Ilu
23 Ọ bụrụ na ị nọdụ ala ka gị na eze rie ihe, i kwesịrị ileru ihe dị n’ihu gị anya nke ọma,+ 2 tinye mma n’akpịrị gị ma ọ bụrụ na i nwere ihe na-agụ mkpụrụ obi gị agụụ.+ 3 Ka nri ụtọ ya gharakwa ịgụ gị agụụ, n’ihi na ọ bụ nri okwu ụgha.+
4 Adọgbula onwe gị n’ọrụ inweta akụnụba.+ Kwụsị ịdabere ná nghọta gị.+ 5 Ì legidewo ya anya, n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọ bụ?+ N’ihi na ọ na-emere onwe ya nku dị ka nke ugo wee fepụ chee ihu n’eluigwe.+
6 Erila nri onye ọ bụla bụ́ onye aka ntagide,+ ka nri ụtọ ya gharakwa ịgụ gị agụụ.+ 7 N’ihi na dị ka mmadụ nke mere atụmatụ n’ime obi ya si dị, otú ahụ ka ọ dị.+ “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ka ọ na-agwa gị, ma obi ya adịghị n’ebe ị nọ.+ 8 Ị ga-agbọ ntakịrị nri i riri, okwu ọma gị ga-alakwa n’iyi.+
9 Ekwula okwu ná ntị onye nzuzu,+ n’ihi na ọ ga-eleda okwu amamihe gị anya.+
10 Ewelala ókè ala a kpara kemgbe ogologo oge azụ,+ abanyekwala n’ubi ụmụ na-enweghị nna.+ 11 N’ihi na Onye Mgbapụta ha dị ike; ya onwe ya ga-ekpechite ọnụ ha n’okwu gị na ha.+
12 Mee ka obi gị nara ịdọ aka ná ntị, meekwa ka ntị gị nụrụ okwu nwere ihe ọmụma.+
13 Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.+ Ọ bụrụ na ị pịa ya ụtarị, ọ gaghị anwụ. 14 I kwesịrị ịpịa ya ụtarị, ka i wee napụta mkpụrụ obi ya na Shiol.+
15 Nwa m, ọ bụrụ na obi gị amara ihe,+ obi m ga-aṅụrị ọṅụ, ee, obi nke m.+ 16 Akụrụ m ga-enwekwa aṅụrị mgbe egbugbere ọnụ gị na-ekwu ihe ziri ezi.+
17 Ka obi gị ghara inwere ndị mmehie anyaụfụ,+ kama na-atụ egwu Jehova ogologo ụbọchị dum.+ 18 N’ihi na i mee otú ahụ, ọdịnihu ga-adị,+ a gaghịkwa ebipụ olileanya gị.+
19 Nwa m, nụrụ wee mara ihe, durukwa obi gị gaa n’ụzọ ziri ezi.+
20 Anọla n’etiti ndị na-aṅụ oké mmanya,+ n’etiti ndị na-eribiga anụ ókè.+ 21 N’ihi na onye aṅụrụma na onye na-eribiga nri ókè ga-ada ogbenye,+ ụra ga-eme ka mmadụ yiri naanị nkịrịka ákwà.+
22 Gee nna nke mụrụ gị ntị,+ eledakwala nne gị anya naanị n’ihi na o mewo agadi.+ 23 Zụta eziokwu,+ erekwala ya; zụtakwa amamihe na ịdọ aka ná ntị na nghọta.+ 24 Nna onye ezi omume aghaghị ịṅụrị ọṅụ;+ onye bụ́ nna nke onye maara ihe ga-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihi ya.+ 25 Nna gị na nne gị ga-aṅụrị ọṅụ, nwaanyị mụrụ gị ga-enwekwa obi ụtọ.+
26 Nwa m, nye m obi gị, ka ụzọ m tọọkwa anya gị ụtọ.+ 27 N’ihi na nwaanyị akwụna bụ olulu miri emi,+ nwaanyị na-akwa iko* bụkwa olulu mmiri dị warara. 28 N’ezie, ọ na-echechi mmadụ dị nnọọ ka onye na-apụnara mmadụ ihe;+ ọ na-eme ka ndị aghụghọ dị ọtụtụ n’etiti ndị mmadụ.+
29 Ònye na-ata ahụhụ? Ònye nwere ahụ́ erughị ala? Ònye na-ese okwu?+ Ònye nwere nchegbu? Ònye bu ọnyá na nkịtị? Ònye ka anya ya na-ahụ inyoghi inyoghi? 30 Ọ bụ ndị ha na mmanya na-anọ ruo ogologo oge,+ ndị na-abata ịchọpụta mmanya a gwara agwa.+ 31 Elela mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-egbuke egbuke n’ime iko, mgbe o ji nwayọọ na-agbada. 32 N’ikpeazụ, ọ na-ata nnọọ dị ka agwọ,+ ọ na-atanyekwa elò dị nnọọ ka ajụala.+ 33 Anya gị ga na-ahụ ihe na-enweghị isi, obi gị ga na-ekwukwa ihe rụrụ arụ.+ 34 Ị ga-adị nnọọ ka onye dina n’etiti oké osimiri, ọbụna dị ka onye dina n’elu osisi ákwà ụgbọ mmiri.+ 35 “Ha etiwo m ihe, ma adaghị m ọrịa; ha akụwo m ihe, ma amaghị m. Olee mgbe m ga-eteta?+ M ka ga-achọkwu ya.”+