Jeremaya
5 Gaanụ jegharịa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem ka unu lee, mata, chọọkwa n’ámá ya dị iche iche ma ọ̀ dị onye unu pụrụ ịhụ,+ ma è nwere onye na-eme ihe ziri ezi,+ onye ọ bụla nke na-achọ ikwesị ntụkwasị obi,+ m ga-agbagharakwa obodo a. 2 Ọ bụrụgodị na ha asị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ!” ọ bụ iyi ụgha ka ha na-aṅụ.+
3 Jehova, ọ́ bụghị ikwesị ntụkwasị obi ka anya gị na-achọ ịhụ?+ I tiwo ha ihe,+ ma ha adaghị ọrịa.+ I kpochapụrụ ha.+ Ha jụrụ ịnara ịdọ aka ná ntị.+ Ha mere ka ihu ha sie ike karịa nkume dị elu.+ Ha jụrụ ịlọghachi.+ 4 Mụ onwe m sịrị: “N’ezie, ha bụ ndị dị ala. Ha zuzuru nzuzu, n’ihi na ha elegharawo ụzọ Jehova anya, bụ́ ihe Chineke ha kpere n’ikpe.+ 5 M ga-agakwuru ndị ukwu wee gwa ha okwu;+ n’ihi na ha onwe ha amarawo ụzọ Jehova, bụ́ ihe Chineke ha kpere n’ikpe.+ N’ezie, ha niile agbajiwo yok ha; ha atọpụsịwo agbụ e kere ha.”+
6 Ọ bụ ya mere ọdụm ji si n’oké ọhịa pụta wakpo ha, anụ ọhịa wolf esikwa na mbara ọzara na-ebukọrọ ihe ha nwere,+ agụ owuru wee mụrụ anya n’obodo ha dị iche iche.+ Ọ na-adọgbu onye ọ bụla si n’ime ha na-apụta. N’ihi na mmebi iwu ha adịwo ọtụtụ; omume ekwesịghị ntụkwasị obi ha adịwo ọtụtụ.+
7 Olee otú m ga-esi gbaghara gị ihe a? Ụmụ gị ahapụwo m, ha na-ejikwa ihe na-abụghị Chi+ aṅụ iyi.+ M nọ na-eme ka afọ ju ha,+ ma ha nọ na-akwa iko,+ ọ bụ n’ụlọ nwaanyị akwụna ka ha na-aga n’ìgwè n’ìgwè. 8 Ha dị ka oké ịnyịnya nke mkpụrụ amụ ya siri ike, nke chọrọ ịgba nne ịnyịnya. Onye nke ọ bụla na-ebe ubé dị ka ịnyịnya wee na-achụ nwunye enyi ya.+
9 “Ọ̀ bụ na mụ agaghị eme ka ha zaa ajụjụ n’ihi ihe ndị a?” ka Jehova kwuru.+ “Ka ọ̀ bụ na mkpụrụ obi m agaghị abọ ọbọ n’ahụ́ mba dị otú a?”+
10 “Bịanụ wakpo osisi vaịn ya ndị dị n’ahịrị, bibiekwanụ ha,+ ma unu ekpochapụkwala ha.+ Gbupụnụ alaka ya ndị na-awasa awasa, n’ihi na ha abụghị nke Jehova.+ 11 N’ihi na ụlọ Izrel na ụlọ Juda aghọwo m aghụghọ,” ka Jehova kwuru.+ 12 “Ha agọnahụwo Jehova, ha na-asịkwa: ‘Ọ dịghị adị.+ Ọdachi ọ bụla agaghị adakwasị anyị, anyị agaghịkwa ahụ mma agha ma ọ bụ ụnwụ.’+ 13 Ndị amụma ha dị ka ifufe, okwu ya adịghịkwa n’ime ha.+ Ọ bụ otú ahụ ka a ga-eme ha.”
