Job
36 Elaịhu kwukwara, sị:
2 “Nwetụkwuoro m ndidi ka m kọwaara gị ihe m na-ekwu,
N’ihi na m ka nwere ihe m ga-ekwu n’aha Chineke.
4 N’eziokwu, ihe m na-ekwu abụghị ụgha.
Onye ma ihe niile+ nọ gị n’ihu n’ebe a.
5 N’eziokwu, Chineke dị ike,+ ọ naghịkwa ajụ onye ọ bụla.
Ọ na-aghọta ihe nke ọma.
6 Ọ gaghị ahapụ ndị ajọ omume ndụ.+
Ma ọ ga-ekpere ndị na-ata ahụhụ ikpe ziri ezi.+
7 Ọ naghị ewepụ anya ya n’ebe ndị ezi omume nọ.+
Ọ na-eme ka ha nọrọ n’ocheeze,*+ a na-ebulikwa ha elu ruo mgbe ebighị ebi.
8 Ma ọ bụrụ na e kee ha agbụ ígwè,
Jirikwa ụdọ e ji ata mmadụ ahụhụ jide ha,
9 Ọ ga-eme ka ha mata ihe ha mere,
Bụ́ mmehie ndị ha mere maka na ha dị mpako.
13 Ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke* na-ebu iwe n’obi.
Ọ bụrụgodị na o kee ha agbụ, ha anaghị arịọ ka e nyere ha aka.
15 Ma Chineke* na-anapụta ndị na-ata ahụhụ n’ahụhụ ha.
Ọ na-emeghe ntị ha n’oge a na-emegbu ha.
Ka ị nọrọ n’ebe sara mbara, n’ebe a na-enweghị ihe na-akpagide gị,+
N’ebe ezigbo nri nke dị na tebụl gị ga-eme ka obi gị jụrụ.+
17 Mgbe ahụ, ikpe a mara ndị ajọ omume ga-eju gị afọ,+
Mgbe e kpere ha ikpe ziri ezi, meekwa ha ihe e kpebiri.
20 Atụla anya ka abalị ruo,
Bụ́ mgbe ndị mmadụ na-apụ n’ebe ha nọ.
22 Lee, a na-eto Chineke n’ihi ike ya.
È nwere onye na-akụzi ihe otú o si akụzi?
25 Mmadụ niile ahụla ya.
Mmadụ efu nọ n’ebe dị anya na-ele ya.
26 N’eziokwu, Chineke dị ukwuu karịa otú anyị nwere ike ịmata.+
E nweghị ike ịghọta* afọ ndụ ya.+
27 Ọ na-amịkọrọ mmiri niile tasara n’ala.+
Ha na-aghọ mmiri ozuzo na alụlụụ.
28 Ha na-esizi n’ígwé ojii zoo.+
Ha na-ezo, onye ọ bụla enweta mmiri.
29 È nwere onye ga-aghọtali otú e si gbasaa urukpuru
31 Ọ na-eji ihe ndị a eme ka ndị mmadụ dịrị ndụ.*
Ọ na-enye ha ihe oriri n’ụba.+