Ilu
2 Nwa m, ọ bụrụ na ị nabata ihe m na-ekwu+ ma chekwaa ihe m nyere n’iwu n’obi gị,+ 2 ka i wee gee amamihe ntị,+ ka i wee jiri obi gị chọọ nghọta;+ 3 ọ bụrụkwa na ọ bụ nghọta+ ka ị na-akpọku, ọ bụrụkwa na ọ bụ ikike ịghọta ihe+ ka ị na-etiku, 4 ọ bụrụ na ị na-achọ ya dị ka e si achọ ọlaọcha,+ ọ bụrụkwa na ọ bụ dị ka akụ̀ zoro ezo ka ị na-achọ ya,+ 5 mgbe ahụ, ị ga-aghọta egwu+ Jehova, ọ bụkwa ihe ọmụma Chineke+ ka ị ga-achọta. 6 N’ihi na ọ bụ Jehova na-enye amamihe;+ ihe ọmụma na nghọta na-esi n’ọnụ ya apụta.+ 7 Ọ bụkwa ndị ziri ezi ka ọ ga-echekwara ezi amamihe;+ ọ bụ ọta nke ndị na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe,+ 8 site n’iche ụzọ ikpe ziri ezi+ nche, ọ ga-echekwa ụzọ nke ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ nche.+ 9 Mgbe ahụ, ị ga-aghọta ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, bụ́ ụzọ dum nke ihe dị mma.+
10 Mgbe amamihe banyere n’obi gị,+ ihe ọmụma abụrụkwa ihe na-atọ mkpụrụ obi gị ụtọ,+ 11 ikike iche echiche ga-echekwa gị nche,+ nghọta ga-echebekwa gị,+ 12 ịnapụta gị n’ụzọ ọjọọ,+ n’aka onye na-ekwu ihe rụrụ arụ,+ 13 n’aka ndị na-ahapụ ụzọ ziri ezi iji jee ije n’ụzọ ọchịchịrị,+ 14 n’aka ndị na-aṅụrị ọṅụ n’ime ihe ọjọọ,+ ndị na-enwe aṅụrị n’ihe arụ nke bụ́ ihe ọjọọ;+ 15 ndị ụzọ ha gbagọrọ agbagọ, ndị dịkwa aghụghọ n’ụzọ ha niile;+ 16 iji napụta gị n’aka nwaanyị na-eme omume rụrụ arụ,* n’aka nwaanyị na-akwa iko,*+ bụ́ onye mere ka okwu ya bụrụ okwu ire ụtọ,+ 17 onye na-ahapụ enyi ọma o nwere n’oge ọ bụ nwa agbọghọ,+ onye chefuwokwara ọgbụgba ndụ Chineke ya.+ 18 N’ihi na ụlọ ya na-emi emi ruo n’ọnwụ, ụzọ ya na-emikwa emi ruo n’ebe ndị na-adịghị ndụ nọ.+ 19 Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ndị ya na ha na-enwe mmekọahụ ga-alọghachi, ha agaghịkwa abịaghachi n’ụzọ nke ndị dị ndụ.+
20 Nzube ya bụ ka i wee na-eje ije n’ụzọ ndị ezi mmadụ,+ ka i wee sorokwa ụzọ nke ndị ezi omume.+ 21 N’ihi na ọ bụ ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa,+ ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya.+ 22 Ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa;+ a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.+