Jeremaya
33 Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị nke ugboro abụọ, mgbe ọ ka nọ n’ebe a kpọchiri ya n’Ogige Ndị Nche,+ sị: 2 “Nke a bụ ihe Jehova Onye kere+ ụwa kwuru, bụ́ Jehova Onye kpụrụ+ ya ka o guzosie ike,+ Jehova bụ aha ya,+ 3 ‘Kpọkuo m, m ga-aza gị+ n’egbughị oge, m ga-agwa gị oké ihe ndị a na-apụghị ịghọta aghọta, ndị ị na-amaghị.’”+
4 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru banyere ụlọ ndị dị n’obodo a na ụlọ ndị eze Juda bụ́ ndị a ga-akwatu n’ihi ékpè a mara nakwa n’ihi mma agha;+ 5 nakwa banyere ndị na-abịa ibuso ndị Kaldia agha na ime ka ebe niile jupụta n’ozu mmadụ, bụ́ ndị m ji iwe na ọnụma gbuo,+ ndị niile ọ bụ ihe ọjọọ ha na-eme mere m ji wepụ ihu m n’ebe obodo a dị,+ 6 ‘Lee, m ga-eme ka ọ gbakee ma nwee ahụ́ ike;+ m ga-agwọkwa ha ma kpugheere ha udo na eziokwu dị ukwuu.+ 7 M ga-akpọlata ndị Juda a dọọrọ n’agha na ndị Izrel a dọọrọ n’agha,+ m ga-emekwa ka ha dị otú ha dị ná mmalite.+ 8 M ga-asachapụ ha njehie niile ha jehiere megide m,+ m ga-agbaghara ha njehie niile ha jehiere megide m nakwa iwu m ha mebiri.+ 9 Obodo a ga-aghọrọ m aha na-enye ọṅụ,+ otuto na ịma mma n’ebe mba niile nke ụwa nọ, bụ́ ndị ga-anụ banyere ihe ọma niile m na-emere ha.+ Ha ga-atụ ụjọ,+ maakwa jijiji+ n’ihi ihe ọma niile m na-emere ya na udo niile m na-ewetara ya.’”+
10 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ebe a nke unu ga na-asị na ọ bụ mkpọmkpọ ebe nke mmadụ na anụ ụlọ na-anọghị, n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem bụ́ ndị e mere ka ha tọgbọrọ n’efu,+ nke mmadụ na-anọghị, nke na-enweghị onye bi ya, nke anụ ụlọ na-anọghịkwa, a ka ga-anụ+ 11 mkpu ọṅụ na olu ndị na-aṅụrị ọṅụ,+ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ, olu ndị na-asị: “Toonụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, n’ihi na Jehova dị mma;+ n’ihi na obiọma* ya na-adịru mgbe ebighị ebi!”’+
“‘Ha ga na-eweta àjà ekele n’ụlọ Jehova,+ n’ihi na m ga-akpọlata ndị ala a a dọọrọ n’agha dị nnọọ ka ọ dị ná mmalite,’+ ka Jehova kwuru.”
12 “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘N’ebe a bụ́ mkpọmkpọ ebe nke mmadụ na ọbụna anụ ụlọ+ na-anọghị nakwa n’obodo ya niile, a ka ga-enwe ala ịta ahịhịa maka ndị ọzụzụ atụrụ bụ́ ndị na-eme ka atụrụ ha makpuru ala.’+
13 “N’obodo ndị dị n’ógbè bụ́ ugwu ugwu, n’obodo ndị dị n’ala dị larịị+ nakwa n’obodo ndị dị n’ebe ndịda+ nakwa n’ala Benjamin+ nakwa n’ebe niile gbara Jeruselem gburugburu+ nakwa n’obodo ndị dị na Juda,+ ka ìgwè ewu na atụrụ ka ga na-agafe n’okpuru aka onye na-agụ ha ọnụ,’+ ka Jehova kwuru.”
14 “‘Lee! Oge na-abịa,’+ ka Jehova kwuru, ‘mgbe m ga-emezu okwu ọma niile m kwuru+ banyere ụlọ Izrel+ na ụlọ Juda. 15 N’ụbọchị ndị ahụ nakwa n’oge ahụ, m ga-eme ka ome ezi omume puoro Devid,+ ọ ga-eme ihe n’ikpe ziri ezi, meekwa ezi omume n’ala a.+ 16 N’oge ahụ, a ga-azọpụta Juda,+ Jeruselem ga-ebikwa n’obi iru ala.+ Ihe a ga na-akpọ ya bụ, Jehova Bụ Ezi Omume Anyị.’”+
17 “N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe nwoke si n’ahụ́ Devid nke ga-anọkwasị n’ocheeze Izrel.+ 18 Ọ dịghịkwa mgbe a na-agaghị enwe nwoke bụ́ otu n’ime ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, nke na-eguzo n’ihu m isure àjà a na-esurecha n’ọkụ na ịchụ àjà ọka* na ịchụ àjà nkịtị mgbe niile.’”+
19 Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị ọzọ, sị: 20 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu pụrụ imebi ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na ọgbụgba ndụ m nke na-achị abalị ka a ghara inwe ehihie na abalị n’oge ha,+ 21 a pụkwara imebi ọgbụgba ndụ mụ na Devid bụ́ ohu m+ ka e wee ghara inwe nwa ya nke na-achị dị ka eze n’ocheeze ya;+ tinyere ọgbụgba ndụ mụ na ndị Livaị bụ́ ndị nchụàjà, ndị na-ejere m ozi.+ 22 Dị ka a na-apụghị ịgụta ìgwè ihe dị n’eluigwe ọnụ, dịkwa ka a na-apụghị ịtụ ájá dị n’oké osimiri atụ̀,+ otú ahụ ka m ga-eme ka mkpụrụ Devid bụ́ ohu m na ndị Livaị na-ejere m ozi mụbaa.’”+
23 Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị ọzọ, sị: 24 “Ị́ nụbeghị ihe ụfọdụ n’ime ndị a kwuru, sị, ‘Jehova ga-ajụ ezinụlọ abụọ ahụ ọ họọrọ’?+ Ha na-elelịkwa ndị m,+ nke mere na ọ gakwaghị abụ mba n’ihu ha.
25 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Dị nnọọ ka m mere ka e nwee ọgbụgba ndụ m nke na-achị ehihie na abalị,+ meekwa ka e nwee ụkpụrụ ndị na-achị eluigwe na ụwa,+ 26 otú ahụ ka m na-agaghị ajụ mkpụrụ Jekọb na mkpụrụ Devid ohu m,+ agaghịkwa m ahapụ isi ná mkpụrụ ya họpụta ndị ga-achị mkpụrụ Ebreham, Aịzik na Jekọb. N’ihi na m ga-akpọkọta ndị ha a dọọrọ n’agha,+ m ga-enwekwa ọmịiko n’ebe ha nọ.’”+