Jenesis
4 Adam na nwunye ya bụ́ Iv wee nwee mmekọahụ, o wee tụrụ ime.+ Ka oge na-aga, ọ mụrụ Ken+ wee sị: “Amụtawo m nwoke site n’enyemaka Jehova.”+ 2 E mesịa, ọ mụrụ nwa ọzọ, bụ́ nwanne ya Ebel.+
Ebel wee bụrụ onye na-azụ atụrụ,+ ma Ken bụ onye na-akọ ugbo.+ 3 O wee ruo mgbe oge ụfọdụ gasịrị na Ken wetaara Jehova ụfọdụ n’ime ihe ala mepụtara+ dị ka onyinye.+ 4 Ma Ebel wetakwara ụfọdụ n’ime anụ e bu ụzọ mụọ+ n’ìgwè ewu na atụrụ ya, ọbụna abụba ha.+ Ọ bụ ezie na Jehova lere Ebel na onyinye+ ya anya ọma, 5 o leghị Ken na onyinye+ ya anya ọma ma ọlị. Ken wee wee iwe dị ọkụ,+ ihu ya malitekwara ịgbarụ. 6 Jehova wee sị Ken: “Gịnị mere i ji na-ewe iwe dị ọkụ, gịnịkwa mere ihu gị ji gbarụọ? 7 Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ezi ihe, ọ̀ bụ na a gaghị ebuli gị elu?+ Ma ọ bụrụ na ị gbanweghị mewe ezi ihe, lee, mmehie makpu n’ọnụ ụzọ, ọ bụkwa gị ka ọ na-achọsi ike inweta;+ ma gị onwe gị, ị̀ ga-emeri ya?”+
8 Mgbe nke ahụ gasịrị, Ken gwara Ebel nwanne ya, sị: “Ka anyị gaa n’ọhịa.” O wee ruo na ka ha nọ n’ọhịa, Ken wakporo Ebel nwanne ya wee gbuo ya.+ 9 E mesịa, Jehova sịrị Ken: “Olee ebe Ebel nwanne gị nọ?”+ o wee sị: “Amaghị m. Àbụ m onye nche nwanne m?”+ 10 O wee sị: “Gịnị ka i mere? Gee ntị! Ọbara nwanne gị si n’ala na-etiku m.+ 11 Ugbu a, ị bụ onye a bụrụ ọnụ na onye a chụpụrụ achụpụ n’ala,+ bụ́ nke meghere ọnụ ya ịnara ọbara nwanne gị n’aka gị.+ 12 Ọ bụrụ na ị kọọ ihe n’ala, ọ gaghị emepụtara gị ihe nke ọma.+ Onye na-awagharị awagharị na onye gbara ọsọ ka ị ga-aghọ n’ụwa.”+ 13 Ken wee sị Jehova: “Ntaramahụhụ maka njehie m dị ukwuu nke na agaghị m ebuli ya. 14 Lee, ị na-achụpụ m taa n’elu ala, a ga-ezopụkwa m n’ihu gị;+ m ga-aghọkwa onye na-awagharị awagharị+ na onye gbara ọsọ n’ụwa, o dokwara anya na onye ọ bụla hụrụ m ga-egbu m.”+ 15 Jehova wee sị ya: “N’ihi nke ahụ, a ghaghị ịbọ ọbọ okpukpu asaa+ n’ahụ́ onye ọ bụla gburu Ken.”
Jehova wee dooro Ken ihe ịrịba ama ka onye ọ bụla hụrụ ya ghara igbu ya.+ 16 Ken wee si n’ihu Jehova+ pụọ wee gaa biri n’ala Ndị Gbara Ọsọ n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Iden.
17 E mesịa, Ken na nwunye ya nwere mmekọahụ,+ o wee tụrụ ime mụọ Inọk. O wee wuo otu obodo ma gụọ obodo ahụ aha nwa ya bụ́ Inọk.+ 18 E mesịa, a mụụrụ Inọk Aịrad. Aịrad wee mụọ Mehujel, Mehujel wee mụọ Metushel, Metushel wee mụọ Lemek.
19 Lemek wee lụọ nwaanyị abụọ. Aha nke mbụ bụ Eda, aha nke abụọ abụrụ Zila. 20 Ka oge na-aga, Eda mụrụ Jebal. Ọ bụ ya bụ nna nke ndị na-ebi n’ụlọikwuu,+ ndị nwekwara anụ ụlọ.+ 21 Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal. Ọ bụ ya bụ nna nke ndị niile na-akpọ ụbọ akwara,+ na-egbukwa ọjà.+ 22 Ma Zila mụrụ Tubal-ken, onye na-eji ọla kọpa na ígwè akpụ ụdị ngwá ọrụ ọ bụla.+ Nwanne nwaanyị Tubal-ken bụ Neama. 23 Ya mere, Lemek rọọrọ ndị inyom ya bụ́ Eda na Zila abụ uri a, sị:
“Nụrụnụ olu m, unu ndị inyom Lemek;
Ṅaanụ ntị n’okwu m:
Egburu m otu nwoke n’ihi na o merụrụ m ahụ́,
Ee, nwa okorobịa n’ihi na o tiri m ihe.
24 Ọ bụrụ na a ga-abọrọ Ken ọbọ+ okpukpu asaa,
Mgbe ahụ a ga-abọrọ Lemek ọbọ okpukpu iri asaa na asaa.”
25 Adam na nwunye ya wee nwee mmekọahụ ọzọ, nwunye ya wee mụọ nwa nwoke ma gụọ ya Set,+ n’ihi na, dị ka o kwuru: “Chineke ahọpụtaworo m mkpụrụ ọzọ n’ọnọdụ Ebel, n’ihi na Ken gburu ya.”+ 26 A mụkwaara Set nwa nwoke, o wee gụọ ya Inọsh.+ N’oge ahụ, a malitere ịkpọku aha Jehova.+