Ilu
20 Onye na-akwa emo ka mmanya bụ,+ ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu bụ onye mkpọtụ,+ onye ọ bụla nke ọ na-eme ka ọ kpafuo amaghị ihe.+
2 Ụjọ a na-atụ eze bụ mbigbọ yiri nke nwa ọdụm tojuru etoju.+ Onye ọ bụla nke na-adọtara onwe ya iwe eze na-emehie mkpụrụ obi nke ya.+
3 Ọ bụụrụ mmadụ ihe ùgwù izere esemokwu,+ ma onye ọ bụla nke dị nzuzu ga-agbaba na ya.+
4 N’ihi oge oyi, onye umengwụ agaghị akọ ihe;+ ọ ga na-arịọ arịrịọ n’oge owuwe ihe ubi, ma ọ dịghị ihe ga-adị.+
5 Echiche nke dị n’obi mmadụ yiri mmiri miri emi,+ ma, ọ bụ onye nwere nghọta ga-esepụta ya.+
6 Onye ọ bụla n’etiti ìgwè mmadụ ga-akpọsa obiọma nke ya,+ ma onye kwesịrị ntụkwasị obi, ònye pụrụ ịchọta ya?+
7 Onye ezi omume na-eje ije n’iguzosi ike n’ezi ihe ya.+ Obi ụtọ na-adịrị ụmụ ya ndị ga-anọ mgbe ọ nwụsịrị.+
8 Eze nọ n’oche ikpe,+ jiri anya ya na-achụsasị ihe ọjọọ niile.+
9 Ònye pụrụ ịsị: “Emewo m ka obi m dị ọcha;+ adịwo m ọcha wee ghara inwe mmehie”?+
10 Ụdị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ abụọ na ụdị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa abụọ+—ha abụọ bụ ihe arụ n’anya Jehova.+
11 Nwatakịrị na-esi n’omume ya eme ka a mata onye ọ bụ, ma ihe ọ na-eme ọ̀ dị ọcha, ziekwa ezi.+
12 Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ—ọ bụ Jehova kere ọbụna ha abụọ.+
13 Ahụla ụra n’anya, ka i wee ghara ịda ogbenye.+ Meghee anya gị; rijuo nri afọ.+
14 “Ọ dị njọ, ọ dị njọ!” ka onye na-azụ ihe na-ekwu, o wee lawa.+ Mgbe ahụ, ya anyawa isi.+
15 Ọlaedo dị, nkume kọral dịkwa n’ụba; ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ arịa dị oké ọnụ ahịa.+
16 Chịrị uwe mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nawo onye ọ na-amaghị n’ibé;+ nara ya ihe ibé ma ọ bụrụ na ya na nwaanyị na-akwa iko* na-emekọ ihe.+
17 Ihe oriri e ji ụgha nweta na-atọ mmadụ ụtọ,+ ma n’ikpeazụ, ajịrịja nkume ga-eju ya ọnụ.+
18 A na-eji ndụmọdụ eme ka atụmatụ guzosie ike,+ jiri ezi ntụziaka buo agha gị.+
19 Onye na-agagharị dị ka onye nkwutọ na-ekpughe okwu nzuzo;+ gị na onye ọnụ na-akọ ọkọ enwekwala mkpakọrịta ọ bụla.+
20 Onye ọ bụla nke na-akpọ nna ya na nne ya iyi,+ oriọna ya ga-anyụ mgbe ọchịchịrị na-eru nso.+
21 A na-eji anyaukwu enweta ihe nketa ná mmalite,+ ma ọdịnihu ya agaghị abụ nke a gọziri agọzi.+
22 Asịla: “M ga-emegwara ihe ọjọọ e mere m!”+ Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ,+ ọ ga-azọpụtakwa gị.+
23 Ụdị ihe ọ̀tụ̀tụ̀ abụọ bụ ihe arụ n’anya Jehova,+ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ gbara mkpị e ji aghọgbu mmadụ adịghịkwa mma.+
24 Ijeụkwụ dimkpa si n’ebe Jehova nọ.+ Olee otú mmadụ ga-esi mata ụzọ nke ya?+
25 Ọ bụ ọnyà mgbe mmadụ tiri mkpu n’echeghị echiche, sị, “Ọ dị nsọ!”+ ma mgbe o kwesịrị nkwa,+ ya enyochawa ya.+
26 Eze nke maara ihe na-achụsasị ndị ajọ omume,+ ọ na-eji ụkwụ ụgbọala arị ha elu.+
27 Ume mmadụ na-eku+ bụ oriọna Jehova, nke na-enyocha ime ime afọ dum nke ọma.+
28 Obiọma na eziokwu na-echebe eze;+ o jiriwokwa obiọma mee ka ocheeze ya guzosie ike.+
29 Ịma mma nke ụmụ okorobịa bụ ike ha,+ ịma mma nke ndị agadi bụkwa isi awọ́ ha.+
30 Itipụ mmadụ ọnyá na-ehichapụ ihe ọjọọ;+ ụtarị na-ehichakwa ime ime afọ.+