Ilu
29 Onye a dọrọ aka ná ntị ugboro ugboro ma ya agbaa isi akwara,+
A ga-ala ya n’iyi kpamkpam na mberede.+
2 Mgbe ndị ezi omume dị ọtụtụ, ndị mmadụ na-aṅụrị ọṅụ,
Ma mgbe onye ajọ omume na-achị, ndị mmadụ na-asụ ude.+
3 Onye ji amamihe kpọrọ ihe na-eme nna ya obi ụtọ,+
Ma onye ya na ndị akwụna na-akpa na-ala akụ̀ ya n’iyi.+
4 Ọ bụrụ na eze na-ekpe ikpe ziri ezi, ihe na-adị mma n’obodo,+
Ma onye na-achọ ka e nye ya aka azụ na-ala obodo n’iyi.
6 Mmehie onye ajọ omume ga-eme ka ọ ma n’ọnyà,+
Ma onye ezi omume na-eti mkpu ọṅụ ma na-enwe obi ụtọ.+
7 Onye ezi omume na-achọ ka e meere ndị ogbenye ihe ruuru ha,+
Ma onye ajọ omume achọghịdị ịma gbasara ha.+
9 Ọ bụrụ na onye ma ihe ekwe ka ya na onye iberiibe rụwa ụka,
Mba na ịkwa emo ga-arị ibe ha elu, ma onye ahụ ma ihe agaghị ezu ike.+
10 Ndị na-egbu mmadụ na-akpọ onye ọ bụla aka ya dị ọcha asị,+
Ha na-achọkwa ka ha gbuo ndị ezi omume.*
15 Ụtarị* na mba na-eme ka mmadụ mara ihe,+
Ma nwatakịrị a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya na-emenye nne ya ihere.
16 Mgbe ndị ajọ omume dị ọtụtụ, mmehie na-adị ọtụtụ,
Ma ndị ezi omume ga-ahụ ka ndị ajọ omume na-ada.+
17 Dọọ nwa gị aka ná ntị, ọ ga-eme ka obi ruo gị ala.
Ọ ga-emekwa ka i* nwee ezigbo obi ụtọ.+
18 N’ebe a na-enweghị ndị amụma na-ahụ ọhụụ,* ndị mmadụ na-eme ihe masịrị ha.+
Ma ndị na-edebe iwu na-enwe obi ụtọ.+
19 Onye na-eje ozi agaghị anabata okwu a gwara ya mgbe a na-adọ ya aka ná ntị.
N’agbanyeghị na ọ na-aghọta ihe a gwara ya, ọ naghị erube isi.+
21 Ọ bụrụ na mmadụ esi n’oge onye na-ejere ya ozi bụ nwata zụtọọ ya,
E mechaa, onye na-ejere ya ozi agaghị eji ya kpọrọ ihe.
22 Onye na-ewekarị iwe na-eme ka e sewe okwu.+
Onye ọ bụla nke na-ewekarị oké iwe na-eme ọtụtụ mmehie.+
24 Onye na-enyere onye ohi aka kpọrọ onwe* ya asị.
O nwere ike ịnụ òkù a kpọrọ ya ka ọ bịa gbaa akaebe,* ma e nweghị ihe ọ ga-ekwu.+