Ilu
8 Amamihe ọ́ nọghị na-akpọ òkù,+ nghọta ọ́ nọghịkwa na-eti mkpu?+ 2 N’elu ebe dị elu,+ n’akụkụ ụzọ, n’ebe e si agafe n’okporo ụzọ, ka o guzo. 3 N’akụkụ ọnụ ụzọ ámá, n’ebe e si abanye n’obodo,+ n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá, ka ọ nọ na-eti mkpu n’oké olu,+ sị:
4 “Ndị mmadụ, ọ bụ unu ka m na-akpọ òkù, ọ bụkwa ụmụ mmadụ ka olu m na-akpọ.+ 5 Unu ndị na-amaghị ihe, maranụ ihe;+ unu ndị nzuzu, nweenụ uche.+ 6 Geenụ ntị, n’ihi na ọ bụ banyere ihe ndị kasị mkpa ka m na-ekwu,+ egbugbere ọnụ m emeghewo ka m kwuo banyere ịkwụwa aka ọtọ.+ 7 N’ihi na ọ bụ eziokwu ka okpo ọnụ m na-ekwu n’olu dị ala;+ ajọ omume bụkwaara egbugbere ọnụ m ihe arụ.+ 8 Ihe niile ọnụ m na-ekwu bụ n’ezi omume.+ Ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha gbagọrọ agbagọ ma ọ bụ hịgọọ ahịgọ.+ 9 Ha niile kwụ ọtọ n’ebe onye nwere nghọta nọ, ziekwa ezi n’ebe ndị na-achọta ihe ọmụma nọ.+ 10 Naranụ ịdọ aka ná ntị m kama ịnara ọlaọcha, narakwanụ ihe ọmụma kama ịnara ọlaedo kasị mma.+ 11 N’ihi na amamihe dị mma karịa nkume kọral,+ ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ na-atọ ụtọ nke pụrụ ịha ka ya.+
12 “Mụ onwe m, bụ́ amamihe, na ịdị akọ bi,+ m na-enwetakwa ihe ọmụma na ikike iche echiche.+ 13 Ịtụ egwu Jehova pụtara ịkpọ ihe ọjọọ asị.+ Ibuli onwe onye elu na nganga+ na ụzọ ọjọọ na ọnụ na-ekwu ihe rụrụ arụ+ ka m kpọrọ asị. 14 Enwere m ndụmọdụ+ na ezi amamihe.+ Enwere m nghọta;+ enwere m ike.+ 15 Ọ bụ m ka ndị eze ji na-achị, ọ bụkwa m ka ndị isi ji na-enye ezi omume dị ka iwu.+ 16 Ọ bụ m ka ndị isi ji na-achị dị ka ndị isi,+ ọ bụkwa m ka ndị niile a ma ama ji na-ekpe ikpe n’ezi omume.+ 17 Ndị hụrụ m n’anya ka mụ onwe m hụrụ n’anya,+ ọ bụkwa ndị na-achọ m na-achọta m.+ 18 Akụnụba na ebube dị n’aka m,+ tinyere ihe nketa dị oké ọnụ ahịa na ezi omume.+ 19 Mkpụrụ m na-amịpụta dị mma karịa ọlaedo, ọbụna karịa ọlaedo a nụchara anụcha, ihe m na-emepụta dịkwa mma karịa ọlaọcha kasị mma.+ 20 N’ụzọ ezi omume ka m na-eje ije,+ n’etiti okporo ụzọ nke ikpe ziri ezi,+ 21 iji mee ka ndị hụrụ m n’anya nwee ezi akụ̀;+ ụlọ nkwakọba ihe ha ka m na-emekwa ka o ju n’ọnụ.+
22 “Jehova kere m dị ka mmalite nke ụzọ ya,+ ihe mbụ n’ime ihe niile ọ rụrụ n’oge dị anya gara aga.+ 23 Site na mgbe ebighị ebi ka e mere ka m guzosie ike,+ site ná mmalite, site na mgbe ụwa na-adịbeghị.+ 24 Mgbe ogbu mmiri ọ bụla na-adịghị, e tinyere oké mgbalị wee mụpụta m,+ mgbe isi iyi ndị jupụtara na mmiri na-adịghị. 25 Tupu e mee ka ugwu ukwu kwụsie ike,+ tupu e nwee ugwu nta, e tinyere oké mgbalị wee mụpụta m, 26 mgbe ọ na-emebeghị ụwa+ na mbara ala dị iche iche nakwa ájá mbụ nke ala.+ 27 Mgbe ọ kwadebere eluigwe, anọ m ya;+ mgbe o nyere iwu ka e nwee ihe dị okirikiri n’elu ogbu mmiri,+ 28 mgbe o mere ka ígwé ojii nke dị n’elu kwụsie ike,+ mgbe o mere ka isi iyi dị iche iche nke ogbu mmiri kwụsie ike,+ 29 mgbe o nyere iwu ya maka oké osimiri ka mmiri ghara ịgabiga iwu o nyere,+ mgbe ọ tọrọ ntọala ụwa,+ 30 mgbe ahụ, m nọ n’akụkụ ya dị ka onye ọkà ọrụ,+ m wee bụrụ onye ihe ya masịrị ya karịsịa+ kwa ụbọchị, mụ onwe m na-aṅụrịkwa ọṅụ n’ihu ya mgbe niile,+ 31 na-aṅụrị ọṅụ n’ihi elu ala ya,+ ihe na-enye m obi ụtọ bụkwa ihe metụtara ụmụ mmadụ.+
32 “Ugbu a, ụmụ m, geenụ m ntị; ee, obi ụtọ na-adịrị ndị na-edebe ụzọ m.+ 33 Nụrụnụ ịdọ aka ná ntị wee mara ihe,+ unu elegharakwala ya anya ma ọlị.+ 34 Obi ụtọ na-adịrị onye na-ege m ntị site n’ịmụrụ anya n’ọnụ ụzọ m kwa ụbọchị, site n’iche nche n’idé ndị dị n’ọnụ ụzọ m.+ 35 N’ihi na onye na-achọta m ga-achọta ndụ,+ nwetakwa amara n’aka Jehova.+ 36 Ma onye na-achọtaghị m na-eme mkpụrụ obi ya ihe ike;+ ndị niile kpọrọ m oké asị bụ ndị hụrụ ọnwụ n’anya.”+