Diuterọnọmi
2 Ntụziaka m ga na-atasị dị ka mmiri ozuzo,+
Okwu m ga na-adasị dị ka igirigi,+
Dị ka mmiri nke na-avụsị n’elu ahịhịa,+
Dịkwa ka mmiri nke na-ezosi ike n’elu ahịhịa ndụ.+
4 Oké Nkume ahụ, ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ,+
N’ihi na ụzọ ya niile bụ ikpe ziri ezi.+
Chineke nke kwesịrị ntụkwasị obi,+ onye ikpe na-ezighị ezi na-adịghị n’ebe ọ nọ;+
Onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.+
5 Ha onwe ha emewo omume na-eweta mbibi;+
Ha abụghị ụmụ ya, ọ bụ ha nwere ntụpọ.+
Ọgbọ gbagọrọ agbagọ ma hịgọọ ahịgọ!+
6 Ọ̀ bụ Jehova ka unu na-emeso otú a,+
Unu ndị nzuzu na-amaghị ihe?+
Ọ́ bụghị ya bụ Nna gị nke mụrụ gị,+
Onye kere gị wee mee ka ị kwụsie ike?+
Chebaranụ afọ ndị gara aga site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ echiche;
Jụọ nna gị, ọ pụrụ ịkọrọ gị;+
Jụọkwa ndị agadi gị, ha pụrụ ịgwa gị ya.+
8 Mgbe Onye Kasị Elu nyere mba dị iche iche ihe nketa,+
Mgbe o kewara ụmụ Adam, otu onye n’ebe ibe ya nọ,+
O wee kpaara ndị dị iche iche ókè+
Dị ka ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel si dị.+
10 O wee chọta ya n’ala ịkpa,+
N’ọzara nke tọgbọ nkịtị, nke anụmanụ na-agbọ ụja na ya.+
Ọ malitere ịgba ya gburugburu,+ iji lekọta ya,+
Iji chebe ya dị ka nwa anya ya.+
11 Dị nnọọ ka ugo si akpasu akwụ́ ya,
Na-erugharị n’elu ụmụ ya,+
Gbasaa nku ya, buru ha,
Buru ha na nku ya,+
13 Ọ nọ na-eme ka ọ nọkwasị n’ebe ndị dị elu n’ụwa,+
O wee rie mkpụrụ si n’ubi.+
O mere ka ọ na-aracha mmanụ aṅụ nke si na nkume dị elu,+
Na mmanụ nke si n’oké nkume siri ike;+
14 Mmiri ara ehi rahụrụ arahụ na mmiri ara nke ewu na atụrụ,+
Tinyere abụba ebule,
Nakwa ebule, ụdị nke Beshan, na mkpi,+
Tinyere ọka wit kasị mma;+
Ị nọkwa na-aṅụ ọbara mkpụrụ vaịn dị ka mmanya.+
15 Mgbe Jeshurọn+ malitere ịma abụba, o wee nupụ isi.+
Ị mawo abụba, ị gbawo agba, i ribawo afọ.+
O wee gbahapụ Chineke, onye kere ya,+
Ledakwa Oké Nkume+ nke nzọpụta ya anya.
16 Ha malitere iji chi ala ọzọ+ kpalie ya ikwo ekworo;+
Ha nọkwa na-eji ihe arụ dị iche iche na-akpasu ya iwe.+
17 Ha wee na-achụrụ ndị mmụọ ọjọọ àjà, ọ bụghị Chineke,+
Ya bụ, chi dị iche iche ha na-amabughị,+
Bụ́ ndị ọhụrụ batara n’oge na-adịbeghị anya,+
Ndị nna nna unu hà na-amaghị.
18 I wee chefuo Oké Nkume nke mụrụ gị,+
I wee malite iwepụ Chineke n’echiche, bụ́ Onye mụpụtara gị dị ka à ga-asị na ime mere ya.+
19 Mgbe Jehova hụrụ ya, ọ kwụsịrị ịkwanyere ha ùgwù,+
N’ihi iwe ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom kpasuru ya.
20 O wee sị, ‘Ka m wepụ ihu m n’ebe ha nọ,+
Ka m hụ ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ ha.
N’ihi na ha bụ ọgbọ rụrụ arụ,+
Ụmụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi.+
21 Ha onwe ha ejiriwo ihe na-abụghị chi kpalie m ikwo ekworo;+
Ha ejiriwo arụsị ha na-abaghị n’ihe+ kpasuo m iwe;
Mụ onwe m ga-ejikwa ndị na-enweghị ihe ha bụ kpalie ha ikwo ekworo;+
M ga-eji mba nzuzu kpasuo ha iwe.+
22 N’ihi na iwe m enwuruwo dị ka ọkụ,+
Ọ ga-erekwa ọkụ gbadaruo Shiol, n’ebe dị n’ime ime ala,+
Ọ ga-erechapụkwa ala na mkpụrụ ya,+
Sunyekwa ntọala ugwu ọkụ.+
24 Ike ga-agwụ ha n’ihi agụụ,+ oké ahụ́ ọkụ ga-eripịakwa ha,+
Ya na ajọ mbibi.+
M ga-ezitekwa anụ ọhịa ka ha taa ha,+
Ha na anụ ndị na-akpụ n’ala ka ha tanye ha elò n’ahụ́.+
25 Mma agha ga-agbawa ha aka nwa n’èzí,+
Ụjọ ga-adịkwa n’ime ụlọ,+
Gbawa ha aka ma nwa okorobịa ma nwa agbọghọ na-amaghị nwoke,+
Nwa na-aṅụ ara na nwoke isi awọ́.+
27 Ma ọ́ bụghị na m tụrụ egwu iwe onye iro,+
Na ndị na-emegide ha pụrụ ịghọtahie ya,+
Na ha pụrụ ịsị: “Aka anyị akawo ike,+
Ọ bụghịkwa Jehova mere ihe a dum.”+
29 A sị nnọọ na ha maara ihe,+ ha gaara echebara ihe a echiche!+
Ha gaara eche echiche banyere ihe ga-emesị bụrụ ọgwụgwụ ha.+
30 Olee otú otu onye pụrụ isi chụọ otu puku mmadụ ọsọ,
Mmadụ abụọ achụọkwa puku mmadụ iri ọsọ?+
Ọ gwụla ma Oké Nkume ha ò rere ha,+
Jehova enyefeekwa ha n’aka ha.
