Levitikọs 25:25 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 25 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye wee ree ụfọdụ n’ime ala ya, onye bụ́ ezigbo onye ikwu ya ga-abịa gbara ihe ahụ nwanne ya rere.+ Diuterọnọmi 15:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+ Abụ Ọma 41:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 41 Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe;+Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi.+ Ilu 14:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Onye dara ogbenye ka mmadụ ibe ya na-akpọ asị,+ ma ndị enyi ọgaranya na-adị ọtụtụ.+ Ilu 17:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Onye na-akwa onye dara ogbenye emo akọchawo Onye kere ya.+ Onye na-aṅụrị ọṅụ n’ọdachi onye ọzọ agaghị agbanahụ ntaramahụhụ.+ Ilu 19:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe,+ Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.+ Mak 14:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ unu pụkwara imere ha ihe ọma mgbe niile mgbe ọ bụla unu chọrọ, ma mụ na unu anọghị mgbe niile.+
25 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye wee ree ụfọdụ n’ime ala ya, onye bụ́ ezigbo onye ikwu ya ga-abịa gbara ihe ahụ nwanne ya rere.+
7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+
41 Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe;+Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi.+
5 Onye na-akwa onye dara ogbenye emo akọchawo Onye kere ya.+ Onye na-aṅụrị ọṅụ n’ọdachi onye ọzọ agaghị agbanahụ ntaramahụhụ.+
17 Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe,+ Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.+
7 N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ unu pụkwara imere ha ihe ọma mgbe niile mgbe ọ bụla unu chọrọ, ma mụ na unu anọghị mgbe niile.+