Levitikọs
25 Jehova wee gwa Mozis okwu ọzọ n’Ugwu Saịnaị, sị: 2 “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Mgbe unu mesịrị bata n’ala m ga-enye unu,+ ala ahụ ga-edebere Jehova ụbọchị izu ike.+ 3 Afọ isii ka unu ga-agha mkpụrụ n’ubi unu, afọ isii ka unu ga-akwacha ubi vaịn unu, unu ga-aghọrọkwa mkpụrụ ala unu.+ 4 Ma n’afọ nke asaa, ala ga-ezu nnọọ ike,+ bụ́ izu ike a ga-edebere Jehova. Unu agaghị agha mkpụrụ n’ubi unu, unu agaghịkwa akwacha ubi vaịn unu. 5 Unu ewerela ihe mkpụrụ dapụrụ adapụ n’ihe ubi unu mịpụtara, unu aghọrọkwala mkpụrụ nke osisi vaịn unu a na-akwachaghị akwacha mịrị. Ala ga-ezu nnọọ ike ruo otu afọ. 6 Ihe ala unu mepụtara n’afọ ahụ ọ na-ezu ike ga-abụrụ unu ihe oriri, maka gị na ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị na onye ọrụ e goro ego na onye ọbịa gị na ya bi, ndị mbịarambịa gị na ha bi, 7 nakwa maka anụ ụlọ gị na anụ ọhịa ndị bi n’ala gị. A ga-eri ihe niile o mepụtara eri.
8 “‘Unu ga-agụpụtara onwe unu afọ izu ike asaa, afọ asaa ụzọ asaa, afọ izu ike asaa ahụ ga-abụrụ unu afọ iri anọ na itoolu. 9 Unu ga-afụ opi na-adasị ụda ike+ n’ọnwa nke asaa, n’abalị iri n’ọnwa ahụ;+ unu ga-afụ opi ahụ n’ala unu dum n’ụbọchị mkpuchi mmehie.+ 10 Unu ga-edo afọ nke iri ise nsọ ma kpọsaara ndị niile bi n’ala unu nnwere onwe.+ Ọ ga-abụrụ unu afọ Jubili,+ onye nke ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ala ya, onye nke ọ bụla n’ime unu ga-alaghachikwuru ezinụlọ ya.+ 11 Afọ Jubili ka afọ nke iri ise ga-abụrụ unu.+ Unu agaghị agha mkpụrụ, unu agaghịkwa ewere ihe mkpụrụ dapụrụ adapụ mịpụtara, unu agaghịkwa aghọrọ mkpụrụ nke osisi vaịn a na-akwachaghị akwacha mịrị.+ 12 N’ihi na ọ bụ afọ Jubili. Ọ ga-abụrụ unu ihe dị nsọ. Unu pụrụ iri ihe ala mepụtara n’ubi unu.+
13 “‘N’afọ Jubili, onye ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ihe nketa ya.+ 14 Ọ bụrụ na unu eresị mmadụ ibe unu ngwá ahịa ma ọ bụ zụta ihe n’aka mmadụ ibe unu, unu emejọla ibe unu.+ 15 Unu ga-azụrụ ihe n’aka mmadụ ibe unu dabere n’afọ ole gafeworo mgbe afọ Jubili gasịrị; ọ ga-eresị gị ihe dabere n’afọ ole fọdụụrụ ihe ubi ahụ.+ 16 Ọ ga-ebuli ọnụ ahịa ya dabere n’otú afọ dịruru ọtụtụ,+ ọ ga-ewedakwa ọnụ ahịa ya dabere n’otú afọ dịruru ole na ole, n’ihi na ihe ọ na-eresị gị dabeere n’ihe ole dị n’ubi ahụ. 17 Onye ọ bụla n’ime unu emejọla ibe ya,+ tụọnụ egwu Chineke unu,+ n’ihi na abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.+ 18 Ya mere, debenụ ụkpụrụ m, debekwanụ mkpebi ikpe m, meekwanụ ha. Mgbe ahụ unu ga-ebi n’ala ahụ n’obi iru ala.+ 19 Ala ahụ ga-emepụtakwa mkpụrụ ya,+ unu ga-erijukwa afọ ma biri na ya n’obi iru ala.+
20 “‘Ma ọ bụrụ na unu asị: “Gịnị ka anyị ga-eri n’afọ nke asaa ebe ọ bụ na anyị agaghị agha mkpụrụ ma ọ bụ wee ihe ubi?”+ 21 mgbe ahụ, m ga-enye ngọzi m iwu ka ọ bịakwasị unu n’afọ nke isii, ala unu ga-amịkwa mkpụrụ ga-ezu afọ atọ.+ 22 Unu ga-aghakwa mkpụrụ n’afọ nke asatọ, unu ga na-eri ihe ubi nke ochie ruo afọ nke itoolu. Unu ga na-eri nke ochie ruo mgbe ihe ubi ọhụrụ ga-apụta.
