Jeremaya
34 Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Jeremaya ntị, mgbe Nebukadreza eze Babịlọn+ na ndị agha ya niile+ na alaeze niile nke ụwa, bụ́ ndị nọ n’okpuru ya,+ na ndị niile, nọ na-ebuso Jeruselem na obodo ya niile agha:+
2 “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Gaa gwa Zedekaya eze Juda,+ ee, sị ya: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Lee, m ga-enyefe obodo a n’aka eze Babịlọn,+ ọ ga-agbakwa ya ọkụ.+ 3 Gị onwe gị agaghị agbapụ n’aka ya, n’ihi na a ghaghị ijide gị, a ga-enyefekwa gị n’aka ya.+ Ị ga-eji anya gị hụ eze Babịlọn ihu na ihu,+ ọ ga-ejikwa ọnụ ya gwa gị okwu ihu na ihu, ị ga-agakwa Babịlọn.’ 4 Otú ọ dị, nụrụ ihe Jehova kwuru, gị Zedekaya eze Juda,+ ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere gị: “A gaghị eji mma agha gbuo gị. 5 Ị ga-anwụ n’udo;+ a ga-esurere gị ihe nsure ọkụ dị ka e sureere nna nna gị hà, bụ́ ndị eze bu gị ụzọ,+ ihe nsure ọkụ,+ a ga-akwakwara gị ákwá arịrị,+ sị, ‘Ewoo, nna anyị ukwu!’+ n’ihi na ‘mụ onwe m ekwuwo ya,’ ka Jehova kwuru.”’”’”
6 Jeremaya onye amụma wee gwa Zedekaya eze Juda ihe a niile+ na Jeruselem, 7 mgbe ndị agha eze Babịlọn nọ na-ebuso Jeruselem na obodo niile fọdụrụ na Juda agha,+ ya bụ, Lekish+ na Azika;+ n’ihi na ọ bụ obodo ndị a, bụ́ obodo ndị e wusiri ike,+ fọdụrụ n’ime obodo niile dị na Juda.+
8 Nke a bụ okwu Jehova nke ruru Jeremaya ntị mgbe Eze Zedekaya na ndị niile nọ na Jeruselem gbasịrị ndụ ka a kpọsaara ha nnwere onwe,+ 9 ka onye ọ bụla hapụ ohu ya nwoke na ohu ya nwaanyị, bụ́ nwoke Hibru+ na nwaanyị Hibru, ka ọ laa, ka ha ghara iji ha mere ndị ohu, ya bụ, onye Juu nke bụ́ nwanne ya.+ 10 Ndị isi niile+ wee rube isi, onye ọ bụla n’ime ndị niile so gbaa ndụ wee hapụ ohu ya nwoke na ohu ya nwaanyị ka ọ laa, wee kwụsị iji ha mere ohu, ha wee rube isi ma hapụ ha ka ha laa.+ 11 Ma, mgbe nke ahụ gasịrị, ha malitere ịkpọrọghachi+ ndị ohu ha ndị ikom na ndị ohu ha ndị inyom bụ́ ndị ha hapụburu ka ha laa, ha wee jiri ha mere ndị ohu ha ndị ikom na ndị ohu ha ndị inyom.+ 12 Okwu Jehova wee si n’ọnụ Jehova ruo Jeremaya ntị, sị:
13 “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Mụ na nna nna unu hà+ gbara ndụ n’ụbọchị m si n’ala Ijipt,+ n’ụlọ ndị ohu,+ kpọpụta ha, sị: 14 “Ná ngwụcha afọ asaa, onye ọ bụla n’ime unu ga-ahapụ nwanne ya,+ bụ́ onye Hibru,+ onye e resịrị ya,+ nke jewooro ya ozi afọ isii, ka ọ laa; ị ga-ahapụ ya ka o nwere onwe ya.” Ma nna nna unu hà egeghị m ntị, ha atọghịkwa ntị ha n’ala.+ 15 Unu onwe unu agbanwewo taa wee mee ihe ziri ezi n’anya m site n’onye ọ bụla n’ime unu ịkpọsara ibe ya nnwere onwe, unu wee nọrọ n’ụlọ a kpọkwasịrị aha m+ gbaa ndụ n’ihu m.+ 16 Ma unu laghachiri azụ+ merụọ aha m+ site n’onye ọ bụla n’ime unu ịkpọrọghachi ohu ya nwoke na ohu ya nwaanyị, ndị unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, bụ́ nke dị mkpụrụ obi ha mma, unu wee jiri ha mere ndị ohu ndị ikom na ndị ohu ndị inyom.’+
17 “Ya mere, nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Unu onwe unu erubereghị m isi site n’onye ọ bụla n’ime unu ịkwụsị ịkpọsara nwanne ya na enyi ya nnwere onwe.+ Nke a bụ nnwere onwe m na-akpọsara unu,’+ ka Jehova kwuru, ‘mma agha+ na ọrịa na-efe efe+ na ụnwụ+ ga-egbu unu, m ga-emekwa ka unu ghọọrọ alaeze niile nke ụwa ihe na-akpata ịma jijiji.+ 18 M ga-enyefe ndị na-emebi ọgbụgba ndụ m+ n’aka ndị iro ha, n’ihi na ha emeghị ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ ha ji nwa ehi gbaa n’ihu m, bụ́ nwa ehi ha bọwara ụzọ abụọ+ wee si n’etiti ibé abụọ ahụ gafere;+ 19 ya bụ, ndị isi Juda na ndị isi Jeruselem,+ ndị na-eje ozi n’obí eze na ndị nchụàjà na ndị ala a niile bụ́ ndị si n’etiti anụ nwa ehi ahụ a bọwara abọwa gafere, 20 ee, m ga-enyefe ha n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi ha;+ ozu ha ga-abụrụ anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa ihe oriri.+ 21 M ga-enyefe Zedekaya eze Juda+ na ndị o mere ndị isi n’aka ndị iro ha nakwa n’aka ndị na-achọ mkpụrụ obi ha nakwa n’aka ndị agha eze Babịlọn+ bụ́ ndị hapụrụ ibuso unu agha wee laghachi azụ.’+
22 “‘Lee, m ga-enye iwu,’ ka Jehova kwuru, ‘m ga-eme ka ha lọghachi n’obodo a,+ ha ga-ebuso ya agha, weghara ya ma gbaa ya ọkụ;+ m ga-emekwa ka obodo niile dị na Juda tọgbọrọ n’efu n’enweghị onye bi ha.’”+