịakwa dị ka onye bu ihe agha.+