32 N’ihi na osisi vaịn ha si n’osisi vaịn Sọdọm,
O si na mbara ala Gọmọra.+
Mkpụrụ vaịn ha bụ mkpụrụ vaịn na-egbu mmadụ,
Ụyọkọ ha na-elu ilu.+
35 Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ na ịkwụ ụgwọ.+
N’oge a kara aka, ụkwụ ha agaghị akwụsi ike n’ala,+
N’ihi na ụbọchị ọdachi ha dị nso,+
Ihe ndị a ga-eme ha na-abịakwa ọsọ ọsọ.’+
36 N’ihi na Jehova ga-ekpe ndị ya ikpe,+
Ọ ga-enwekwa mwute maka ndị ohu ya,+
N’ihi na ọ ga-ahụ na ha enwekwaghị enyemaka,
Naanị ihe e nwere bụ onye na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe.
38 Ònye na-eribu abụba nke àjà ha,+
Na-aṅụ mmanya àjà ihe ọṅụṅụ ha?+
Ha bilie nyere unu aka.+
Ha ghọọrọ unu ebe nzuzo.+
E nweghịkwa chi ọzọ ọ bụ mụ na ya.+
M na-eme ka a nwụọ, m na-emekwa ka a dị ndụ.+
Emewo m ka e nwee oké mmerụ ahụ́,+ mụ onwe m ga-agwọkwa ya,+
Ọ dịghịkwa onye na-anapụta ihe n’aka m.+
40 N’ihi na m na-eweli aka m n’eluigwe ṅụọ iyi,+
M na-asịkwa: “Dị nnọọ ka m dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi,”+
41 Mgbe m ga-amụ mma agha m nke na-egbu maramara,+
Mgbe aka m ga-eme ihe e kpere n’ikpe,+
M ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị na-emegide m,+
M ga-akwụkwa ndị kpọrọ m oké asị ụgwọ.+
42 M ga-eme ka ọbara gbuo akụ́ m dị ka mmanya,+
Mma agha m ga-erikwa anụ ahụ́,+
Ṅụọkwa ọbara ndị e gburu egbu na nke ndị a dọtara n’agha,
Ọ ga-erikwa isi ndị ndú nke onye iro.’+
43 Soronụ ndị ya ṅụrịa ọṅụ, unu mba niile,+
N’ihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya,+
Ọ ga-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị iro ya,+
Kpuchiekwara ala nke ndị ya mmehie.”
44 Mozis wee bịa kwuo okwu niile nke abụ a ná ntị ụmụ Izrel,+ ya na Hoshia nwa Nọn.+ 45 Mgbe Mozis gwasịrị Izrel dum ihe a niile, 46 ọ gara n’ihu ịsị ha: “Tinyenụ okwu niile m na-agwa unu iji dọọ unu aka ná ntị taa n’obi unu,+ ka unu wee nye ụmụ unu iwu ka ha lezie anya ime ihe niile e kwuru n’iwu a.+ 47 N’ihi na ọ bụghịrị unu okwu na-abaghị uru,+ kama ọ bụ ndụ unu,+ unu ga-esitekwa n’okwu a mee ka ụbọchị unu dị ogologo n’ala ahụ unu na-agafe Jọdan inweta.”+
48 Jehova wee gwa Mozis okwu n’otu ụbọchị ahụ, sị: 49 “Gbagoo n’ugwu Abarim a,+ bụ́ Ugwu Nibo,+ nke dị n’ala Moab, nke chere ihu na Jeriko, hụ ala Kenan, nke m na-enye ụmụ Izrel ịbụ ihe onwunwe.+ 50 Nwụọ n’elu ugwu ahụ ị na-agbago, ka e lie gị dị ka e liri ndị gị,+ dị nnọọ ka Erọn nwanne gị nwụrụ n’Ugwu Họọ,+ e wee lie ya dị ka e liri ndị ya; 51 n’ihi na unu emesoghị m otú unu kwesịrị isi meso m+ n’etiti ụmụ Izrel, na mmiri Meriba+ nke Kedesh, n’ala ịkpa Zin; n’ihi na unu edoghị m nsọ n’etiti ụmụ Izrel.+ 52 N’ihi na ị ga-anọ n’ebe dị anya hụ ala ahụ, ma ị gaghị abanye ebe ahụ, n’ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel.”+