23 “‘Ya mere, a gaghị ere ala n’enweghị mgbe a ga-agbara ya,+ n’ihi na ọ bụ m nwe ala.+ N’ihi na n’anya m, unu bụ ndị mbịarambịa na ndị ọbịa.+ 24 N’ala niile bụ́ nke unu, unu ga-eme ka e nwee ikike ịgbara ala e rere ere.+
25 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị adaa ogbenye wee ree ụfọdụ n’ime ala ya, onye bụ́ ezigbo onye ikwu ya ga-abịa gbara ihe ahụ nwanne ya rere.+ 26 Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị onye ga-agbara ihe o rere, o wee nweta uru, nwetakwa ihe ga-ezuru ya ịgbara ya, 27 ọ ga-agbakọ afọ ole gabigara malite na mgbe o rere ya, ọ ga-enyeghachi onye o resịrị ya ego ole fọdụrụ, ọ ga-alaghachikwa n’ihe nketa ya.+
28 “‘Ma ọ bụrụ na o nwetaghị ihe zuru iji kwụghachi ya, ihe ahụ o rere ga-adịgide n’aka onye zụrụ ya ruo n’afọ Jubili;+ ọ ga-apụ ya n’aka n’afọ Jubili, ọ ga-alaghachi n’ihe nketa ya.+
29 “‘Ọ bụrụ na mmadụ eree ụlọ obibi nke dị n’obodo nwere mgbidi, ọ ga-anọgide na-enwe ikike ịgbara ya ruo mgbe otu afọ gabigara malite na mgbe o rere ya; ikike o nwere ịgbara ya+ ga-adịgide ruo otu afọ zuru ezu. 30 Ma ọ bụrụ na a gbaraghị ya tupu otu afọ ahụ ezuo, ụlọ ahụ nke dị n’obodo nwere mgbidi ga na-abụ ihe onwunwe nke onye zụrụ ya ruo n’ọgbọ ya niile. Ọ gaghị apụ ya n’aka n’afọ Jubili. 31 Otú ọ dị, a ga-ewere ụlọ ndị dị n’obodo nta na-enweghị mgbidi dị ka ala ubi ndị dị n’ime ime obodo. A ka ga-enwe ikike ịgbara ya,+ ọ ga-apụ mmadụ n’aka n’afọ Jubili.+
32 “‘Ma obodo ndị Livaị na ụlọ ndị dị n’obodo ndị bụ́ ihe nketa ha,+ ndị Livaị ga na-enwe ikike ịgbara ya ruo mgbe a na-akaghị aka.+ 33 Ọ bụrụ na a gbaraghị ihe onwunwe ndị Livaị, ụlọ e rere n’obodo ebe ihe nketa ya dị ga-apụ n’aka onye zụrụ ya n’afọ Jubili;+ n’ihi na ụlọ ndị dị n’obodo ndị Livaị bụ ihe nketa ha n’etiti ụmụ Izrel.+ 34 A gaghịkwa ere ala ịta ahịhịa+ nke obodo ha ere, n’ihi na ọ bụ ihe nketa ha ruo mgbe a na-akaghị aka.
