Diuterọnọmi
33 Nke a bụ ngọzi+ nke Mozis bụ́ onye nke ezi Chineke+ gọziri ụmụ Izrel tupu ya anwụọ. 2 O wee sị:
“Jehova si na Saịnaị bịa,+
O sikwa na Sia nwukwasị ha dị ka ìhè.+
O si n’ógbè Peran nke bụ́ ugwu ugwu nwuo dị ka ìhè,+
Ìgwè ndị nsọ sokwa ya,+
Ndị dike ha nọkwa ya n’aka nri.+
7 Nke a bụ ngọzi ọ gọziri Juda,+ ka ọ gara n’ihu ịsị:
“Jehova, biko, nụrụ olu Juda,+
Kpọrọ ya gakwuru ndị ya.
Ogwe aka ya alụworo ihe ya ọgụ;
Bụrụ onye enyemaka nke na-anapụta ya n’aka ndị na-emegide ya.”+
8 O kwukwara banyere Livaị, sị:+
“Tọmịm gị na Yurim+ gị dịịrị onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ,+
Onye i lere ule na Masa.+
Ị malitere ịgbaso ya mgba n’akụkụ mmiri Meriba,+
9 Onye sịrị banyere nna ya na nne ya, ‘Ahụbeghị m ha.’
Ọ mataghị ọbụna ụmụnne ya.+
Ọ maghịkwa ụmụ ya.
N’ihi na ha debere okwu gị,+
Ha nọkwa na-edebe ọgbụgba ndụ gị.+
10 Ka ha kụziere Jekọb mkpebi ikpe gị,+
Kụziekwara Izrel iwu gị.+
Ka ha suree ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ ka ọ banye n’oghere imi gị,+
Chụọkwa onyinye a na-esurecha n’ọkụ n’àjà n’ebe ịchụàjà gị.+
11 Jehova, biko, gọzie ike ya,+
Nweekwa obi ụtọ n’ihe aka ya na-eme,+
Kụjie ndị na-ebili imegide ya úkwù,+
Nakwa ndị kpọrọ ya oké asị, ka ha ghara ibili ọtọ.”+
12 O kwuru banyere Benjamin, sị:+
“Ka onye Jehova hụrụ n’anya+ biri n’akụkụ ya n’obi iru ala,+
Ka ya onwe ya na-echebe ya ogologo ụbọchị niile,+
Ọ ga-ebikwa n’agbata ubu ya abụọ.”+
13 O kwukwara banyere Josef, sị:+
“Ka ala ya na-abụ nke Jehova ji ihe ọma dị iche iche nke eluigwe gọzie,+
Bụ́ igirigi,+
Na ogbu mmiri nke dị n’ime ala,+
14 Na ihe ọma dị iche iche, bụ́ ihe anyanwụ na-eme ka e nweta,+
Na ihe ọma dị iche iche, bụ́ mkpụrụ na-amị n’ọnwa n’ọnwa,+
15 Na ihe kasị mma ndị si n’ugwu ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ,+
Na ihe ọma nke ugwu nta ndị na-adịru mgbe a na-akaghị aka.
16 Na ihe ọma dị iche iche nke ụwa na ihe jupụtara n’ime ya,+
Tinyere amara nke Onye ahụ bi n’osisi ogwu.+
Ka ha dị n’isi Josef+
Nakwa n’opu isi nke onye e si n’etiti ụmụnne ya họrọ.+
17 Ịma mma ya dị ka nke oké ehi e bu ụzọ mụọ,+
Mpi ya bụkwa mpi atụ́.+
Ọ ga-eji ha na-asọ ndị dị iche iche,+
Sọrọ ha niile ruo na nsọtụ ụwa,
Ha bụkwa iri puku kwuru iri puku nke Ifrem,+
Ha bụkwa puku kwuru puku nke Manase.”
18 O kwukwara banyere Zebulọn, sị:+
“Zebulọn, ṅụrịa ọṅụ n’ọpụpụ gị,+
Ịsaka, ṅụrịakwa ọṅụ n’ụlọikwuu gị.+
19 Ha ga-akpọ ndị dị iche iche ka ha bịa n’ugwu.
N’ebe ahụ ka ha ga-achụ àjà ezi omume.+
N’ihi na ha ga-amịrị akụ̀ dị ukwuu dị n’oké osimiri dị iche iche,+
Nakwa ihe zoro ezo a kwakọbara n’ájá.”
20 O kwukwara banyere Gad, sị:+
“Onye a gọziri agọzi ka onye na-eme ka ókèala Gad saa mbara bụ.+
Ọ ga-ebi dị ka ọdụm,+
Ọ ga-adọwakwa ogwe aka, ee, dọwaa opu isi.+
21 Ọ ga-ahọtakwara onwe ya òkè nke mbụ,+
N’ihi na n’ebe ahụ ka e debere òkè nke onye na-enye iwu.+
Ndị isi nke ndị Izrel ga-ezukọta.
Ezi omume Jehova ka ọ ga-eme,
Meekwa ihe o kpere n’ikpe n’ebe Izrel nọ.”
23 O kwukwara banyere Naftalaị, sị:+
“Amara ejuwo Naftalaị afọ,
O jupụtakwara ná ngọzi Jehova.
Nweta ebe ọdịda anyanwụ na ebe ndịda.”+
24 O kwukwara banyere Asha, sị:+
“Onye e ji ụmụ gọzie ka Asha bụ.+
Ka ọ ghọọ onye ihe ya masịrị ụmụnne ya,+
Onye na-azọnye ụkwụ ya na mmanụ.+
25 Ígwè na ọla kọpa bụ ihe i ji akpọchi ọnụ ụzọ ámá gị,+
Dị ka ụbọchị i nwere hà, otú ahụ ka ị na-atụsara ahụ́ aga ije.
26 Ọ dịghị onye dị ka ezi Chineke+ nke Jeshurọn,+
Onye nọkwasịrị n’eluigwe dị ka ịnyịnya iji nyere gị aka,+
Nakwa n’ígwé ojii n’ịdị ukwuu ya.+
27 Chineke nke dị adị site n’oge ochie bụ ebe nzuzo,+
Ogwe aka nke na-adịru mgbe ebighị ebi dịkwa n’okpuru.+
Ọ ga-achụpụkwa onye iro n’ihu gị,+
Ọ ga-asịkwa, ‘Laa ha n’iyi!’+