14 Ya mere, nke a bụ ihe Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, kwuru: “Ebe ọ bụ na unu na-ekwu ihe a, lee, m ga-eme ka okwu m nke dị n’ọnụ gị bụrụ ọkụ,+ ndị a ga-abụkwa nkụ, ọ ga-erepịakwa ha.”+
15 “Ụlọ Izrel, lee, m ga-eme ka mba si ebe dị anya bịa wakpo unu,”+ ka Jehova kwuru. “Ọ bụ mba na-adịgide adịgide.+ Ọ bụ mba dịwara kemgbe oge ochie, mba unu na-amaghị asụsụ ha, unu apụghịkwa ịghọta ihe ha na-ekwu. 16 Akpa akụ́ ha dị ka ili ghere oghe; ha niile bụ ndị dike.+ 17 Ha ga-erichapụ ihe unu wetara n’ubi na ihe oriri unu.+ Ha ga-eripịa ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom. Ha ga-eripịa ìgwè ewu na atụrụ unu na ìgwè ehi unu. Ha ga-eripịa osisi vaịn unu na osisi fig unu.+ Ha ga-eji mma agha bibie obodo unu dị iche iche e wusiri ike, bụ́ ndị unu tụkwasịrị obi.”
18 “Ọbụna n’ụbọchị ndị ahụ,” ka Jehova kwuru, “agaghị m ekpochapụ unu.+ 19 Ọ ga-erukwa na unu ga-asị, ‘Gịnị mere Jehova bụ́ Chineke anyị ji mee anyị ihe a niile?’+ Ị ga-asịkwa ha, ‘Dị nnọọ ka unu hapụrụ m gaa na-efe chi ala ọzọ n’ala unu, otú ahụ ka unu ga na-ejere ndị ala ọzọ ozi n’ala na-abụghị nke unu.’”+
20 Kọọnụ ihe a n’ụlọ Jekọb, kwusaanụ ya na Juda, sị: 21 “Nụrụnụ ihe a, unu ndị nzuzu na-enweghị uche,+ ndị nwere anya ma ha apụghị ịhụ ụzọ,+ ndị nwere ntị ma ha apụghị ịnụ ihe.+ 22 ‘Ọ̀ bụ na unu adịghị atụ egwu m,’+ ka Jehova kwuru, ‘ka ọ̀ bụ na unu adịghị enwe oké ihe mgbu n’ihi m,+ bụ́ onye ji ájá kpaara oké osimiri ókè, bụ́ ụkpụrụ na-adịru mgbe ebighị ebi, nke ọ na-apụghị ịgabiga? Ọ bụ ezie na ebili mmiri ya na-amali elu, ọ pụghị ịgabiga ya; ọ bụ ezie na ọ na-eme mkpọtụ, ọ pụghị ịgabiga ya.+ 23 Ma obi ndị a kpọchiri akpọchi, na-enupụkwa isi; ha ahapụwo m wee na-eje ije n’ụzọ ha.+ 24 Ma, ha ekwughị n’obi ha, sị: “Ka anyị tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke anyị,+ Onye na-eme ka e nwee nnukwu mmiri ozuzo na ụbịa mmiri na ụla mmiri n’oge ha,+ Onye na-echekwara anyị izu a kara aka maka owuwe ihe ubi anyị.”+ 25 Njehie unu emewo ka ihe ndị a laa, mmehie unu emewo ka ihe ọma ghara iru unu aka.+
26 “‘N’ihi na a hụwo ndị ajọ omume n’etiti ndị m.+ Ha na-enyogharị anya, dị ka mgbe ndị na-achụ nta nnụnụ hulatara ala.+ Ha esiwo ọnyà nke na-ebibi ihe. Ọ bụ mmadụ ka ha na-amata n’ọnyà. 27 Dị ka ngịga si ejupụta n’anụ ufe, otú ahụ ka ụlọ ha si jupụta n’aghụghọ.+ Ọ bụ ya mere ha ji ghọọ ndị ukwu ma baa ọgaranya.+ 28 Ha amawo abụba;+ ha na-egbu maramara. Ihe ọjọọ ha jubigakwara ókè. Ha adịghị ekpechite ọnụ onye ọ bụla,+ ọbụna ikpechite ọnụ nwa na-enweghị nna,+ ka ha wee nwee ihe ịga nke ọma;+ ha adịghịkwa ekpe ikpe ndị dara ogbenye.’”
29 “Ọ̀ bụ na mụ agaghị eme ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a,” ka Jehova kwuru, “ka ọ̀ bụ na mkpụrụ obi m agaghị abọ ọbọ n’ahụ́ mba dị otú a?+ 30 E mewo ka ọnọdụ na-eju anya na ihe jọgburu onwe ya dịrị n’ala a:+ 31 Ndị amụma na-ebu amụma ụgha;+ ndị nchụàjà na-eji ike ha emegbu ndị mmadụ.+ Ma ọ dị ndị m mma otú ahụ;+ gịnị ka unu ga-eme n’ikpeazụ?”+