35 “‘Ọ bụrụkwa na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye,+ o nweghịkwa ego, ị ga-enye ya ihe na-akpa ya.+ Dị ka onye mbịarambịa na onye ọbịa,+ ọ ga-eso gị dịrị ndụ. 36 Anala ya ọmụrụ nwa, anakwala ya ụma,+ kama tụọ egwu Chineke gị;+ nwanne gị ga-esoro gị dịrị ndụ. 37 Enyela ya ego wee chọọ ka o nye gị ọmụrụ nwa,+ enyekwala ya ihe oriri gị wee nara ya ụma. 38 Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye kpọpụtara unu n’ala Ijipt ka m wee nye unu ala Kenan,+ iji gosi na m bụ Chineke unu.+
39 “‘Ọ bụrụ na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye, o wee resị gị onwe ya,+ ị gaghị eji ya mere ohu.+ 40 Ọ ga-ebinyere gị dị ka onye ọrụ e goro ego,+ dị ka onye ọbịa. Ọ ga na-ejere gị ozi ruo n’afọ Jubili. 41 Ọ ga-ahapụkwa gị, ya na ụmụ ya, laghachikwuru ezinụlọ ya, ọ ga-alaghachikwa n’ihe nketa nna nna ya hà.+ 42 N’ihi na ha bụ ndị ohu m, ndị m kpọpụtara n’ala Ijipt.+ Ha agaghị ere onwe ha otú e si ere ohu. 43 Ejila obi ọjọọ zọda ya,+ tụọ egwu Chineke gị.+ 44 Ma ị pụrụ isi ná mba ndị gbara unu gburugburu nweta ohu gị nwoke na ohu gị nwaanyị; ọ bụ n’etiti ha ka unu pụrụ ịzụrụ ohu nwoke na ohu nwaanyị. 45 Unu pụkwara isi n’etiti ụmụ ndị ọbịa bụ́ ndị bi dị ka ndị mbịarambịa n’etiti unu+ nakwa n’ezinụlọ ha bụ́ ndị bi n’etiti unu, ndị a mụụrụ ha n’ala unu, zụrụ ha; ha ga-aghọkwa nke unu. 46 Ị ga-enyefekwa ha ụmụ gị ndị ga-anọchi gị dị ka ihe nketa ka ha bụrụ ihe nketa ha ruo mgbe a na-akaghị aka.+ Unu pụrụ iji ha mere ndị ọrụ, ma unu ejila obi ọjọọ zọda ụmụnne unu, bụ́ ụmụ Izrel, onye azọdala ibe ya.+
47 “‘Ma ọ bụrụ na onye mbịarambịa ma ọ bụ onye ọbịa bi n’etiti unu abaa ọgaranya, ma nwanne gị bi ya nso adaa ogbenye, o wee resị onye mbịarambịa ma ọ bụ onye ọbịa bi n’etiti unu onwe ya, ma ọ bụ resị otu onye n’ezinụlọ onye mbịarambịa onwe ya, 48 mgbe o reworo onwe ya,+ a ga-enwe ikike ịgbara ya.+ Otu n’ime ụmụnne ya ndị ikom pụrụ ịgbara ya.+ 49 Nwanne nna ya ma ọ bụ nwa nwanne nna ya pụrụ ịgbara ya, ma ọ bụ onye ikwu ya ọ bụla nke ya na ya bụ otu ọbara,+ onye si n’ezinụlọ ya, pụrụ ịgbara ya.
“‘Ma ọ bụ, ọ bụrụ na ọ baa ọgaranya, ọ ga-agbapụta onwe ya.+ 50 Ya na onye zụụrụ ya ga-agbakọ ihe niile malite n’afọ o resịrị ya onwe ya ruo n’afọ Jubili,+ ego ole o rere onwe ya ga-ekwekọ n’afọ ole ahụ.+ Ọ ga na-ejere ya ozi otú e si agụkọ ụbọchị ọrụ nke onye ọrụ e goro ego.+ 51 Ọ bụrụ na ọ ka fọrọ ọtụtụ afọ, ọ ga-akwụ ụgwọ iji gbara onwe ya site n’ịkwụghachi ihe fọdụrụ n’ego e ji zụrụ ya, dabere n’afọ ole fọdụrụ. 52 Ma ọ bụrụ na ọ bụ naanị afọ ole na ole fọdụrụ tupu afọ Jubili+ eruo, ọ ga-agbakọ ya. Ọ ga-akwụ ụgwọ iji gbara onwe ya dabere n’afọ ole fọdụụrụ ya. 53 Ọ ga na-ejere ya ozi dị ka onye ọrụ e goro ego+ site n’afọ ruo n’afọ. Ọ gaghị eji obi ọjọọ zọda ya+ n’ihu gị. 54 Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ gaghị agbapụtali onwe ya n’ụzọ kwekọrọ n’ihe ndị a e kwuru, ọ ga-enwere onwe ya n’afọ Jubili,+ ya na ụmụ ya.
55 “‘N’ihi na ụmụ Izrel bụ ndị ohu m. Ha bụ ndị ohu m,+ ndị m kpọpụtara n’ala Ijipt.+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.+