21 Ọ ga-erukwa na mgbe ọtụtụ ọdachi na ahụhụ ga-adakwasị ha,+ abụ a ga-aza n’ihu ha dị ka onye akaebe, n’ihi na a gaghị echefu ya echefu n’ọnụ ụmụ ha, n’ihi na amaara m nke ọma ọchịchọ ha+ malitere inwe taa tupu mụ akpọba ha n’ala ahụ m ṅụrụ iyi inye ha.”
27 N’ihi ya, i nyefere ha n’aka ndị iro ha,+ bụ́ ndị nọ na-enye ha nsogbu;+ ma n’oge ha na-ata ahụhụ, ha na-etiku gị,+ gị onwe gị na-anọ n’eluigwe nụrụ;+ n’ihi ebere gị nke dị ukwuu,+ ị na-enye ha ndị nzọpụta,+ ndị na-azọpụta ha n’aka ndị iro ha.+
27 mgbe ihe unu na-atụ ụjọ ga-abịa dị ka oké ifufe mmiri, ọdachi unu abịarutekwa dị ka ifufe oké mmiri ozuzo,+ mgbe ahụhụ na oge ihe isi ike ga-abịakwasị unu.+