16 Ma ha ji ndị ozi nke ezi Chineke na-eme ihe ọchị,+ na-eledakwa okwu ya anya+ ma na-akwa+ ndị amụma ya emo, ruo mgbe ọnụma+ Jehova bịakwasịrị ndị ya, ruo mgbe ọ na-enweghị ihe ga-egbochi ya.+
23 Ṅụrịanụ ọṅụ n’ụbọchị ahụ, maliekwanụ elu, n’ihi na, lee! ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe, n’ihi na ọ bụ ihe ndị ahụ ka ndị nna nna ha mere ndị amụma.+
52 Ònye n’ime ndị amụma ka nna nna unu hà na-akpagbughị?+ Ee, ha gburu+ ndị mara ọkwa tupu oge eruo banyere ọbịbịa nke Onye ezi omume ahụ,+ bụ́ onye unu ghọworo ugbu a ndị raara ya nye na ndị gburu ya.+
15 bụ́ ndị gburu ọbụna Onyenwe anyị Jizọs+ na ndị amụma+ ma kpagbuo anyị.+ Ha adịghịkwa eme ihe dị Chineke mma, kama ha na-emegide ọdịmma nke mmadụ niile,
37 A tụrụ ha nkume,+ a nwara ha ọnwụnwa,+ a kwọbiri ha akwọbi, e ji mma agha gbuo ha,+ ha yi akpụkpọ atụrụ+ na akpụkpọ ewu na-agagharị, ka ha nọ n’ụkọ,+ ná mkpagbu,+ ka a na-emeso ha mmeso ọjọọ;+